Lucy Thoumaian

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Lucy Thoumaian
Lucy Thoumaian

Àtụ:Sandbox Lucy Thoumaian ma ọ bụ Rossier de Visme (1890-1940) bụ onye Armenia na-ahụ maka ikike ụmụ nwanyị na udo. A chụpụrụ ya na Armenia, o nyere aka mepụta ụlọ akwụkwọ na Chigwell maka ndị Armenia na-enweghị nne na nna. O bipụtara nkwupụta maka udo tupu ya agaa nzukọ Women at the Hague na afọ 1915. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ malitere ịrụ ọrụ maka Njikọ Mba.

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Thoumaian bụ onye amụrụ na Switzerland n'aha Rossier de Visme .[1]

International Congress of Women na 1915. aka ekpe gaa n'aka nri:1. Lucy Thoumaian - Armenia, 2. Leopoldine Kulka - Austria, 3. Laura Hughes - Canada, 4. Rosika Schwimmer - Hungary, 5. Anika Augspurg - Germany, 6. Jane Addams - USA, 7. Eugenie Hanner, 8. Aletta Jacobs - Netherlands, 9. Chrystal Macmillan - UK, 10. Rosa Genoni - Ịtali, 11. Anna Kleman - Sweden, 12. Thora Daugaard - Denmark, 13. Louise Keilhau - Norway

A chụpụrụ ya na di ya Reverend Prọfesọ Garabed Thoumanian na Armenia ma ha ghọrọ ndị a chụgara na Britain. N'ebe ahụ, ha haziri ogige ụmụ mgbei na ụlọ akwụkwọ na Oakhurst na Chigwell maka ndị Armenia na 1906.[2][1]

N'afọ 1911, ọ gara First Universal Races Congress na London nke bụ mgbalị mbụ maka imegide ịkpa ókè agbụrụ. N'agbanyeghị na ọ bụ onye a chụgara n'alaeze Ottoman, ọ nabatara ndị nnọchi anya Turkey dị ka ihe nnọchianya nke mkpa ọ dị ịrụkọ ọrụ ọnụ.[3]

N'afọ 1914, o bipụtara akwụkwọ maka udo nke isiokwu ya bụ "Agha bụ nke mmadụ mere, ọ ga-abụrịrị nwanyị ka e wepụrụ". Ọ tụrụ aro na ụmụ nwanyị kwesịrị inwe nzukọ kwa izu ruo mgbe esemokwu kpatara agha ahụ ga-edozi.[4]

N'afọ 1915, Thoumaian gara The Hague ebe ọ nọchitere anya Armenia na nzukọ Women at the Hague. Ọ bịarutere na nnọkọ ahụ n'ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Eprel n'afọ 1915. Ụbọchị tupu mgbukpọ agbụrụ nke Armenia amalite mgbe e jidere ọtụtụ narị ndị ụbụrụ na Armenia.[5]

Thomanian nọ na kọmitii isi na nnọkọ ahụ. Mgbe nzukọ ahụ gasịrị, ọ nọrọ na Netherlands ruo n'ọnwa Nọvemba. Ọ nọ na-arụsi ọrụ ike na-ekesa ihe, ọ chọkwara inweta ozi gbasara ndị ikwu na ibe iri atọ ọ hụrụ na Marsovan na Armenia.[1]

Mgbe agha ahụ biri, WILPF kwalitere ya ka ọ rụọ ọrụ maka kọmitii Njikọ Mba. Ọ gara n'ihu na-arụ ọrụ maka ndị ọka ikpe maka ndị e gburu na Armenia.[1][6]

Thoumaian nwụrụ na United States of America na afọ 1940.[1]

Edemsibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1. Lucy Thoumaian 1890 – 1940. WILPF - Women's International League for Peace and Freedom. Archived from the original on 5 April 2019. Retrieved on 24 November 2017.
  2. Chigwell: Schools | British History Online (en). www.british-history.ac.uk. Retrieved on 2 November 2017.
  3. Maureen Moynagh (14 January 2012). Documenting First Wave Feminisms: Volume 1: Transnational Collaborations and Crosscurrents. University of Toronto Press, 397–. ISBN 978-1-4426-6410-4. 
  4. Jill Liddington (1989). The Road to Greenham Common: Feminism and Anti-militarism in Britain Since 1820. Syracuse University Press, 91–. ISBN 978-0-8156-2539-1. 
  5. Shirakian (1976). Կտակն էր Նահատակներուն [Gdagn er Nahadagnerin], translated by Shirakian, Sonia, Boston: Hairenik Press. OCLC 4836363. 
  6. Archives. The Discovery Service (en-GB). discovery.nationalarchives.gov.uk. Retrieved on 2 November 2017.