Muhammad al-Mahdi al-Majdhub

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Muhammad al-Mahdi al-Majdhub
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Aha enyereMuhammad Mahdi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1919 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1982 Dezie
Ọrụ ọ na-arụaccountant, Odee akwụkwọ, odee uri Dezie

Muhammad al-Mahdi al-Madjub (Àtụ:Lang-ar Àtụ:IPAc-en; 1919 - 3 March 1982), a na-asúpekwa dịka al-Maghut maọbu al-Majzoub, bụụrụ onye ode-uri mba Sudan ama ama. A maara ya gburugburu dịka otu n'ime na-ewu ewu n'odide uri na Sudan, ma na-ekwunyere ya na o so na ndị òdé uri mbụ nke uri Sudanese-Arabic na "Sudanism". Ntinye ya na akwụkwọ akụkọ Sudan have enweela mmetụta na-adigide n'ebe ihe gbasara odide na ọgụgụ uri nke mba ahụ.

Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Muhammad al-Mahdi al-Majdhub n'afọ 1919 na al-Damar, isi Steeti River Nile na North Sudan.[1] Nna ya bụ Sufi Sheik amaara na Sudan dịka Muhammad al-Majdhub, onye bụ ótù n'ime ndị Agbụrụ Ja’alin nke agbụrụ north-central Sudan. O nwetara ọmụmụ n'ụlọ akwụkwọ Khalwa, ebe ọ mụtara ọgụgụ, odide nakwa Qur'an. Dịka Babkier Hassan Omer si kwuo, ọkụ Khalwa (amaara dịka al-Toqaba) kwaliri mmụọ al-Majdhub ịkpọ usoro nchịkọta akwụkwọ mbụ ya o dere "The Fire of Majdhib" O dere n'ihuokwu nke akwụkwọ ahụ, “Ndi knight, ndị ọ̀ká ikpe na ndị ọpụrụiche mmadụ lere anya gburugburu ya, na-ebuli ya elu ma na-eti, N'Ebube Ya n'etiti ndị mmadụ na nnọsara-ahụ nke nchekwa, ruokwa ọtụtụ narị afọ".

Onye odee bụ ọkachamara akwụkwọ nke Sudan Abdullah Al-Tayyib (1921-2003) toro n'ụlọ al-Majdhub mgbe nna ya nwụchara . Ha abụọ eto, bụrụ ndị enyi, bụrụkwa ndị òdé uri .

Young al-Majzoub

al-Majdhub mere njem gaa Khartoum ịgụ akwụkwọ, wee debanye aha na Gordon Memorial College ma gụchaa pụta dịka onye ọ̀gụ́ ego.[2] al-Majdhub rụrụ ọrụ dịka onye ọ̀gụ́ ego na gọọmenti Sudan rụọ ọrụ n'etiti mgbago úgwú, ndịda, ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ nke mba ahụ, nke baara ya uru n'ikepụta n'ime onwe ya ọ́bá uri na ihe nchepụta ndị ọzọ,nke, na atụkwasị nke ịbụ mmadụ dị njikere mgbe niile, sụụrụ ya ụzọ imelite nkà ide uri ya.

Akwụkwọ Ọgụgụ Ndị O Dere[dezie | dezie ebe o si]

N'ọ̀gbọ́ a, enwere mbipụta gasị ndị pụtara, dịka al-Sudan, al-Nahda, na al-Fajr. N'etiti íbé niile nke al-Fajr, ndị odee dịka al-Tijani Yusuf Bashir na Muhammad Ahmad Mahjub mere ngosipụta mbụ ha .[3]

Dịka onye ọkachamara na akụkọ ihe ndị mere eme bụ Huda Fakhreddine si dee, ndị òtù Fajr nwere nghọta nke omenala gwara ọgwa si n'aka ndị nna nna rute ndị Sudan aka, nakwa ihe ndị megasịrị eme mere ka omenala ha bụrụ ọpụrụiche. Ha bu n'obi inye ọdịdị nye akara ngosi asụsụ nke ga-akọwa njirimara mba.

Huda gara n'ihu na Muhammad Ahmad Mahjub chịkọtara isiokwu nke akwụkwọ akụkọ mba Sudan "edere n'Arabic ma nwee ndịnime nke ịlụ niile nke ala anyị, ebe ọ bụ na ọ bụ nkea na-eme ka akwụkwọ akụkọ mba anyị bụrụ ọpụrụiche na ndị ọzọ." Òtù Fajr chọpụtara ngosi mbụ ya n'ọrụ nke Muhammad al-Mahdi al-Majdhub. Ọ bụzi ya bụ òdé uri mbụ nke ederede ya chere uche n'ihe banyere ịma maka ịbụ onye sonyeere ma omenala ndi "Ojii" na omenala ndị "Arab".[4]

Late al-Majzoub

Onye nkatọ Osama Taj Al-Sir kweere na "Sudanism" (maọbụ Sudanisation) pụtara ihe n'uri al-Majdhub, nke pụtara ìhè na nchepụta ya, ihe onyoonyoo na asụsụ ya, nke nwa ya nwụrụ anwụ, onye nta akụkọAwad Al-Karim al-Majdhub, onye kwuru maka nna ya, "Eleghị anya ihe gbapụrụ asụsụ al-Majdhub iche bụ ngwakọ ya - mgbe ụfọdụ - N'etiti classical na dialectal Arabic ruo ógó nke iji asụsụ dịka esi asụ ya ma na-ekwu okwu wee kụnye ya n'ime akụrụ nke uri ya.[5][6] Osama Taj Al-Sir, Ọkammụta nke Akwụkwọ akụkọ na University of Khartoum|Mahadum Khartoum gwara Al-Jazeera Net na "al-Majdhub gosipụtara ndụ Sudan n'uri, wee bụrụ otú onye na ndị mbụ gwakọrọ ndị dị ike okwu na ndi nkịtị, ọrụ Sudan nye ya na-anọchi anya usoro omume ihe nwere ụdịdị gbapụrụ iche. " [4][6]

Al-Siddiq Omar Al-Siddiq, na-agba akaebe na ndị Sudanism abụghị naanị ihe a ma ama nke al-Majdhub, na ihe osise uri bụ otu n'ime ha doro anya. Al-Majzoub bụ ihe okike n'ise foto na nkwuwa okwu n'ise ha, na "oke ike" a ejedebeghị na foto naanị. [7][6]

Otu n'ime njirimara uri al-Majdhub kacha baa uru bụ mmasị o nwere n'ebe nwoke ahụ dikasrịsịrị ala n'ámá, dịka Osama Taj Al-Sir kwenyere na Al-Majzoub: "bugara odide-uri - n'asụsụ dikasrịsịrị n'ụdị uri nwekwaa ihe ngosipụta n'ebe ọ dị elu - site n'ihe ndị bụ isiokwu na ndụ ruokwa na ndị nta ya (asụsụ, mmekọrịta, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị). O dere maka ndị nwere ụlọ azụmahịa ebe a na-ete kọfị, ndị na-eji chárá ndị mmadụ akpụkpọ ụkwụ, ndị na-eme aka ntụtụ, ndị na-ere àgwà, ndị na-ere shard, ndị na-arịọ arịrịọ, dgz." al-Majdhub kwuputara mkpatara ndị ahụ na nkọwa nke Nar al-Majdhub: "I have benefited a lot from mingling with people, especially the poor, for they have a striking sincerity that has benefited me and cured me".[7][6]

al-Majdhub authored a number of other books and collections.[8] He also participated in the magazines, e.g., The Nile, Hana Omdurman, Youth and Sports, and other Sudanese magazines. In Arabic, Dar Al-Hilal, Al-Doha, and the Beirut magazine Al-Adab were publishing his work. He has several radio interviews, the most prominent of which are his interviews with Sudanese radio and television, Voice of the Arabs, Voice of America, German, Egyptian and Tunisian radio.Àtụ:Quote box

Akwụkwọ Uri na Akwụkwọ Ndị Ọzọ O Dere[dezie | dezie ebe o si]

  1. Diwan Fire of al-Majazib (Àtụ:Lang-ar), 1969[9][10]
  2. Diwan Honor and Immigration (Àtụ:Lang-ar), 1973
  3. Lengthy Good News, Crows, Exodus (Àtụ:Lang-ar), 1975
  4. Diwan Manabir (Àtụ:Lang-ar), 1982
  5. Diwan Of Those Things (Àtụ:Lang-ar), 1982
  6. A Beggar in Khartoum (Àtụ:Lang-ar), 1984 (poetry play)
  7. Diwan Cruelty in Milk (Àtụ:Lang-ar), 2005
  8. Diwan Sounds and Smoke (Àtụ:Lang-ar), 2005
  9. Diwan Raid and Sunset (Àtụ:Lang-ar), 2013

Ndụ Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ya[dezie | dezie ebe o si]

al-Majdhub ya na Mahmoud Muhammad Taha guzobere Republican Brotherhood na Sudan n'afọ 1945.[11] Òtù Republican Brotherhood tinyere aka n’ọgụ maka nnwere onwe megide Ọchịchị Briten-Ijipt . al-Majdhub nwere uri na-eto ọkwá nke Republican Party na Mahmoud Muhammad Taha.[12]

al-Majdhub nwụrụ na 3 Maachị 1982 na Omdurman, Sudan.[7]

Ihe Ncheta Ya[dezie | dezie ebe o si]

al-Majdhub enwetawo nkwanye ùgwù na akụkọ ihe mere eme nke akwụkwọ Sudan dị ka onye na-eme ihe n'ịkwalite uri Sudan. A na-ekwu na ọ bụ onye tọrọ ntọala otu uri dị ịrịba ama, ya na onye ikwu ya Abdalla al Tayeb, bụ́ nke webatara ụzọ ọhụrụ e si emepụta uri, na-apụ n'ụdị uri na ozizi ọdịnala na nke siri ike.[2] Ụlọ akwụkwọ uri ọhụrụ a nakweere ụdị na-adịghị ejide onwe ya na nnwere onwe, kwekọrọ na omume nke ndị na-ede uri nke oge a.[3]

Ịgụrụ Gawa[dezie | dezie ebe o si]

Fakhreddine, Huda J. (2021-03-31), "Muhammad al-Maghut and Poetic Detachment", The Arabic Prose Poem, Edinburgh University Press, pp. 107–137, doi:10.3366/edinburgh/9781474474962.003.0005, ISBN 9781474474962, retrieved 2023-05-21

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. رابطة أدباء الشام - أشعار المبدع الراحل محمد المهدي المجذوب.
  2. 2.0 2.1 Selected Poem: The Deluge (Mohamed al- Mahdi al- Majzoub)| Sudanow Magazine. Archived from the original on 2023-05-21. Retrieved on 2023-12-06.
  3. 3.0 3.1 (2013) Historical Dictionary of the Sudan (in en). Rowman & Littlefield, 265. ISBN 978-0-8108-6180-0. 
  4. 4.0 4.1 Fakhreddine, Huda J. (2021-03-31), "Muhammad al-Maghut and Poetic Detachment", The Arabic Prose Poem, Edinburgh University Press, pp. 107–137, doi:10.3366/edinburgh/9781474474962.003.0005, ISBN 9781474474962, retrieved 2023-05-21
  5. Abusabib, Mohamed (March 2001). "Back to Mangu Zambiri: Art, Politics and Identity in Northern Sudan" (in en). New Political Science 23 (1): 89–111. DOI:10.1080/07393140120030359. ISSN 0739-3148. 
  6. 6.0 6.1 6.2 6.3 'Abdul-Hai, Muhammad (1976). "Conflict and Identity : The Cultural Poetics of Contemporary Sudanese Poetry". Présence Africaine 99-100 (99/100): 60–81. DOI:10.3917/presa.099.0060. ISSN 0032-7638. 
  7. 7.0 7.1 7.2 Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named :2
  8. المجذوب يضرب صدره علي وطن زائف (ar) (2022-03-03).
  9. المجذوب, محمد المهدي. ديوان محمد المهدي المجذوب (ar).
  10. Muhammad al-Mahdi al-Majthub – Sudanese Literature (en-US) (2020-04-16).
  11. Thomas, Edward. [https:// books.google.com/books?id=HeqKDwAAQBAJ&dq=%22Muhammad+al-Mahdi+al-Majdhub%22&pg=PP1 Onye ọbịa zuru oke nke Islam: Ndụ Mahmud Muhammad Taha, Onye Mgbanwe Muslim nke Sudan] (in en). Bloomsbury Publishing. ISBN 978-1-78673-496-9. 
  12. Thomas, Edward. =%22Muhammad+al-Mahdi+al-Majdhub%22+-wikipedia&pg=PA278 Onye ọbịa zuru oke Islam: Ndụ nke Mahmud Muhammad Taha, Muslim Reformer of Sudan. ISBN 978-1-78673-496-9. 

Njikọ Mpụga[dezie | dezie ebe o si]