Milka Chepkorir

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Milka Chepkorir
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịKenya Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1990 Dezie
Ọrụ ọ na-arụcoordinator, onye na-akwado ikike mmadụ, project manager Dezie
ebe agụmakwụkwọMaseno University, University of Nairobi Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2010s Dezie
agbụrụSengwer people Dezie
kọwara na URLhttps://www.iccaconsortium.org/index.php/people/milka-chepkorir/, http://www.jwhinitiative.org/participants/2545/ Dezie

Milka Chepkorir (amụrụ n'afọ 1990) bụ onye na-amụ banyere ụmụ mmadụ, ihu igwe na ikike mmadụ. A makwaara ọrụ ya mgbe ọ ghọrọ onye nnọchi anya Sengwer People ndị bi gburugburu Embobut na Kapolet Forest iji chebe ikike ha mgbe Kenya Forest Service (KFS) chụpụrụ ha n'ike.

Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Chepkorir bụ nke ndị Sengwer si n'ọhịa Kapolet.[1] Ọ bi na Kitale, Kenya.[2] O nwetara nzere Bachelor of Anthropology na Mahadum Maseno .[3] Ka ọ dị ugbu a, ọ na-aga n'ihu na ọmụmụ ya site n'ịga Masters na Gender and Development Studies na Mahadum Nairobi n'okpuru onyinye JHW.[4]

Ịgba mbọ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbalị ya malitere mgbe ọ ka nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị.[5] N'agbanyeghị nkea makwaara ọrụ ya mgbe ọ ghọrọ otu n'ime ndị otu UN Human Rights Office Indigenous Fellowship Programme na 2016.[6]

Site na mkpakọrịta a, ọ gara 16th United Nation Permanent Forum on Indigenous Issues na New York ma kọọ enweghị mmejuputa ikike ụmụ amaala site na UN site na ịnọchite anya Forest Peoples Programme, Natural Justice na òtù 20 ndị ọzọ. Ọ na-ekwukwa mmebi iwu nke KFS ebe ha gbara ụlọ ịrị itoolu nke ndị Sengwer ọkụ nke malitere mgbe European Union na ụlọ akụ ụwa na-akwado ha.[7]

Ọ laghachiri na 17th United Nation Permanent Forum on Indigenous Issues na 2018 wee kọọ mmeso ọjọọ nke ụlọọrụ Kenya Forest Service site n'ịchụpụ ndị Sengwer n'ala nna nna ha.[8] Ndị Sengwer na-eche nchụpụ nke sitere na Water Towers Protection na Climate Change Mitigation and Adaptation Programme nke European Union kwadoro. Ọ bụ KFS na nkwupụta Chepkorir mere nchụpụ a:

"Ha kpọọrọ nwa nwoke dị afọ isii wee soro ya gbaa ụlọ ọkụ mgbe nne ya gbapụrụ. Ha hapụrụ naanị ya n'ime ọhịa n'abalị".[9]

N'ịgbaso akụkọ a, EU kwụsịrị ọrụ ahụ.[10]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ugbu a, ọ na-arụ ọrụ dị ka onye nhazi nke Community Land Action NOW! (CLAN), onye nhazi maka nchekwa mpaghara ndụ na onye ndụmọdụ maka ego Agroecology.[11]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Paige (2020). in Annelieke: Embedding gender justice in environmental action: where to start?. Amsterdam: Both ENDS, 24. 
  2. Milka Chepkorir (en-GB). ICCA Consortium. Retrieved on 2022-04-20.
  3. Milka Chepkorir Kuto · (en-US). Global Environments Network. Retrieved on 2022-04-20.
  4. Milka Chepkorir, Kenya. JWHinitiative. Archived from the original on 2022-03-07. Retrieved on 2022-04-20.
  5. Starting young to help her community. Office of the United Nations High Commissioner for Human Rights (8 August 2016). Retrieved on 20 April 2022.
  6. Indigenous peoples’ rights violated in the name of conservation - IWGIA - International Work Group for Indigenous Affairs. IWGIA (31 August 2016). Retrieved on 2022-04-20.
  7. Indigenous peoples and conservation: a call to action (en-GB). Natural Justice (2017-05-10). Retrieved on 2022-04-20.
  8. Lieberman. "Indigenous leaders at UN forum ask for more accountability in international aid", Devex, 20 April 2018. Retrieved on 20 April 2022.
  9. Mwanza. "Kenya's Sengwer say they face fresh threat of eviction from their forest land", Reuters, 2018-01-05. Retrieved on 2022-04-20. (in en)
  10. EU suspends its support for Water Towers in view of reported human rights abuses. EEAS (17 January 2018). Archived from the original on 4 October 2021. Retrieved on 20 April 2022.
  11. Donors, Advisors, and Staff (en-US). AgroEcology Fund. Archived from the original on 2021-12-21. Retrieved on 2022-04-20.