Nadia Makram Ebeid

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nadia Makram Ebeid
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereNadia Dezie
Ọkwá o jiMinister of the Environment Dezie

Nadia Makram Ebeid (Arabic) bụ onye agụmakwụkwọ Ijipt nke jere ozi dị ka minista nke steeti maka gburugburu ebe obibi, bụrụ nwanyị Ijipt mbụ jere ozi n'ọ́kwa ahụ.[1]

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Ebeid si n'ezinụlọ Coptic nke malitere na Qena ebe nwanne nna ya bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Makram Ebeid.[2] Nwa nwanne nna ya bụ Mona Makram-Ebeid.[3]

Ebeid nwetara nzere masta nke nka na Mahadum America nke dị na Cairo n'afọ 1977.[1] A họpụtara ya ka ọ bụrụ minista na-ahụ maka gburugburu ebe obibi na Julaị afọ 1997 na mgbanwe nke ndị isi ọchịchị, nke Praịm Minista Kamal Ganzouri mere.[4] E guzobere isi ụlọ ọrụ ahụ ọhụrụ, Ebeid bụrụkwa minista mbụ nke gburugburu ebe obibi nke Ijipt.[4] Ọ nọgidere na-eje ozi n'ọfịs ahụ ruo n'afọ 2002.[5] Mgbe ọ nọ n'ọchịchị, ọ rụkwara ọrụ dị ka osote onye isi oche nke ụlọ ọrụ Council of Arab Ministers Responsible for the Environment (CAMRE) na nke ndị nlekọta nke Centre for Environment and Development for the Arab Region and Europe (CEDARE).[5] N'agbata afọ 2002 na afọ 2003 ọ bụ onye nnọchi anya udo pụrụ iche nke Arab League na Sudan.[1] Ọ bụ ọkà mmụta nleta na Mahadum George Washington, USA.[5] Ka ọ na-erule afọ 2016 ọ bụrụla onye isi nchịkwa nke CEDARE.[5]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 "Voice of the People", AUC Today, 26 May 2019. Retrieved on 17 December 2021.
  2. اعلام قنا: نادية مكرم عبيد (ar). qena.gov.eg.
  3. مكرم عبيد الزعيم الذي انقلب على نفسه (ar). Al Jazeera (7 March 2019).
  4. 4.0 4.1 Bahaa Elkoussy. "Egypt reshuffles Cabinet", UPI, 8 July 1997. Retrieved on 17 December 2021.
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 H.E. Dr. Nadia Makram Ebeid. UNEP (2016). Archived from the original on 6 March 2021. Retrieved on 17 December 2021.