Maryam babangida

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Maryam Babangida

A mụrụ oriakụ Maryam Babangida n'onwa Novemba n' afọ 1948. ọ bụ nwunye Jenaral Ibrahim Badamasi Babangida,onye isi ala obodo  Nigeria bido n'afọ 1985 rue n'afọ 1993. Jenaralụ a nwetara ọtutụ nkọtọ banyere mpụ na aghụghọ di n'ọchịchị ya mgbe ọ na achị. ọ  bụ ya bidoro ọnọdụ ana akpọ First Lady of Nigeria ma mee ya o kwụru chim.

Dika  first lady, O bidoro ọtụtụ ihe di iche iche iji nyere ụmụ nwaanyị aka. Ihe ndia mere ka "Maryam bụrụ onye ama ama ma na ewu ewu tumadi nihe gbasra mma ya, ekike ya na ebube ya, ọ bụ onodu a ka ọnọgidere tupu onwa a nakwa mgbe di ya rituru n'okwa .

Mbido ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Maryam King n'afọ1948 n' Asaba (present-day Delta State),ebe o gụrụ akwụkwọ praimari .  Nne na Nna ya bụ  Hajiya Asabe Halima Mohammed sitere  Niger State, onye Hausa, na Leonard Nwanonye Okogwu onye Asaba, bụrụkwa onye Igbo.O mechara gaa na north na Kaduna n'ụlọ akwụkwọ sekọndiri nke  Queen Amina's College. Ka ọ guchara o nwetere orụ dika ode akwụkwọ na Federal Training Centre, Kaduna. O mechakwara nweta nzere diploma maka ode akwụkwọ site na  La Salle Extension University (Chicago, Illinois) nakwa asambodo na kọmputa sayensị site n'istitute NRC di na Lagos.

Ka ọnwa seputemba di n'mkpụrụ ụbọchị isii n'afọ 1969 tupu o rue afọ iri abuo na otu ọ lụrụ  Major Ibrahim Badamasi Babangida. Ha mụrụ ụmụ anọ. ụmụ nwoke abụọ  Mohammed na Aminu, na ụmụ nwanyi abuo  Aisha na Halima. ka di ya rigoro n'okwa onye isi ndi soja n'afọ 1983 dika Army Chife, Maryam Babangida  bụrụzia onye isi ndi nwunye ndi army ana akpọ  Nigerian Army Officers Wives Association (NAOWA). O gbara mbọ n'ọnodu a rụpụta ụlọ akwụkwọ di iche iche. ụlọ ọgwụ, ebe ọzụzu ụmụ nwanyi nakwa ebe nledo ụmụ aka amụrụ ọghụ.

ụfọdụ ihe na- amasi ya bụ ọrụ ugbo, idozi ụlọ,egwu, egwuregwu squash,badmington, inyere ndi mmadụ aka na igụ akwụkwọ.

First lady[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe di ya chịwara dịka Onyeisi ala n'afọ1985,  Maryam Babangida kpọgotere ụmụ ya na Dodan Barracks di na Lagos. Odoziri ụfọdụ ọnụ ụlọ di na baraks mee ha ,ha maa mma maka ile ndi ọbia.  Dodan barracks  so n'ebe izizi Maazi Gideon Orkar wakporo n'afọ  1990 mgbe ọ chọrọ inara ọchịchị n'ike n'aka Ibrahim Babangida, onye nke nọ n'ụlọ mgbe ahụ mana ojisiri ike si n'azụ ụlọ gbafuo.

Dika  First Lady nke Nigeria bido n'afọ 1985 ruo afọ1993, Ọ tụghariri ọnọdụ first lady a buruzia ihe butere mepe obodo ma na enyere ma akwalite ụmụ nwanyi . o bidoro otu a na akpọ  Better Life Programme for RuralWomen n'afo 1987 nke a bidoro otu di iche iche dika  co-operatives, ụlọ ọrụ mbipụta,ọrụ ugbo, obere ụlọ ahia,ahia,ebe ọzụzụ ụmụ nwanyi nakwa ebe nletena na nchedo ụmụnwanyi.   Maryam Babangida  bidoro National Centre for Women's Development n'afo1993 maka nchoputa,ozuzu nakwa nchikota umu nwanyi maka inyere onwe ha aka

O gbara mbọ ihu na umu nwanyi nwere ọnụ okwu n'obodo. nke a mere o ji gaa hu nwunye onye isi ala ndi ozo iji gwa ha mkpa odi inyere ụmụnwaanyị  obodo ya aka.

Akwụkwọ ya nke akpọrọ, Home Front: Nigerian Army Officers and Their Wives, ebiputara n'afọ 1988,  gbadoro ụkwụ n' ọrụ ụmụ nwanyi n'ezinulo nakwa otu ha si akwado ndi di ha n'ezinulo. mana akwukwo a nwere otutu ndi kọtọrọ ya.

Ọrụrụ ọ rụrụ ya na ndị National Council for Women's Societies (NCWS) mere ka ọ nyere aka nweta nkwado tụmadi otu  SFEM (Special Foreign Exchange Market)na-ibelate ọnụ ngwa ahia nakwa ime ka ego Nageria nwee ugwu. Ebube nwaanyi a bụ  ihe na-ede ude.  Mgbe emere ngosi ọrụ aka nke otu ya better life gosiri n'abali asaa n'afọ 1990, otu onye nta akụkọ kwuru na Maryam dika Ezenwaanyị ndị Rome nọ n'oche Eze ya juputa n'ebube nakwa uwe na-akpụ n'ala nke mmadụ enweghi ike ịkọwa. Ụmụnwaanyị ji ta eme ọnụ, ebube ya bụkwa ihe eji ekwu okwu na -agbanyeghi na di ya apụọla n'ọkwa. 


Ọrịa na ọnwụ[dezie | dezie ebe o si]

Na ọnwa November 15, 2009, asịrị  anụrụ bu na  nwanyị mbụ anwụọla n'ụra ụlọ ọgwụ di na Mahadum California (UCLA) Jonsson Comprehensive Cancer Center nke Los Angeles banyere nsogbu ndị na-akpata ọrịa cancer nke ovarian . Otú osina di , onye na-enyere di ya  aka, kwuru, sị "Nwaanyị  a bụ Maryam Babangida dị ndụ. . . Agwara m ya banyere asịrị na-agbasa na Nigeria banyere ọnwụ ya ma ọ chịrị ọchị, si na ndị na-ebu akụkọ ahụ ga ebu ya ụzọ nwụ . "

Maryam nwụrụ ka ọ gbara afọ iri isii na otu ( 61) site na ọrịa cancer ovarian na 27 December n'afọ 2009 na ụlọ ọgwụ dị na Los Angeles, California . Di ya nọ n'akụkụ ya mgbe ọ nwụrụ.  Ekwuru na  Onye isi oche nke Senate nke Naijiria, bụ David Mark, kwara ákwá mgbe ọ nụrụ akụkọ ahụ.

Ndi akwụkwọ akụkọ Times nke Nigeria kọrọ banyere ọnwụ ya ma kwuo na "eweere ya dịka otu n'ime ụmụ nwanyị kachasị ukwuu n'Africa taa".

Bibliography[dezie | dezie ebe o si]

  • Maryam Babangida (1988). The home front: Nigerian army officers and their wives. Fountain Publications. 

References[dezie | dezie ebe o si]