Jump to content

Manuela Gandarillas

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Manuela Eras de Gandarillas ( c. 1740s – 27 Mee 1812 [1] ) bụ otu n'ime ndi Heroinas de la Coronilla. Ọ bụ nwanyị kpuru ìsì, onye lụrụ ọgụ maka nnwere onwe obodo ya (cerro San Sebastian-Coronilla-nso na Cochabamba, Bolivia ) na 27 Mee afọ 1812.

Manuela chọpụtara na ndị agha obodo Spain, nke José Manuel de Goyeneche nyere iwu, na-abịa ịwakpo Cochabamba. Ọ gbara ụmụ nwanyị ndị ọzọ ume isonyere ya ma kwụsị ndị agha Spain. Ebe ọ bụ na ọ dịghị umu nwoke nọ ebe ahụ, Manuela gwara ụmụ nwanyị ahụ - "Nuestra casa es divina", nke pụtara "ụlọ anyị dị nsọ" na asusu Spanish.

E nwere ugbu a ihe oyiyi na-anọchi anya ụmụ nwanyị narị atọ Bolivian na Colina de San Sebastián, Bolivia na kwa 27 May Bolivia na-eme ememe ụbọchị nke Nne Bolivian (na Spanish, 'dia de la madre boliviana'). [2]

Akụkọ ndụ

[dezie | dezie ebe o si]

Nkọwa banyere ndụ Gandarillas na ezinụlọ ya edoghị anya n'ụzọ dị ukwuu. Dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bu Edmundo Areze si kwuo, nne na nna Manuela bụ Jose Aras na Gandarillas na Margarita Fernandez. A na-eche na nna ya lụrụ ọgụ maka ihe onwe ya, a gbagbukwara ya. Ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu na ọ bụ naanị nwa agbọghọ nọ n'ezinụlọ ahụ nwere ụmụnne iri na otu. Ezigbo ụbọchị a mụrụ ya dịkwa n'ihe a na-enyo enyo, a na-eche na ọ bụ n'afọ 1782 ọ bụghị n'afọ 1752. [3]

Ihe odide

[dezie | dezie ebe o si]
  1. Américas, vol.52, pp.28, 31, Organization of American States, 2000.
  2. Bolivian History. History of Cochabamba, Bolivia's Valley Cultures.. BoliviaBella. Retrieved on 2020-02-25.
  3. Manuela Gandarillas, la heroína ciega (spanish). www.paginasiete.bo. Retrieved on 2022-02-07.