Nadia Davy

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nadia Davy
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịJamaikạ Dezie
obodo maka egwuregwuJamaikạ Dezie
Aha enyereNadia Dezie
aha ezinụlọ yaDavy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Disemba 1980 Dezie
Ebe ọmụmụJamaikạ Dezie
Ọrụ ọ na-arụsprinter Dezie
ebe agụmakwụkwọBridgeton High School Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpi400 metres Dezie
so na2004 Summer Olympics Dezie

  Nadia Davy (amụrụ na 24 Disemba 1980) bụ onye na-agba ọsọ na Jamaica American, na-asọ mpi mba ụwa maka Jamaica. Ọ bụ Onye nwetara ọla nchara na 4 x 400 mita relay n'afọ 2004 egwuregwu ịgba ọsọ Olympic na Athens, Gris.

Ndụ ya na Mbido[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Davy na Jamaica mana o toro na Bridgeton, New Jersey. [1] Ọ gụpuru akwụkwọ na Bridgeton High School, ebe ọ gbara ọsọ, na 1999. [2] Ọ tinyere ihe ndekọ Bridgeton High School na mita 400 na oge nke 54.04 sekọnd. O nwetara utu aha na steeti isii n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị, gụnyere ndị egwu ọgbụgba ọsọ na 1999 n'ime ụlọ na ezi na asọmpi 400 mita.

Kọleji[dezie | dezie ebe o si]

Davy gara Mahadum Steeti Louisiana iji gbaa ọsọ mgbe ọ gụchara akwụkwọ sekọndrị. Ọ bụ onye nke asaa nke America niile na LSU ma ugbu a o ji ihe ndekọ

ụlọ akwụkwọ [3] na mita 400 nke ụmụ nwanyị na oge nke 50.66 sekọnd, nke otinyereụ na 2003 na obere afọ ya. [4]

Davy ruru eru ịgba maka [5] egwuregwu Olympic nke Jamaica n'afọ 2004 mgbe ọ nwetara ọkwa mbụ na mita 400 (50.76 sekọnd) na asọmpi JAAA / Supreme Ventures National Senior na Kingston, Jamaica.

Olimpik[dezie | dezie ebe o si]

Davy gbara ọsọ ihe omume abụọ na Atens, 400 mita nke ofu onye na 4x400 mita relay. Na mita nke 400, ọ gbara ọsọ nke 52.04 sekọnd ma ọ bụghị ebe.

O riri ọla nchara maka 4 x 400 mita relay (3:22:00). Davy nyere oge nke 50.24sekọnd n'oge ọgbụgba ọsọ nke atọ.

Taa[dezie | dezie ebe o si]

Davy [6] ebighị zi na Bridgeton, New Jersey ebe ọ rụrụ ọrụ na ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya dị ka onye enyemaka na onye enyemaka onye nkuzi ịgba oso. O nwere nwa nwoke na nwa nwanyị. O nwekwara nzere masta ya na ndụmọdụ na Mahadum Wilmington dị na Delaware.

Ebe'm Si De[dezie | dezie ebe o si]

  1. Brown, Scott. "Bridgeton's Davy Runs Wild At States The Jamaica Native Set Records In The 200 And 400. Her Coach Thinks She Will Only Improve.", The Philadelphia Inquirer, 1 June 1998. Accessed 21 December 2014. "That's because Bridgeton's Nadia Davy eclipsed their times in the 200 and 400 to set both records."
  2. Olympic medalist Nadia Davy sets example for young Bridgeton track and field team. Press of Atlantic City. Retrieved on 2016-02-02.
  3. Women's Indoor Track Earns Henry's 24th National Title. LSUsports.net. Archived from the original on 2018-10-13. Retrieved on 2016-02-04.
  4. Track & Field and Cross Country Statistics. Athletic.net. Retrieved on 2016-02-04.
  5. IAAF: Powell powers to 9.91 – Jamaican Championships. iaaf.org. Retrieved on 2016-02-04.
  6. Olympic medalist Nadia Davy sets example for young Bridgeton track and field team. Press of Atlantic City. Retrieved on 2016-02-02.