Gaa na ọdịnaya

Marie-Roger Biloa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Marie-Roger Biloa
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịKameroon Dezie
Aha enyereMarie Dezie
Ụbọchị ọmụmụ yaunknown value Dezie
Ebe ọmụmụYaoundé Dezie
ŃnàGermain Tsala Mekongo Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaSpanish, English, German Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ntaakụkọ, editor-in-chief, oko akuko ihe onyonyo Dezie
Onye were ọrụJeune Afrique, Q104418982 Dezie
Onye òtù nkeAssociation de la presse diplomatique Dezie
Ihe nriteChevalier des Arts et des Lettres, Percy Qoboza Award Dezie
Webụsaịtịhttps://Africa-international.info. Dezie

Marie-Roger Biloa bụ ónyé nchịkọta akụkọ magazin Cameroon, ónyé na-eme ihe ngosi telivishọn, ónyé nta akụkọ, onye na'eme ihe nkiri na onye isi oche nke atụmatụ dị iche iche na-elekwasị anya na ọbọdọ. Ọ bi na France, ebe ọ na-akwado ihe ngosi okwu telivishọn. Na France, a kpọrọ ya Chevalier nke Order of Arts and Letters.[1] Maka ọrụ ya dị ka onye nta akụkọ, ọ nwetakwara onyinye Percy Qoboza. Ms Biloa nwere ebe nrụọrụ weebụ akpọrọ Africa-international.info.[2]

Oge ọ malitere

[dezie | dezie ebe o si]

Biloa bụ nwa nwanyị nke Germain Tsala Mekongo, onye na 1957 ghọrọ odeakwụkwọ mbụ nke steeti Cameroon màkà ọrụ gọọmentị. Ọ gàrà Mahadum Paris-IV, ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na ọmụmụ German.[3]

N'afọ 1991, Biloa ghọrọ onye nchịkọta akụkọ nke Africa International, magazin nke e guzobere na 1958 nke lekwasịrị ányá na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụkọ akụ na ụba na ọdịbendị mgbè Biloa sonyeere ya.[1]

Ka ógè na-aga, Marie-Roger Biloa sonyeere magazin pan-African na-ese okwu Jeune Afrique, nke a machibidoro iwu na mbụ n'ọtụtụ mba Northern Africa (Arab).[4]

N'afọ 1997, ụlọ ọrụ America, National Association of Black Journalists, sọpụrụ Biloa dị ka ónyé nta akụkọ nke afọ, na-anata ònyìnyé ahụ site n'aka Onye isi ala United States Bill Clinton n'onwe ya.[1]

N'afọ 2001, Unesco kpọrọ Biloa nwanyị kachasị mmà.[1]

Ịmalite ọwa telivishọn

[dezie | dezie ebe o si]

Ms. Biloa kwupụtara na Ọktoba 15, 2018, na ọ ga-amalite ọwa telivishọn ọhụrụ akpọrọ MRB TV (ekwesịghị ịgbagwoju anya na MRB Productions, ụlọ ọrụ na-emepụta ihe nkírí America), nke bụ ọwa tebụl cable na satellite.[2]

Ihe ọmụma nkeonwe

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ na-asụ asụsụ dị ichè ichè nke ọma, gụnyere Spanish, English, French na German. Biloa bi n'etiti Paris, Berlin na Yaounde, Cameroon.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Marie-Roger Biloa élevée en France au rang de chevalier de l'Ordre, des arts et des lettres (April 9, 2015). Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "auto" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 Cameroun : Marie Roger Biloa investit dans l'audiovisuel. Cameroun Online (October 15, 2018). Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "auto1" defined multiple times with different content
  3. Denise Epoté Durand, Marie Roger Biloa et elizabeth Tchoungui : les amazones du PAF (October 6, 2016).
  4. Jeter (October 30, 1996). International Afro Mass Media: A Reference Guide. Greenwood Publishing Group. ISBN 9780313284007.