Lisa Boattin

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Lisa Boattin
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịItaly Dezie
Aha enyereLisa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya3 Mee 1997 Dezie
Ebe ọmụmụPortogruaro Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ mba Italy Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheonye na-agbachitere Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
so na2019 FIFA Women's World Cup Dezie

Lisa Boattin (amụrụ n'abali atọ nke ọnwa Mee afọ 1997) bụ onye Ịtali na-agba bọọlụ nke na-agbachitere ndị otu Serie A Juventus na ndị otu mba Ịtali.

Ọrụ klọb[dezie | dezie ebe o si]

Boattin gbara bọọlụ klọb mbụ ya n'afọ 2011 na Venezia [it]. na nke agba ọzọ ya a kpọfere ya na Graphistudio Pordenone [it].[1] Na Julaị 2014, Boattin bịanyere aka na Brescia.[1] N'ọnwa Nọvemba 2017, ọ gbara goolu mbụ ya maka Juventus, penalty megide Res Roma.[2] Ọ pụtara ugboro abụọ maka Juventus na 2018-19 UEFA Women's Champions League .[3] Ọ gbara bọọlụ na Juventus na asọmpi ikpeazụ nke iko ụmụ nwanyị nke Ịtali nke afọ 2018.[4] Juventus meriri Fiorentina ọkpụ goolu abụọ asatara otu.[5] Na Mee 2019, Boattin gbatịkwuru nkwekọrịta ya na Juventus ruo 2021.[6] Ọ malitere egwuregwu ọ bụla nke Juventus na-emeri n'asọmpi Serie A nke afọ 2020 na afọ 21, a họpụtakwara ya dịka onye egwuregwu nke oge ahụ.[7] N'abali iri na ise nke ọnwa Julaị afọ 2021, ọ gbatịkwuru nkwekọrịta ya ruo 2023.[8] N'abalị iri atọ n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 2022, Boattin gbara goolu ozugbo site na nkuku na nkeji nke atọ nke oge nkwụsịtụ iji nweta otu akara na egwuregwu Coppa Italia megide Inter.[9]

Ọrụ mba ụwa[dezie | dezie ebe o si]

Boattin bụ onyeisi ndị U17 Ịtali na asọmpi UEFA nke ụmụ nwanyị n'erubeghi ogo afọ iri na asaa nke afọ 2014 na asọmpi iko mba ụwa ụmụ nwanyị n'erubeghi ogo afọ iri na asaa nke 2014 FIFA hiwere.U-17 Ịtali gbara ndị nke atọ na ihe omume abụọ ahụ, Boattin wee gbaa bọọlụ nke mgbapụ penariti na iko mba ụwa, ka Ịtali meriri Venezuela U-17.[1]

Ọ gbara bọọlụ nye Ịtali n'egwuregwu abụọ na iru ogo nke iko mba ụwa ụmụ nwanyị afọ 2019 FIFA Hiwere.[3] N'ọnwa Mee afọ 2019, a kpọrọ aha ya na ndị otu naonye na asọmpi iko mba ụwa nke afọ 2019 nke FIFA na akwado na France.[10] Ọ bụ otu n'ime ndị egwuregwu Juventus asatọ nọ na ndị otu ahụ.[11]

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Boattin na Portogruaro, Veneto, Ịtali.[1]

Boattin na onye na-agba bọọlụ Sweden bụ Linda Sembrant bi ,na mmekọrịta nwoke na nwanyị.[12]

Nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Brescia

  • Usoro A: 2015-16
  • Iko mba Ịtali: 2015 na 16
  • Supercoppa Italiana: 2015, 2016
  • Usoro A: 2017[1], 201819, 201920, 202021, 202122
  • Iko mba Ịtali: 2018 na 19, 2021
  • Supercoppa Italiana: 2019, 202021, 202122

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Pettinati. "LISA BOATTIN È UNA CALCIATRICE DEL BRESCIA", 13 July 2014. Retrieved on 25 May 2019. (in it)
  2. Lisa Boattin: "Che emozione, la Juve" (it). Juventus TV (11 October 2017). Archived from the original on 25 May 2019. Retrieved on 25 May 2019.
  3. 3.0 3.1 Lisa Boattin. UEFA. Retrieved on 25 May 2019.
  4. Boattin: "Tranquille per la finale. La Juve mi ha cambiato la vita" (it). JuventusNews24.com (26 April 2019). Archived from the original on 25 May 2019. Retrieved on 25 May 2019.
  5. Fiorentina 1 – 2 Juventus. Soccerway. Retrieved on 25 May 2019.
  6. "Juventus Women, in sei rinnovano fino al 2021!", Corriere dello Sport – Stadio, 22 May 2019. Retrieved on 25 May 2019. (in it)
  7. 2020-21 BWRAO Superlatives: The Best of the Best from Juventus Women’s title-winning season. SB Nation Juventus (22 June 2021). Retrieved on 22 June 2021.
  8. JuventusNews24 (2021-07-15). Boattin rinnova con la Juventus Women: contratto fino al 2023 (it-IT). Juventus News 24. Retrieved on 2021-07-18.
  9. Boattin, gol olimpico al 93': la Juventus riprende l'Inter (it). tuttosport.com. Retrieved on 2022-02-01.
  10. "Italy name Women's World Cup squad", Football Italia, 24 May 2019. Retrieved on 25 May 2019.
  11. Eight Juventus Women players make Italy's World Cup squad. SB Nation (24 May 2019). Archived from the original on 25 May 2019. Retrieved on 25 May 2019.
  12. L-Mag.de: Das sind die 59 lesbischen Stars der Fussball-EM 2022 (German), July 2022

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]