Lota Chukwue

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Lota Chukwue
Mmádu

Lota Chukwu

Lota Chukwu na 2018

Mụrụ Ugwu Lotachukwu Jacinta Obianuju Amelia

Nọvemba 29, 1989 (afọ 30)

Nsụka, Enugwu Steeti, Naịjirịa

Ebe Ọ gụrụ akwụkwọ

University of Benin

Akaọrụ Ọmee ihe onyonyo

Afọ ọ nọ ọrụ 2014–ugbua

Ugwu Lotachukwu Jacinta Obianuju Amelia bụ onye Naịjirịa na-eme ihe onyonyo amaala dịka Lota Chukwu . A maala ya mgbe ọ gbasịrị n'usoro TV Na-ewu ewu nke Naịjirịa, Jenifa's Diary n'akụkụ Funke Akindele, Juliana Olayode, Falz ebe ọ mere dịka "Kiki", [1] enyi nke onye ndu, Jenifa . Ọ bụkwa onye "yoga" na-anụ ọkụ n'obi. [2]

Ndụ mbido[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Lota na Nsụkua, Enugwu Steeti, Naịjirịa mana ọ nwere nzụlite nwata ya na Benin City . Lota bụ onye ikpeazụ n’ime ụmụ anọ nne na nna ya mụrụ. Ọ gụrụ akwụkwọ na "Agricultural Economics na Extension Service" na Mahadum nke Benin ma mesịa mee ihe na "Royal Arts Academy" na Legọọsụ, Naịjirịa.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Tupu ime ihe onyonyo, Lota bụ onye nlere anya ma sonye na 2011 nke "Most Beautiful Girl na Nigeria" na- anọchite ndị Yobe Steeti. Ọ malitere ime ihe onyonyo ya na 2011 mana ọ ghọrọ onye a ma ama mgbe ọ pụtara na Jenifa's Diary ma mee dịka Kiki. meela ihe nkiri ndị ọzọ dịka The Royal Hibiscus Hotel, Falling, Fine Girl, Arbitration, Dognapped.

E gosipụtara Lota dị ka onye ndu ihe onyonyo na Reminisce 's Ponmile [3] "video as we as Aramide" ''Why So Serious"[4] .

Lota Takes[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2017, O kwupụtara mmepe ngosipụta nri ya nke ọ kpọrọ "Lota Takes", ihe nkiri a bụ I si nri na etu esi ebi ndụ nke gosipụtara Lota dịka onye ihe ụwa na I si nri na-atọ ụtọ nke ukwuu.[5] Ihe nkiri a egosipụtago ndị Naịjiria amaala aha ndị dịka Adekunle Gold,[6] Tosin Ajibade, Aramide (musician)[7] MC Galaxy [8]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Aha Ọrụ Onyeisi
2020 When Life Happens Betty Okey Ifeanyi
Deadly Instincts Ebute ụzọ Yemi Morafa
The perfect Plan Osote mbuzo Uzodinma Okpechi
Wind Chasers Na-akwado Nkedo Uzodinma Okpechi
Spotlight Ebute ụzọ Sunkanmi Adebayo
Falling Co-kpakpando Niyi Akinmolayan
Dognapped Co-kpakpando Kayode Kasum
Fine Girl Ebute ụzọ Uduak Isong Oguamanam
The Arbitratione Co-kpakpando Niyi Akinmolayan
2015-2018 Jenifa's Diary Co-kpakpando Funke Akindele

Onyinye na nhoputa[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Mmemme Nrite Nsonaazụ
2016 Scream All Youths Awards style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara[9]
2017 City People Actress of the year style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara.[10]