Marie-Thérèse de Chateauvieux

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Nwa nwanyị nke Georges d'Armand de Chateauvieux na Amélie Adam de Villiers, a mụrụ Marie-Thérèse de Chateuvieux na Eprel 20, 1915, na Saint-Denis. Nwa nwa nke Marquis Joseph Antoine Sosthènes d'Armand de Chateauvieux, ọ bụ onye isi nke nnukwu ala ugbo nke Marquis guzobere na Hauts nke obodo Saint-Leu, mgbe nna ya Georges nwụrụ na 1961.

N'afọ 1965, de Chateauvieux bu nwanyị mbụ bụ onyeisi npaghara nke ngalaba Réunion. Ọ nọchiri Henri Bègue, onye gwara ya ka ọ nọchie ya dị ka onye isi obodo nke Saint-Leu. A họpụtara ya ọzọ na 1971 na 1976, tupu Mario Hoareau eti ya ihe na 1983. De Chateauvieux bụkwa General Councilor nke La Réunion na 1970.

De Chateauvieux bụ nwa nwanne nna nna onye ọchụnta ego Jacques de Chateauvierux. Ezinaụlọ ya nwere otutu ala nke oyibo kpolo(estate), mana ọ rere ha ka a gbanwee ya ka ọ bụrụ Nechonal Botanical Conservatory of Mascarin na mbido afọ 1990. O mere emume ncheta ọmụmụ 100 ya n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ya n'Eprel 20, 2015.[1]

De Chateauvieux nwụrụ na Eprel 12, 2017, na Paris, ụbọchị ole na ole tupu afọ 102 ya. E liri ya na Saint-Leu.[2]

  1. GG. "Marie-Thérèse de Chateauvieux, 1ère femme maire de la Réunion, fête ses 100 ans", Zinfos 974, l'info de l'ile de La Réunion. Retrieved on 2017-11-23. (in fr)
  2. "Marie Thérèse de Chateauvieux, ancienne maire de Saint-Leu, est décédée à 101 ans", Zinfos 974, l'info de l'ile de La Réunion. Retrieved on 2017-11-23. (in fr)