Macbeth
Macbeth (asụ̀sụ̀ bèkeè: The Tragedy of Macbeth, 'egwu m̀bèrède Macbeth') bụ̀ ejije ọdàchi ǹkè William Shakespeare dèrè n'afọ̀ 1606.[1] Ejije ǹkè â bụ̀ màkà Macbeth, ezè ndị Scotland. Macbeth bụ̀bụ̀ mmadụ̀ n'ịta nà okwu mbà ndị, mànà Shakespeare gbanwèrè ya màkà ezè James I ǹke àla bèkeè (ọ bụ̀kwà ezè James VI ǹkè àla Scotland).[2] Ejije ọdàchi nk'â n'ègosi òtù ịchọ ike na ọchịchị nwèrè ike imebì ndị mmadụ̀. Macbeth bụ̀ onye nwere obì si ike m̀gbè ọ bụ̀ onye isi ndị agha nà ọ bụ̀ Thane ǹkè Glamis (onye na-achị Glamis) mànà amụosu àtọ bịara, gwa ya nà ọ g'àbụ ezè ndị Scotland. N'ime obì ya, Macbeth mà nà ịhẹ â ekwesị̀ghị̀ ịme màkà Duncan bụ̀ ezè na-achị. Macbeth nà nwunyè ya, Lady Macbeth (Ìgbò: Lọọ̀lọ̀ Macbeth), gbùrù Duncan kà Macbeth bụrụ ezè ndị Scotland. Màkà h'emèrè ịhẹ â, ara è bidozi ị yàa ha, tupù Lady Macbeth gbùrù ònwe ya nà Macduff, Thane ǹkè Fife, gbùrù Macbeth. M̀gbè ịhẹ ndị â niile mèchàrà, Malcolm, nwa izizi ǹkè Duncan, à bụrụ ezè ndị Scotland.[1]
Ndị dị nà Macbeth[mèzi | mèzi mkpụrụ]
DUNCAN, ezè ndị Scotland
MACBETH, Onye na-achị Glamis na Cawdor, onye isi ndị agha nke Eze
LADY MACBETH, nwunye ya
MACDUFF, Thane nke Fife, nwoke bụ onye ndị isi ndị Scotland
LADY MACDUFF, nwunye ya
MALCOLM, nwa Duncan nke nwoke, nke amụrụ izizi
DONALBAIN, nwa Duncan nke nwoke, nke Malcolm tọrọ
BANQUO (BANKWUO), Thane nke Lochaber, onye isi ndị agha nke Eze
FLEANCE, nwa ya nwoke
LENNOX (LENOKSỊ), nwoke bụ onye ndị isi ndị Scotland
ROSS, nwoke bụ onye ndị isi ndị Scotland
MENTEITH, nwoke bụ onye ndị isi ndị Scotland
ANGUS, nwoke bụ onye ndị isi ndị Scotland
CAITHNESS, nwoke bụ onye ndị isi ndị Scotland
SIWARD, Onye na-achị Northumberland, onye isi ndị agha nke Ana Bekee
SIWARD NKE OBERE, nwa ya nwoke
SEYTON, onye nnezi Macbeth
HECATE, Eze ndị amonsu
Amonsu atọ
Nwa bụ nwoke, Nwa Macduff
Nwaanyi na-enedo Lady Macbeth
Dịbịa ndị Bekee
Dịbịa ndị Scotland
Dinche
Onye nche
Ihe mere nà Macbeth[mèzi | mèzi mkpụrụ]
Nkebi I.[mèzi | mèzi mkpụrụ]
Nkebi II.[mèzi | mèzi mkpụrụ]
Nkebi III.[mèzi | mèzi mkpụrụ]
Nkebi IV.[mèzi | mèzi mkpụrụ]
Nkebi V.[mèzi | mèzi mkpụrụ]
Isiokwu dị nà Macbeth[mèzi | mèzi mkpụrụ]
Macbeth bụ ọdachi nwe nnukwu isiokwu.
Ike nà Ọchịchọ[mèzi | mèzi mkpụrụ]
Nhàzi[mèzi | mèzi mkpụrụ]
- ↑ 1.0 1.1 Shakespeare, W. (1606). Macbeth. "World Library Inc." (Ụnọ-ọgụgụ-akwụkwọ ụwa ejikọtara)
- ↑ Mabillard, A. (edeghị oge). Shakespeare's Sources for Macbeth: Holinshed and Witches. [n'Ịntanetị] Shakespeare-online.com. Enwere ike ịgụ ya na: http://www.shakespeare-online.com/sources/macbethsources2.html [Ahụrụ ya na 15 Dec. 2017].