Margaret Gardiner (Miss Universe)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Margaret Gardiner (amụrụ n'abalị iri abuo na otu n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ iri na itoolu na iri ise na itolu ) bụ onye nta akụkọ South Africa na eze nwanyị mara mma onye bụ onye nmeri nke Miss Universe n'afọ iri na itolu na iri isaa na asatọ onye mbu south Africa bu nwanyị meriri Miss Universe. Ọ dị afọ iri na asatọ mgbe ọ meriri asọmpi ahụ.[1][2] Mgbe asọmpi atọ nke ọkara ikpeazụ gasịrị, ọ banyere na ndị ikpeazụ ise n'ọnọdụ nke anọ, mana o mechara merie asọmpi ahụ mgbe ọ zara ajụjụ ikpeazụ.

N'oge ihe omume ahụ e mere na Acapulco, ọ natara okpueze ya site n'aka Janelle Commissiong, onye isi ojii mbụ nwere aha asọmpi ahụ.[1] Ọ bụ naanị onye nwere utu aha Miss Universe site na South Africa ruo mgbe Demi-Leigh Nel-Peters kpuwere okpueze Miss Universe n'afọ iri abuo na iri na asato

Gardiner na ọwa YouTube ya na 2021

O nwere BA na akparamaagwa sitere na kọleji Charleston na onye dere akwụkwọ abụọ gbasara ahụike na ịma mma wee gaa Katidral St. George ebe Desmond Tutu kwusara ozi ọma. Ọ na-arụ ọrụ ugbu a dị ka onye nta akụkọ na-ebipụta na telivishọn na Los Angeles . Ọ lụrụ Andre Nel, onye prọfesọ nke Pediatrics na Health Public na UCLA . [3] [4]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]