Luka Misetic

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Luka Misetic (nke a na-asụpe na Croatian dị ka Mišetić, amụrụ n'afọ 1970) bụ onye ọka iwu mba America bụ ọkachamara na iwu mpụ.[1]

Misetic bụ onye a ma ama maka ịgbachitere onye isi obodo Croatian Ante Gotovina na International Criminal Tribunal maka onye bụbu Yugoslavia na onye bụbu onye isi ala obodo Kosovo Hashim Thaçi na Kosovo Specialist Chambers . [1]

N'afọ 2006, a kpọrọ Misetic otu n'ime ndị obodo Croatia mmadụ otu narị kachasị nwee mmetụta n'ụwa site na magazin Globus.[2]

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Misetic ma zụlite ya na Chicago.[3] Nne na nna ya bụ ndị Croat si n'ebe ọdịda anyanwụ Obodo Herzegovina dị nso na Ljubuški (nke bụzi akụkụ nke obodo Bosnia na Herzegovina). Misetic gara obodo Croatia na nke mbụ ya mgbe ọ dị afọ iri na isii, n'afọ 1986. Ọ mụtara asụsụ obodo Croatian n'aka ezinụlọ ya. Na mbido Agha nke Nnwere Onwe nke obodo Croatia, Misetic zigara enyemaka ego na Obodo Croatia.[1][4] N'afọ 1992, Misetic gụsịrị akwụkwọ na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Mahadum Northwestern na nsọpụrụ ngalaba. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ banyere na ụlọ akwukwo Notre Dame Law School na-agụsị akwụkwọ na afọ 1996, ebe ọ natara Dean's Award maka ịdị mma na ọkachamara na ọmụmụ nke International Law.[5]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1996, Misetic ghọrọ onye otu Illinois State Bar na US District Court Northern District of Illinois; otu afọ ka e mesịrị, n'afọ 1997, ọ ghọrọ onye otu International Criminal Tribunal maka Yugoslavia mbụ na The Hague na Netherlands. Misetic bụkwa onye otu ndi Chicago Bar Association, Association of Defence Counsel n'ihu ICTY na Illinois State Bar Association.[5] N'afọ 1999, a họpụtara ya n'etiti ndị ọka iwu iri na abụọ kachasị mma na steeti Chicago.[4]

Misetic nwetara nlebara anya mba ụwa mgbe ọ na-agbachitere onye Bosnia Croat Anto Furundžija na afọ 1999. Ọ bụ onye ọka iwu kachasị nta na-agbachitere ikpe n'ihu ụlọ ikpe mpụ mba ụwa.[5][3] Mgbe ọ na-akwadebe nchebe Furundžija na họtel Sheraton nke obodo Zagreb, ọ zutere Ante Gotovina.[4] N'ọnwa Ọktoba afọ 2001 ọ ghọrọ onye ọka iwu ya, na-emezu ntọhapụ Gotovina na Nọvemba afọ 2012.[1]

Maazị Misetic apụtala n'ihu Ụlọikpe Mba Nile na The Hague.[6] Ọ na-anọchite anya ndị ahịa n'okwu ikpe mba ụwa n'ihu Ụlọikpe Na-adịgide adịgide nke Arbitration na The Hague, yana otu International Centre for Settlement of Investment Disputes.

Ihe edeturu n'okpuru ala[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 "Odvjetnik koji je stekao Gotovinino povjerenje braneći Furundžiju", Jutarnji list, December 18, 2005. Retrieved on November 21, 2012. (in Croatian) Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Jutarnji" defined multiple times with different content
  2. (E,H) 100 Most Influential Croatians in the World, 100 najmocnijih Hrvata u svijetu.
  3. 3.0 3.1 "Ovo je čovjek koji je uspio obraniti generala Gotovinu!", Dnevnik Nove TV, November 16, 2012. Retrieved on November 21, 2012. (in Croatian) Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Dnevnik" defined multiple times with different content
  4. 4.0 4.1 4.2 "Pet sati istine u sedam godina na HTV-u", Croatian Intellectual Assembly of Bosnia and Herzegovina, March 22, 2008. Retrieved on November 21, 2012. (in Croatian) Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "HIZ" defined multiple times with different content
  5. 5.0 5.1 5.2 Official site. Law Offices of Luka S. Misetic. Retrieved on November 17, 2012. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Official" defined multiple times with different content
  6. Archived copy. Archived from the original on 2014-04-24. Retrieved on 2014-04-24.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

  • Official website