Maurice Mugisha

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Maurice Mugisha
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Aha enyereMaurice Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1978 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ntaakụkọ, oko akuko ihe onyonyo Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University Business School Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2005 Dezie

Maurice Herbert Mugisha, bụ onye nta akụkọ obodo Ugandan, onye mgbasa ozi na onye isi ụlọ ọrụ na-arụ ọrụ dị ka osote onye isi nchịkwa nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi gọọmentị, Uganda Broadcasting Corporation (UBC), malite n'ọnwa Ọktoba na afọ 2018.[1]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

O nwere nzere Bachelor of Business Administration, nke Makerere University Business School (MUBS) nyere, na Nakawa Division nke Kampala, isi obodo Uganda, n'afọ 2003.[2]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Malite dị ka onye na-akọ akụkọ na afọ 2006, ọ rịgooro n'ọkwa "Onye isi nke mmepụta akụkọ", n'oge ọ hapụrụ n'ọnwa Ọktoba afọ 2018. Mgbe ahụ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi Uganda were ya n'ọrụ dị ka osote onye isi nchịkwa.[1][3][4]

Ezinụlọ[dezie | dezie ebe o si]

Mugisha lụrụ onye ama ama, Irene Birungi onye bụ onye ọchụnta ego Ugandan, onye mgbasa ozi na onye na-ede akwụkwọ akụkọ nke na-arụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ onwe onye maka nchịkwa n'ọfịs onye isi ala nke Uganda, Yoweri Kaguta Museveni, malite na Septemba afọ 2017.[5] Ha bụ nne na nna nke otu nwa nwoke (site na mmekọrịta gara aga n'akụkụ Birungi), na ụmụ nwanyị abụọ ha nwere.[6]

Ihe ndị ọzọ a na-atụle[dezie | dezie ebe o si]

Maurice Mugisha bụ onye nchoputa, ma na-eje ozi dị ka onye nduzi na All Round Consult, ụlọ ọrụ mgbasa ozi na mmekọrịta ọha na eze na mpaghara Bukoto nke Kampala, isi obodo Uganda.[7]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Chimp (1 October 2018). Maurice Mugisha Quits NTV, Joins UBC as Deputy MD. Chimp Reports. Retrieved on 3 February 2019.
  2. Clare Nassuuna (28 November 2016). Interview: For NTV’s Maurice Mugisha, campus life should be enjoyed maximumly. Campus Bee Uganda. Retrieved on 4 February 2019.
  3. Kungu Al-Mahadi Adam (29 October 2018). Another Journalist Quits NTV For BBS Television. SoftPower Uganda.
  4. Agencies (12 October 2018). Revamp: Uganda National Broadcasting Television poaches NTV’s Maurice Mugisha. PMLDaily.com. Retrieved on 4 February 2019.
  5. Gee Mukama (21 September 2017). Maurice Mugisha's Wife Lands A Juicy Job in Statehouse. Howwe Entertainment. Retrieved on 4 February 2019.
  6. Okuda (26 July 2014). I’m older than Maurice, but so what?. Retrieved on 4 February 2019.
  7. All Round Consult (January 2019). All Round Consult Uganda Limited: Team : Maurice Herbert Mugisha, Co-Founder and Director. All Round Consult Uganda Limited. Archived from the original on 7 February 2019. Retrieved on 5 February 2019.