Muyiwa Ademola

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Muyiwa Ademola
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Jenụwarị 1971 Dezie
Ebe ọmụmụAbeokuta Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, onye nhazi ndu ihe nkiri, onye nhazi ederede Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1991 Dezie

Muyiwa Ademola (a mụrụ na 26 Jenụwarị 1971) bụ onye na-eme ihe nkiri, onye na-emepụta ihe nkiri na onye nduzi.[1] N'afọ 2005, ihe nkiri ya bụ ORI (Fate) nwetara mmeri ihe nkiri kacha mma na 1st Africa Movie Academy Awards. N'afọ 2008, a họpụtara ya maka 4th Africa Movie Academy Awards for Most Outstanding Indigenous Actor .[2][3][4]

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na 26 Jenụwarị afọ 1971 na Abeokuta, isi obodo Ogun Steeti ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa.[5] Ọ gara St. David's High School dị a Molete na Ibadan ebe ọ nwetara asambodo West Africa Secondary School.[6] O mechara gaa Mahadum nke Ibadan ebe o nwetara nzere bachelọ nke agụmakwụkwọ na agụmakwụkwọ ndị okenye[7]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ sonyeere ụlọ ọrụ ihe nkiri Naịjirịa site n'aka Charles Olumo, onye a maara dịka Agbako onye bi n'obodo ya, Abeokuta.[8] O mechara zute onye nduzi ihe nkiri a na-akpọ S.I Ola onye kụziiri ya ka e si eme ihe nkiri na mmepụta ihe nkiri.[9] Ọ malitere ọrụ ihe nkiri ya n'ụzọ zuru ezu n'afọ 1991. N'afọ 1995, o mepụtara edemede mbụ ya n'ime ihe nkiri akpọrọ Asise nke pụtara BLUNDER na Bekee. Ọ bụ Dibel kwadoro mmepụta ahụ bụ onye na-ahụ maka ihe gbasara ịmepụta set. Kemgbe afọ 1995, ọ mepụtara, duzie ma gosipụta na ọtụtụ ihe nkiri Yoruba Nollywood.[10] N'ọnwa Jenụwarị afọ 2013, a kọrọ na o nwere ihe mberede na-egbu egbu, nke fọrọ nke nta ka ọ nwụọ.[11]

Ihe nkiri a họọrọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Asise (1995)
  • Ogo Osupa
  • Ori (2004)
  • Ile
  • Alapadupe
  • Ami Ayo
  • Fimidara Ire
  • Gbarada (2019)
  • Iranse Aje
  • "J J

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • 4th Africa Movie Academy Awards
  • Ndepụta nke ndị Yoruba
  • Ndepụta nke ndị na-eme ihe nkiri Naịjirịa

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Our Reporter. Few know I’m a Prince –Muyiwa Ademola. Retrieved on 3 January 2015.
  2. TOP NIGERIAN ACTRESSES BATTLE FOR AMAA 2008 AWARDS. thenigerianvoice.com. Retrieved on 3 January 2015.
  3. African Movie Academy Awards - 2008 - Winners & Nominees. Retrieved on 3 January 2015.
  4. Yoruba actress Mulikat Adegbola is dead (en-US). Vanguard News (2016-12-03). Retrieved on 2022-02-26.
  5. Tolu. Actor, Muyiwa Ademola Shares Photos Of His Lovely Wife And Kids. INFORMATION NIGERIA. Retrieved on 3 January 2015.
  6. Actor Muyiwa Ademola Confirms Accidents Story to Nigeriafilms.com - nigeriafilms.com. Archived from the original on 3 January 2015. Retrieved on 3 January 2015.
  7. Muyiwa Ademola is a close friend, not my lover — Sexy Winger - Vanguard News. Vanguard News. Retrieved on 3 January 2015.
  8. Popular Actor, Muyiwa Ademola Loses Dad. thenigerianvoice.com. Retrieved on 3 January 2015.
  9. Check Out Yinka Ayefele, Femi Adebayo, Muyiwa Ademola And Other At Ale Erebe In Ibadan - NEWSCRIB.NET. NEWSCRIB.NET. Archived from the original on 3 January 2015. Retrieved on 3 January 2015.
  10. Archived copy. Archived from the original on 3 January 2015. Retrieved on 3 January 2015.
  11. More sad news in Nollywood: Actor Muyiwa Ademola involved in fatal accident. DailyPost Nigeria. Retrieved on 3 January 2015.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]