Mohamed Zouaoui

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mohamed Zouaoui
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịFrench protectorate of Tunisia, Tunisia Dezie
aha n'asụsụ obodoمحمد الزواوي Dezie
Aha enyereMohamed Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Ebe ọmụmụMahdia Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee Dezie

Mohamed Zouaoui (Arabic: محمد الزواوي), bụ onye na-eme ihe nkiri a mụrụ na Tunisia nke bi na Ịtali. N'afọ 2004, ọ pụtara nke mbụ ya na telivishọn, nweta ọrụ mbụ ya na miniseries TV Posso chiamarti amore?. Ọ rụkwara ọrụ na Nassiryia - Per non dimensicare (Nasiriyah - Ka anyị ghara ichefu), Capri, na RIS Delitti Imperfetti (Scientific Investigations Unit: Imperfect Crimes). N'afọ 2007, ọ rụrụ ọrụ na miniseries Liberi di giocare . Ihe nkiri izizi ya bụ ihe nkiri afọ 2008 L'ultimo pulcinella, nke Maurizio Scapparo duziri. N'afọ 2009, ọ pụtara na I mostri oggi, n'afọ 2010 pụtara na The Father and the Foreigner . N'afọ 2010 ọ rụrụ ọrụ na I fiori di Kirkuk, nke Fariborz Kamkari duziri. Maka ọrụ a, o nwetara ọtụtụ onyinye, gụnyere "Golden Globe" 2011 Globo d'Oro maka Best New Actor.[1]

N'afọ 2012, ọ pụtara na ihe nkiri onwe ya Carta Bianca, nke onye nduzi Colombian Andreas Maldonado, ihe nkiri dabeere na akụkọ eziokwu.

N'etiti afọ 2014 na 2016 Zouaoui na-ekere òkè n'ọtụtụ ọrụ gụnyere, Movies, obere ihe nkiri, na usoro TV.

N'afọ 2018 o sonyere na ihe nkiri Beirut, nke Brad Anderson duziri na Jon Hamm nakwa Rosamund Pike. Ihe nkiri ahụ gosipụtara na Sundance Film Festival afọ 2018 na Jenụwarị 22.

N'otu afọ ahụ, ọ bụ onye isi ihe nkiri Italian-Moroccan Catharsys maọbụbụ The Afina Tales of the Lost World, nke e gosipụtara na asọmpi n'ọtụtụ mmemme dị mkpa gụnyere Turin Film Festival na Marrakech International Film Festival.

N'afọ 2019 ya na Claudia Gerini gbara ihe nkiri Burraco Fatale nke Giuliana Gamba.

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Cinema[dezie | dezie ebe o si]

  • Nuovomondo, nke Emanuele Crialese duziri (2006) (olu)
  • L'ultimo Pulcinella, nke Maurizio Scaparro duziri (2008)
  • I mostri oggi, nke Enrico Oldoini duziri (2009)
  • I fiori di Kirkuk, nke Fariborz Kamkari duziri (2010)
  • Il padre e lo straniero, nke Ricky Tognazzi duziri (2011)
  • Carta bianca, nke Andres Arce Maldonado duziri (2013)
  • Come noi, nke Enrico Lando duziri (2014)
  • Dead on Time, nke Rish Mustaine duziri
  • Florence, Yesterday, nke Ursula Grisham duziri (2016)
  • Aeffetto Domino, nke F. Massa duziri (2017)
  • Beirut, nke Brad Anderson duziri (2018)

Telivishọn[dezie | dezie ebe o si]

  • Posso chiamarti amore?, nke Paolo Bianchini duziri (2004)
  • Sottocasa (2006)
  • Nassiriya - Per non dimensicare, nke Michele Soavi duziri (2006)
  • Liberi di giocare, nke Francesco Miccichè duziri (2007)
  • La ladra, nke Francesco Vicario duziri (2010)
  • Capri, nke Francesca Marra duziri (2010)
  • Un amore e una vendetta, nke Raffaele Mertes duziri (2011)

Ihe nrite[dezie | dezie ebe o si]

  • Globo d'Oro maka onye na-eme ihe nkiri ọhụrụ kacha mma[1]
  • Chieti Film Festival Flaiano Award
  • 2011 Poggio mirteto Filmfestival onye na-eme ihe nkiri mba ọzọ kacha mma
  • 2010 Grand Prix International Best Performance na The Flowers of Kirkuk

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Vincitori Globo d’ Oro 2011: premio Miglior Film ad Habemus Papam di Nanni Moretti al Globo d’ Oro 2011. Iocinemablog.it. Retrieved on 2014-07-17. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "iocinemablog1" defined multiple times with different content

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]