Lindiwe Chibi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Lindiwe Chibi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1976 Dezie
Ebe ọmụmụSouth Africa Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya2007 Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri Dezie

Lindiwe Chibi (1976–2007), bụ onye mba South Africa bu nwanyi na-eme ihe nkiri. N'ịbụ onye a na-ele anya dị ka otu n'ime ndị na-eme ihe nkiri bu nwanyi gbaputara ihe na telivishọn South Africa, a maara ya nke ọma maka ọrụ ya 'Doobsie' na usoro a ma ama Muvhango .[1][2]

Igba egbe na ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Na 30 Eprel 2005, enyi ya nwoke Dan Mokoena, gbara ya egbe n'ihu mgbe Chibi nọ n'ụlọ nne ya.[3] Mgbọ ahụ nke a no nso wee gbaa, banyere na ntì ya wee pụta n'azụ isi ya. E bugara ya n'ụlọ ọgwụ Garden City Clinic ma o nọrọ n'ụra ruo izu atọ. Mgbe o biliri n'ụra, ọ kpọnwụrụ n'akụkụ aka nri nke ahụ ya.[4] N'oge ọ na-agbake site na mmerụ ahụ na-egbu egbu, ọ nwụrụ n'ihi ọrịa oyi otutu na Chris Hani-Baragwanath Hospital na Soweto n'afọ 2007 mgbe ọ dị afọ iri ato n' otu..[5]

Onodu Oru[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1995, ọ malitere ọrụ ọkachamara na ihe nkiri Ekuseni nke emere na Civic Theatre . Mgbe ahụ, ọ rụrụ na egwuregwu ejije na Windybrow Theatre, ebe ọ natara onyinye maka Best Actress. Mgbe ahụ, ọ rụrụ ọrụ nke 'Stella Kowalski' na egwuregwu oge ochie, A Street Car Named Desire yana na The Pen na Molora .[4] O mere ihe nkiri a ma ama bụ 'Doobsie' na usoro telivishọn Muvhango .[6] Mgbe ọ nwụsịrị, a mara ọkwa na onodu ya n' ejije alaala ezumike nká.[3]

N'ụbọchị nke ato n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2018, a kpọrọ Market Theatre Foundation ụlọ ọrụ ya dị n'elu iji kwanyere Chibi ùgwù.[1]

Edemsibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Lindiwe Chibi memorialised at the Market Square. Market Theatre official page. Archived from the original on 2021-05-13. Retrieved on 2020-11-30.
  2. Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omittedLindiwe Chibi intro. ESAT. Archived from the original on 2020-11-30. Retrieved on 2020-11-30.
  3. 3.0 3.1 Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omitted'Doobsie' written out of soapie. news24. Archived from the original on 2020-11-30. Retrieved on 2020-11-30.
  4. 4.0 4.1 Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omittedActress Lindiwe Chibi dies. IOL. Archived from the original on 2020-11-30. Retrieved on 2020-11-30.
  5. Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omittedThrowback: South African soap stars who died in real life. all4women. Archived from the original on 2020-11-30. Retrieved on 2020-11-30.
  6. Error on call to template:cite web: Parameters archiveurl and archivedate must be both specified or both omittedStar's shooting 'an accident'. news24. Archived from the original on 2020-11-30. Retrieved on 2020-11-30.