Marie-Noëlle Koyara

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Marie-Noëlle Koyara
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịCentral African Republic Dezie
Aha enyereMarie-Noëlle Dezie
Ụbọchị ọmụmụ yaDisemba 1955 Dezie
Ebe ọmụmụCentral African Republic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language, Asụsụ Sango Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịindependent politician Dezie

   

Marie-Noëlle Koyara (amụrụ n'afọ 1955) bụ onye bụbu minista gọọmentị nke Central African Republic. Ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista na-ahụ maka nchekwa mba na 2015 .mekwa ya na afọ 2017 nakwa 2021. Ọ bụkwa nwanyị mbụ na-ahụ maka nchekwa na mba ahụ kemgbe NWere onwe malitere ịdị na afọ 1960.[1] Na oge gara aga onwere ọtụtụ ọkwa onye nye maka ma jee ozi dị ka onye nnọchi anya Central African Republic na Food and Agriculture Organization.[2][3]

Koyara gụrụ akwụkwọ na Bouar na Bangui. Ọ hapụrụ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ka a nabata ya na ndị uwe ojii mba, ebe ọ nọ wee bụrụ otu n'ime ụmụ nwanyị mbụ anabatara. Otú ọ dị, n'otu afọ ahụ nne ya nwụrụ, Koyara laghachikwara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ma mesịa gaa mahadum, gụsịrị akwụkwọ dị ka injinia na ahụ maka ọrụ ugbo. O nwere ọtụtụ ọkwa na ọrụ mmepe ọrụ ugbo, yana ịrụ ọrụ na African Development Foundation, tupu a họpụta ya ka ọ bụrụ minista na-ahụ maka nkwalite ime obodo ma mesịa bụrụ minista nke nkwalite ụmụ nwanyị na mmekọrịta mmadụ na ibe ya.[4] Ọ rụrụ ọrụ ndị Nyemeaka a n'agbata afọ 1993 na Kwa 1996.[5]

N'ikpeazụ, Koyara ghọrọ onye nnọchi anya Central Africa nke Food nakwa Agriculture Organization. Ọ biri na Cape Verde, nakwa afọ asaa na Burkina Faso, nakwa afọ asaa na okara na Ivory Coast. N'ọchịchị nke abụọ nke Nicolas Tiangaye, na June 2013, a họpụtara ya ka ọ bụrụ Minista nke Ọrụ Ugbo na Mmepe Ime Obodo, mgbe ahụ ọ nọ n'ọkwa Minista nke State nke Ọrụ na Mmekọrịta Ọha, na-aghọ nwanyị mbụ na-ahụ maka steeti na mba ahụ, mgbe ahụ Minista nke Steeti nke Mmepe Ime obodo, na Jenụwarị 2015 a họpụtara ọ bụ Minista nke mbụ nke Nchebe Mba.[4][6]

Nrụtụ aka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Centrafrique : Koyara, première femme à la Défense depuis l'indépendance (French). Jeune Afrique (17 January 2015). Retrieved on 22 January 2016.
  2. Interview with Marie Noelle Koyara State Minister of Rural Development in the Central African Republic. Food and Agriculture Organization (June 2014). Archived from the original on 13 October 2017. Retrieved on 23 January 2016.
  3. Poussou. "Marie-Noëlle Koyara: "Notre pays peut nourrir sa population et même la sous région"", Journal de Bangui, 7 November 2010. Retrieved on 23 January 2016. (in French)
  4. 4.0 4.1 Nzilo. "Interview exclusive de Mme Marie Noëlle KOYARA, première femme Ministre de la Défense", Corbeaunews Centrafrique. Retrieved on 23 January 2016. (in French)
  5. "Marie-Noëlle Koyara : le rôle de la femme au-delà de la crise, le cas de Côte d'Ivoire et de Centrafrique", Agence d'Information d'Afrique Centrale, 3 March 2014. Retrieved on 23 January 2016. (in French)
  6. Composition du gouvernement (French). France Diplomacie (28 October 2015). Retrieved on 23 January 2016.