Mapula Motlanthe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Mapula Motlanthe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Dị/nwunyeKgalema Motlanthe Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiFirst Lady of South Africa Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAfrican National Congress Dezie

Mapula Motlanthe (née Mopate) bụ onye bụbu First Lady nke South Africa na onye bụbu nwunye onye bụbu onye isi ala nke South Africa nakwa onye mkpọrọ Robben Island Kgalema Motlanthe.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Mapula Mopate si Sophiatown bịa ma kwuo Tswana.[1] Mapula malitere mmekọrịta ha na Kgalema Motlanthe n'oge afọ ịkpa ókè agbụrụ ma ha lụrụ na 1977. Ụmụ ha bụ Kagiso na Kgomotso.[2] Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ese foto na Leratong Hospital na Mogale City.[3] A mụrụ nwa mbụ ha n'afọ 1972.[1]

Mgbe ha lụsịrị, ya na ezinụlọ di ya na nwa ha nke abụọ biri, e jidere di ya ma zigara ya Robben Island.[1] Mgbe ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ ọ mụrụ nwa nwanyị, Ntabiseng. A gwaghị Ntabiseng na o nwere nna dị iche ruo mgbe ọ dị afọ 21.[4]

Ịgba arụkwaghịm nke Thabo Mbeki na ịnọchi di ya[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2008, onye isi oche ANC na onye isi ala South Africa, Thabo Mbeki gbara arụkwaghịm dị ka onye isi ala nke South Africa. NEC họpụtara Kgalema Motlante ka ọ bụrụ onye isi ala nke anọ na nke atọ na-esote ịkpa ókè agbụrụ nke South Africa.

A ṅụrụ Motlanthe iyi dị ka onye isi oche na Union Buildings na Pretoria, Mapula ghọkwara nwanyị mbụ nke mba ahụ.[3]

2009 General Elections[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2009, onye bụbu osote onye isi ala South Africa bụ Jacob Zuma nọchiri Kgalema Motlante, dịka onye isi ala ọhụrụ South Africa, a họpụtara Kgalema ka ọ bụrụ osote onyeisiala mba ahụ.

Ịgba alụkwaghịm[dezie | dezie ebe o si]

Mapula na Kgalema malitere ịgba alụkwaghịm n'afọ 2011, na 2014 ha bịara na nkwekọrịta enyi na enyi. Ọ natara ego ọnwa na ụlọ abụọ. Ya na di ya kewara ọtụtụ afọ.[4]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Ebrahim Harvey (2012). Kgalema Motlanthe: A Political Biography. Jacana Media, 22–. ISBN 978-1-4314-0438-4. 
  2. Kgalema Petrus Motlanthe, SAHistoryOnline, Retrieved 5 May 2016
  3. 3.0 3.1 Mapula Motlanthe, Who's Who SA, Retrieved 5 May 2016
  4. 4.0 4.1 Motlanthe, ex-wife settle divorce, Solly Maphumulo, Cape Times, Retrieved 5 May 2016