Mary Njoku

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mary Njoku
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereMary Dezie
aha ezinụlọ yaNjoku Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20 Maachị 1985 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, onye na-emeputa ihe nkiiri, onye ọchụnta ego Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2003 Dezie

Mary Nnenna Njoku (amakwaara ya dị ka Mary Remmy ma ọ bụ Mary Remmy Njoku, nke amụrụ na ụbọchị iri abụọ na Machị n'afọ 1985) bụ onye Nigerian na eme ihe nkiri ma na-emeputakwa fim. Njoku bukwa onye isi na ụlọ fim, ROK Studios, ndi nke nwegoro mmeri na ihe banyere ọrụ ha (ime fim). nke di na Lagos, Nigeria. Na oge na adịbeghị anya, otu nnukwu TV ndị French, amara dị kaCANAL zụta ụlọ ọrụ ahụ . [1] Ọ rụpụtara ma sonye na ihe nkiri Thy Will be Done, Husbands of Lagos, Single Ladies na Festac Town .

Uto na ịgụ akwụkwọ ya[dezie | dezie ebe o si]

Mary Njoku, onye bụ nwa nke isii n’ime ezinụlọ nke mmadụ asatọ, bụ onye amụrụ na Amuwo Odofin, Lagos, Nigeria. Ọ bụ nwafọ Igbo onye Nsukka, Enugu State . [2] Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị nke Amuwo Odofin, National College Bagada na Navy Town Secondary School. Ọ nwere diploma di na sayensị nke cọmpụta. Site n'afọ 2010, Njoku gara na Mahadum Lagos State ebe o guru akwukwo wee nweta asambodo asusu Bekee. Na 2012, Njoku gara London Movie Academy na UK ebe ọ mere ihe ọmụmụ na akụkụ dị iche iche n'ime Mmepụta ihe nkiri. Site na nwata, o nwere mmasi ime ihe nkiri, ọwee bido ime ihe na onyonyo mgbe ọ no na ụlọ akwụkwọ. Njoku sonyeere ụlọ ọrụ Nollywood na 2003, mgbe ọ dị afọ iri na asaa. [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Njoku pụtara na ihe nkiri ya mbu na fim Nollywood n’afọ 2004 nke akpọ ‘Home Sickness’ nke Chioma Chukwuka Akpotha so kwa na ya. Nwanyị a bịara bụrụ onye amara ama mgbe ọ rụsịrị ọrụ nke Nollywood akpọrọ 'Blackberry Babes' n’afọ 2011. [4] N’agbata afọ 2011 na 2013, Njoku wepụtara iROKtv, na ihe ntanetị nke YouTube nke na egosipụta ajụjụ ọnụ agbara ndị a ma ama na-eme ihe nkiri na Nollywood na ihe egwu Afrobeats na Naijirịa. N’afọ 2015, Njoku ghọrọ Onye Ọkachasị Edemede na ụlọ ọrụ IROKO Partners. Ka ọ na-erule March, o mere ihe ngosi nke mbu n'ụwa niile maka ihe nkiri Thy Will Be Done na BFI IMAX London, ihe nkiri nke izizi Nollywood mbụ na IMAX. [5] Na n’afọ 2018 na ọnwa Ọgọstụ, Njoku mepụtara ihe nkiri Nwanyioma, ebe ọrụ ya chọrọ ka ọ kpụchaa ntutu isi ya kpamkpam. [6]

ROK Studios[dezie | dezie ebe o si]

N’ọnwa Ọgọstụ n’afọ 2013, Njoku hibere ROK Studios. Kemgbe o bidoro na 2013, ROK ewepụtala ihe nkiri kariri narị ise na iri anọ na ihe usoro TV iri abụọ na ise nke ọbụ ha malitere. Festac Town, Single Ladies [7], Body Language, Losing Control na Husbands of Lagos sokwa na ọrụ aka ha. [8] N’afọ 2016, Njoku hiwere ROK na Sky [9], netwọkụ nke ana enweta na UK. Iji mee mmemme ahụ, ụfọdụ n'ime ndị ọrụ ibe ya Nollywood gara nnọkọ mmemme ahụ nke weere ọnọdụ na National High Commission na UK. [10] N'otu afọ ahụ, Njoku hiwekwara ROK na DSTV, maka iji igwe teknụzụ na-efefe ọrụ ya na mpaghara Afrịka niile. [11] [12] Na ọnwa Eprel n'afọ 2018, ROK Studios mepụtara ọwa ọhụrụ abụọ, ROK2 na ROK3 na DSTV, iji mezuo ọnụ ọgụgụ ebe ha egosiputa ọrụ ha maka agụụ nke ọtụtụ ndị mmadu na ihe ha na-eme. ROK2 na-ekesa ọdịnaya gosipụtara mmalite nke Nollywood, ebe ROK3 na-egosi ọtụtụ onyinye ndị Ghana, ma nwee atụmatụ ọwa egwu na mgbakwunye ihe nkiri na ihe usoro usoro nke bụ ihe ana eme awa iri abụọ na anọ anaghị akwụsị akwụsị. [13] N’afọ 2019, Njoku lekọtara ka CANAL+ si were gota ROK, nkwekọrịta mba ụwa kachasị ukwuu maka akara Nollywood. [14]

Spark[dezie | dezie ebe o si]

N’ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2013, ya na Jason Njoku na Bastian Gotter, ndị ha na ya na-azụ ahịa, wepụtara nde dollars abụọ maka dị ka ego nkwado inyere ndị na mmalite ọrụ teknụzụ na ihe gbasara ntanetị na Legọs a na-akpọ Spark aka. [15]

Ndụ onwe ya[dezie | dezie ebe o si]

Mary Njoku lụrụ onye ọchụnta ego Naịjirịa ama ama na Britain, nke bụkwa onye na etinye ego na ihe mbido teknụzụ (start-up) na Africa, Jason Njoku. Ha gbara akwụkwọ na Festac, Lagos na ụbọchị iri na asatọ ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2012, n'ihu ezinụlọ, ndị enyi na ndị ọrụ ibe ha. Ha mụrụ nwa nwoke na mbụ, Jason Obinna Njoku, na ụbọchị iri atọ n'ọnwa Julaị n'afọ 2013, mụọ nwa nke abụọ Nwakaego Annabelle Njoku na ụbọchị iri abụọ na anọ n'ọnwa Ọgọst n'afọ 2015, ha wee nabata nwa ha nke atọ, Amber Nnenna Njoku na ụbọchị anọ n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2017. [16]

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]