Mmekọrịta mmadụ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Mmekọrịta Mmekọrịta mmadụ bu ótụ ndị ndi nchọpụta nke nhazi ụlọ oru, bú ndi n'eme nchoputa maka omume nke ndị mmadụ n'ìgwè, o kachasi otu ndi dịgasị n'ụlọ oru, na ihe ndi ozo yitere isiokwu a na-ngalaba mmụta 'Industrial and Organizational Psychology'. Ọ malitere na 1930s na ọmụmụ nke 'Hawthorne, nke nyochara mmetụta nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya, mkpali na afọ ojuju ndị ọrụ na mmepụta ihe. Ndị otú ahụ lere ndị ọrụ anya n'ihe gbasara akparamàgwà ha na ụlọ ọrụ ha, karia ịbụ akụkụ ndị a na-agbanwere, ọ nwé kpalite ịmepụta ọzụzụ nke 'Njikwa Mmekọrịta Mmadụ na ibe ya.

Elton Mayo kwusiri ike na ihe ndị a:

  1. Ike nke òtù nkiti, nke akụkụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-ebute ụzọ karịa usoro nhazi ọrụ otu.
  2. Mkpa maka nkwurịta okwu, nke nkwurịta okwu di ụzọ abụọ, site na onye-ọrụ gaa na onye isi, nakwa site n'onye isi gaa na onye-orụ.
  3. Ikwalite idu ndú n'ebe ọ di elu maka iji kwuputa kpọmkwem ihe e bu n'uche na iji hụ na mkpebi dị irè ma gakọọ ọnụ.[1]
  1. Wilson & Rosenfield. Managing Organizations. London: McGraw Hill Book Company, 9.