Mary L. Proctor

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mary L. Proctor
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereMary Dezie
aha ezinụlọ yaProctor Dezie

"Missionary" Mary L. Proctor (amụrụ n'afọ 1960) bụ ónyé America na-ese ihe, nke a maara nke ọma màkà ihe osise ọhụụ ya, collages, na assemblages.

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Mary Proctor (née Cooksey) na 1960 na Pauline Cooksey na Lloyd, Florida.[1] Nné ya dị afọ iri na otu enweghị ike ilekọta ya, ya mèrè nné na nnà ya zụlitere ya.[2] Nne nne ya bụ onye Africa-America na-elekọta ụlọ na nna nna ya bụ onye ọrụ ugbo ọcha. Proctor gara ụlọ akwụkwọ ọha na eze ruo mgbè ọ tụụrụ ime na klas nke itoolu. Mgbè ahụ, ọ were ọrụ ịzụlite ụmụnne ya ndị obéré.

Alụmdi na nwunye[dezie | dezie ebe o si]

Mgbè ọnwụ nna nna ya, na ọgụ nné nné ya na ịṅụbiga mmanya ókè, Mary zutere ma lụọ Tyrone Proctor. Ha abụọ kwagara Tallahassee, Florida.[2]

Ọrụ mmalite[dezie | dezie ebe o si]

Mgbè ọ rụchara ọrụ n'ọhịa ndị nọọsụ ruo afọ iri, Proctor meghere Tender Loving Care Day Care Center ma bụrụ ónyé nwe ya ruo afọ ise. N'ịchọ 'ihe dị mfe' Proctor malitere ịnakọta ihe site n'akụkụ ụzọ iji ree na ahịa flea dị n'ógbè ahụ.[3] N'ikpeazụ, ọ meghere ụlọ ahịa nke ya, "Noah's Ark Flea Market". Ịchịkọta ihe ka bụ ihe ntụrụndụ ya.

Ọrụ dị ka onye na-ese ihe[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1994, ọkụ gbara ụlọ gbùrù nne nne Proctor, nwanne nne ya na nwanne nna ya. Proctor na-ekwu na o nwèrè ọhụụ ozugbo tupu ọkụ ahụ emee ebe ọ "... hụrụ ìhè na-aga n'eluigwe". Mgbè ọkụ ahụ gasịrị na 1995, Proctor kwuru na o nwere ọhụụ n'oge ekpere nke gwara ya ka ọ "Pint".[4] Ọhụụ ndị a kpaliri ya ịmalite ịchụso ya dị ka onye na-ese ihe. Ihe mbụ ya bụ foto, nke e sere n'ọnụ ụzọ, nke ndị ezinụlọ ya nwụrụ n'ọkụ ahụ. O debere ha n'ihu ụlọ ya ebe ha dọtara uche ónyé nlekọta na onye nkatọ Tricia Collins, onye zụrụ ha maka gallery ya na New York.[5]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Arnett (2001). Souls grown deep : African American vernacular art of the South., 1st, Tinwood Books. ISBN 9780965376631. 
  2. 2.0 2.1 Mary Proctor. Souls Grown Deep. Retrieved on 30 March 2019.
  3. Mary Proctor | Souls Grown Deep Foundation (en). www.soulsgrowndeep.org. Retrieved on 2017-03-27.
  4. Clendinen. "ART; A 2,000-Mile Forage for Folk Art", The New York Times, 2004-04-04. Retrieved on 2018-03-04. (in en-US)
  5. Don't Ignore Signs: The Art of Missionary Mary Proctor (en-US). THE BITTER SOUTHERNER. Retrieved on 2019-03-30.