Mary Uduma

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mary Uduma
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Mee 1952 Dezie

Mary Uduma (a muru na abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Mei na afọ otu puku narị iteghete na iri ise na abụọ (1952)) [1] bụ onye isi nzube ahia Naijiria. Ọ bụ onye isi ala Nigeria Internet Registration Association (NIRA) ugboro abụọ. [2] [3] Ọ bụ onye isi oche Nigeria Internet Governance Forum. [4] [5]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Uduma gụrụ akwụkwọ ndekọ ego na Institute of Management Technology, Enugu (IMT). O mechara gaa Mahadum nke Lagos wee nweta nzere B.Sc na mgbakọ na nwepụ nke bekee kpọrọ akaụntin. [1]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Uduma rụrụ ọrụ na Audit nke gọọmenti etiti dị ka onye isi ọrụ mgbe ọ ka na-agụ akwụkwọ na Mahadum Lagos. O mechara rụọ ọrụ na Ivory Merchant Bank. [1]

N'afọ 1995, Uduma sonyeere Nigerian Communications Commission dịka onye nnyere aka n'ihe gbasara ego. Na 1999 ọ ghọrọ osote onye nduzi na ngalaba tarifu na ụgwọ. A kwagara ya na nhazi ụlọ ọrụ na afọ puku abụọ na ise ebe ọ rụrụ ọrụ otu afọ tupu ọ bụrụ onye nduzi nke ikikere. Ọ ghọrọ onye isi ihe gbasara ndị ahịa na na afọ puku abụọ na ịrị na otu (2011). [1]

Ọ rụrụ ọrụ dịka osote onye isi oche nke Nigeria Internet Registration Association (NIRA) tupu ọ pụta dị ka onye isi nke abụọ nke otu ahụ. [3] [2] Ahọpụtakwara ya ọzọ dịka Onye isi nke atọ. [2] [6] Ọ bụ onye isi oche nke Nigeria Internet Governance Forum (NIGF). [7] [8] Ọ nọchitere anya NIGF na mmemme ụbọchị ụmụ nwanyị n'emume umunwanyi na mba ụwa niile, bụ nke e mere na Abuja na afọ puku abụọ na ịrị na itenani, wee kwuo maka ntinye ụmụ nwanyị na-ekwu okwu na amụma metụtara oghere ịntanetị ma na mpaghara ma na mba ụwa. [4] [9]

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ puku abụọ na ịrị na isii (2016), ọ nwetara nturu ugo pụrụiche site n'aka NIRA Presidential Award, nke Nigeria Internet Registration Association (NIRA). [10] [11]

Ntụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 The Communicator Online - The Communicator Online. www.ncc.gov.ng. Retrieved on 2020-05-08.
  2. 2.0 2.1 2.2 NiRA BOD - Nigeria internet Registration Association (NiRA). www.nira.org.ng. Archived from the original on 2020-08-05. Retrieved on 2020-05-08.
  3. 3.0 3.1 There is money in domain name business, NIRA Boss (en-US). Vanguard News (2010-09-07). Retrieved on 2020-05-08.
  4. 4.0 4.1 #InternationalWomensDay: Working on digital inclusion for women —NIGF (en-US). Vanguard News (2019-03-08). Retrieved on 2020-05-08.
  5. Nigeria's internet users reaches 103m - NCC - P.M. News. www.pmnewsnigeria.com. Retrieved on 2020-05-08.
  6. NiRA Decries Govts, MDAs Hosting .ng Servers Abroad (en-GB). Daily Times Nigeria (2015-03-16). Retrieved on 2020-05-08.
  7. ICT expert urges government to build more ICT hubs.
  8. NIGF to focus on enabling digital commonwealth for growth.
  9. IGF seeks women participation in internet governance for development.
  10. Mary Uduma, CFA, Wunmi Hassan Receive NiRA Presidential Awards 2016 (en-GB). CFAmedia.ng - Startups | Media | Business | Technology News (2016-04-04). Retrieved on 2020-05-08.
  11. Mary Uduma, others awarded at 2016 NiRA awards ceremony (en-US). TechCity (2016-04-04). Retrieved on 2020-05-08.