Mao Ohuabunwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mao Arukwe Ohuabunwa
Mmádu
Akụkụ nkeHouse of Representatives of Nigeria Dezie
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Mee 1957 Dezie
Ebe ọmụmụUgwu Ọcha Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ndi omeiwu nigeria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria, onye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Sayensị Ọchịchị nke Rivers State, Enugu State University of Science and Technology Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Mao Arukwe Ohuabunwa bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'obodo Naijiria, Onye na-azụ ahịa ma ugbu a na-eje ozi dika Onye Sinetọ na-anọchite anya mpaghara Abia North n'ụlọ nzukọ omeiwu ala Naijiria nke asatọ O jebuola ozi a mbu n'ụlọ nzukọ ọmeiwu nke anọ na nke ise dị ka Onye nnọchite anya Ọgbọ nta vootụ Arọchukwu / Ohafia nke Steeti Abia n’okpuru otu ndi Peolple's Democratic Party site n'afo 1999 rue 2007.

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Mao Arukwe Ohuabunwa na Port Harcourt, Steeti Rivers n'abali iri abụọ n'anọ nke ọnwa Mee afo 1957 nye nne na nna ya ndị bụ ndị na-azụ ahịa na Atani obodo dị na mpaghara okpuru ọchichi Arochukwu nke Steeti Abia . Ọ gara Orevo State School ebe ọ gụsịrị akwụkwọ elementrị ya na Enitona High School, Borokiri ebe ọ gụsịrị agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ gara n'ihu inweta nzere HND na B.Tech na Applied Biology na Microbiology n'otu n'otu site na Rivers State University of Science and Technology . Ọ gara n'ihu ịga Mahadum Sayensị na Nkà na ụzụ nke Steeti Enugu ebe ọ nwetara asambodo PGD na nchịkwa ọha na M.Sc na ndị ọrụ nchịkwa mmadụ. [1] [2]

Ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'afo 1998, Ebe ọbụ na onwetela nnukwu ọganịhu na azụmahịa ya n'ime afọ ndị ọ tinyegoro ọ banyezie na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Sinetọ Mao zọrọ oche n'ụlọ nzukọ omeiwu nke nta nke ala Naijria n'okpuru nchedo nke otu United Nigeria Congress Party wee merie, tupu emebisia usoro ahụ. [1]

Ọ ghọrọ onye mbụ na-anọchite anya mpaghara Ọgbọ nta vootụ Arochukwu/Ohafia mgbe ọ zọrọ ọzọ ma merie na nhoputa ndi ochichi nke 1999 n’oge a n’okpuru otu ndoro-ndoro ochichi nke People's Democratic Party ma emesịa họpụta ya dika onye nnọchi anya Onye isi nke Ụlọ Ndị Nnọchiteanya. [3] Ọ gara n'ihu ịzọ oche maka ịnọchite Abia North na Ụlọ nzukọ omeiwu ukwu nke Naịjirịa na nhoputa ndi ochichi nke afo 2007 n'okpuru otu People's Democratic Party (PDP) ma omerigi, ma na-enweghị nkụda mmụọ, ọ gara n'ihu wee zoo na nhoputa ndi ochichi nke afo 2015 nke o meriri ma meriekwa na nke emeghariri n'abali isii nke ọnwa Machị, afo 2016 ka Ụlọikpe Mkpegharị kagburu mmeri ya na mbụ. [4] [5]

Chief Orji Uzor Kalu meriri Mao na Ntuliaka Ọchịchị Naịjirịa nke afo 2019, Onye nara ya oche ahụ [6]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Mao lụrụ Lady Barr. Nimi Faith Ohuabunwa onye ya na ya nwere umu. Ọ bụkwa onye nwe ma guzobere Mao Ohuabunwa Foundation. Ọ bụ nwanne Mazi Sam Ohuabunwa nke nta.

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndị nnọchi anya si Abia na National Assembly nke Naijiria

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]

 

  1. 1.0 1.1 Biography of Mao Ohuabunwa; Senator; Politician; Microbiologist; Abia State Celebrity.. Nigerian Biography. Retrieved on 4 July 2015.
  2. MEET THE ABIA 2015 DREAM TEAM. Archived from the original on 1 April 2016. Retrieved on 4 July 2015.
  3. Jostle for House leadership heightens intrigues and subterfuge. BiafraNigeriaWorld. Retrieved on 9 July 2015.
  4. "Abia North Re-run: INEC declares PDP’s Ohuabunwa as winner", Vanguard Newspaper, 6 March 2016. Retrieved on 6 March 2016.
  5. Ogunmade. "Abia North Rerun: Ekweremadu Congratulates Ohuabunwa", ThisDay Newspaper, 6 March 2016. Retrieved on 6 March 2016.
  6. adekunle (2019-02-24). Orji Kalu wins Abia North seat, Onyejiocha wins Reps (en-US). Vanguard News Nigeria. Retrieved on 2019-03-04.