Jump to content

Mahadum ụmụ nwanyị Nordic

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Mahadum umunwanyi Nordic[1] (NWU; Àtụ:Lang-no) bụ Otu nyocha Nordic, nke Mahadum Nord kwadoro ma tinye ya dị ka ntọala na Norway. Ọ na-etinye aka na "nyocha, nkuzi na ozi gbasara na maka ụmụ nwanyị, dabere na ụkpụrụ ụmụ nwanyị na nkuzi ụmụ nwanyị na na-elekwasị anya na Nordic na mba ụwa." NWU bụ ego zuru oke site na ministiri nke nchoputa akwukwo na Ministri nke umuaka nhata na njikọ ọha,otu n'ime kọleji mahadum 24 Norwegian kwadoro. Ọ natara 1 nde NOK na mbụ ego site na abụọ ministri na dị ka nke 2012 ọzọ 2 nde NOK si Ministiri nchoputa akwụkwọ, na-enweta ego n'elu State mmefu ego nke Norway.[2] Tora Aasland, onye minista nyocha na agụmakwụkwọ ka elu, na prọfesọ iwu Henning Jakhelln na onye ọka iwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Labour Ingjald Ørbeck Sørheim sokwa na mbọ ahụ bụ Tora Aasland.

Ụlọ nchịkwa nke ulo akwukwo mahadum Nesna , ebe nchịkwa nke nke mahadum umunwanyi Nordic dị

Mgbọrọgwụ ya malitere na 1983, mgbe Berit Ås nyere aka guzobe Mahadum ụmụ nwanyị mbụ (Stiftelsen Kvinneuniversitetet) na Norway.

Ọ na-elekwasị anya na mpaghara nyocha metụtara ụmụ nwanyị, dị ka Ọrụ ụmụ nwanyị, ọdịiche ụgwọ ọrụ nwoke na nwanyị, ịzụlite nne na nna, na ime ihe ike megide ụmụ nwanyị. [2][3][4]

Kọmitii nke Mahadum Nesna nke oge ahụ kwadoro nkwekọrịta iji kwado Mahadum ụmụ nwanyị Nordic na 2010. [5] E hiwere ntọala ahụ na 11 Jenụwarị 2011 na Mahadum nke Oslo faculty ndi Law. NOKUT anaghị akwado ya dị ka mahadum, mana o nwere ikike site na Ministiri nchoputa akwukwo,iji aha ahụ (nke iwu na-echebe na Norway) na aha ya. [6][7] E guzobere kansụl nzukọ ahụ na 15 Ọktoba 2011 na ndị nnọchi anya si Denmark, Finland, Iceland, Lithuania, Norway na Sweden. N'abalị iri abụọ na itoolu n'ọnwa Ọktoba, a malitere nzukọ ahụ na Sweden n'oge nzukọ ọmụmụ ihe na Arbetarnas bildningsförbund. A họpụtara onye bụbu onye omeiwu Sweden na onye omeiwu Maj Britt Theorin ka ọ bụrụ onyeisi oche nke kọmitii "Ime ihe ike megide ụmụ nwanyị". [8][9] E jikọtara uloakwukwo Mahadum Nesna na Mahadum Nord na 2016.[10]

Ọchịchị ya dị n'ụlọ nchịkwa (Gammelbygget) nke Mahadum Nord na Nesna.[11]

Ọ dabeere na iwu nke Mahadum ụmụ nwanyị mbụ, nke Berit Ås, Ragnhild Queseth Haarstad na ụmụ nwanyị itoolu ndị ọzọ guzobere dị ka atụmatụ niile na 1983.

Ihe odide

[dezie | dezie ebe o si]
  1. About us. kvinnor.no. Archived from the original on 2013-05-03. Retrieved on 2013-01-11.
  2. Etablerer kvinneuniversitet (nb). ranablad.no. Retrieved on 2011-06-16.
  3. Stiftelsen Kvinneuniversitetet Norden. Nesna University College. Archived from the original on 2011-07-26. Retrieved on 2011-06-16.
  4. Historisk dag for kvinnekunnskap (nb). helgeland-arbeiderblad.no (2011-04-30). Retrieved on 2011-06-16.
  5. Protocol from the board of Nesna University College, 23 April 2010
  6. In Norway, the designation universitet (university), which is protected by law, may be used by institutions with institutional accreditation from NOKUT, or by institutions which have permission by the Ministry of Education and Research to use the designation.
  7. Brønnøysundregistrene - Nøkkelopplysninger fra Enhetsregisteret. W2.brreg.no. Retrieved on 2012-03-11.
  8. Press release of 15 Oct 2011
  9. Kvinnopolitiskt arbete idag. Archived from the original on October 27, 2011. Retrieved on December 19, 2011.
  10. Universiteter og høyskoler slår seg sammen, Government of Norway
  11. Kvinneuniversitetet i Norden - Om oss. Kunorden.org. Retrieved on 2012-03-11.