Nadia Mukami

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nadia Mukami
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereNadia Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya9 Novemba 1996 Dezie
Ebe ọmụmụNairobi Dezie
Ọrụ ọ na-arụsinger-songwriter Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2017 Dezie

Nadia Mukami (a mụrụ n'ụbọchị nke 9 n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1996) bụ onye Kenya na-agụ egwu na onye na-ede egwu nke a maara amara maka egwu ya "Si Rahisi", na "Radio Love", nke gosipụtara Arrow Bwoy.[1] O wepụtara EP mbụ ya, African Popstar, n'ọnwa Ọktoba afọ 2020.[2][3]Ọ bụ onye guzobere akara ndekọ Kenya "Sevens Creative Hub".[4]

Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nadia Mukami n'ụlọ ọgwụ Pumwani na Nairobi, Kenya na mkpụrụ ụbọchị 9 n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1996.[5] Ọ gara Kari Mwailu Praịmarị ebe ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị ya n'afọ 2009. E mechara nabata ya na Mount Laverna School na Kasarani, Nairobi .[6] O mechara sonye na Mahadum Maseno wee nweta nzere na BBA Finance option.[7]

Ọrụ egwu[dezie | dezie ebe o si]

Nadia dere ma dekọọ egwu mbụ ya bụ Barua Ya Siri n'afọ 2015. Egwu ya nke abụọ bụ Kesi bụ oge mgbanwe ya, ọ nwetara ewum ewu ma bụrụ ihe egwu nke oge ahụ. O mere ka o nwee ohere iji mee ihe nkiri na ohere Kenya dị iche iche dịka Blaze The Nile Festival, The Luo Festival wdg.[8]

Nadia wepụtara egwu "Radio Love" nke gosipụtara Arrow Bwoy n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2019. Abụ ahụ bụ ọganihu ya. Ọ nwetara nnukwu nlebara anya site na mgbasa ozi Kenya ma kpọọ ya n'ọtụtụ ụlọ ọrụ redio na TV na mpaghara ahụ.[9]

N'afọ 2019, Nadia kewara ụzọ ya na njikwa ya "Hailemind Entertainment".[10][11] N'otu afọ ahụ 2019, egwu ya "Radio Love" meriri ihe nrite abụọ na Pulse Music Video Awards (PMVA).[1] N'afọ 2019, o so na ndị na-ese ihe na-anọchite anya Kenya na Coke Studio Afrịka.[12]

Ná mmalite afọ 2020, Nadia wepụtara "Nitekenye" nke gosipụtara otu egwu Gengetone nke Kenya "Sailors".[13]

E mechara wepụta EP mbụ nke Nadia na Ọktoba 2020. E wepụtara egwu "Jipe" nke gosipụtara onye na-agụ egwu Tanzania bụ Marioo na Machị 2020.[14] EP gosipụtara Khaligraph Jones, Maua Sama, Fena Gitu, DJ Joe Mfalme, Sanaipei Tande, Orezi nke Nigeria, Tamy Moyo nke Zimbabwe na Lioness Nam si Namibia.[2] A họpụtakwara ya maka onyinye HiPipo na 2020.[15]

N'afọ 2021, a họpụtara ya nke mbụ ya na MTV Africa Music Awards (MAMA).[16][17]

  1. 1.0 1.1 Biography: Nadia Mukami (en-US). Pulse Live Kenya (9 February 2021). Retrieved on 3 April 2021. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 Kavii. Songbird Nadia Mukami set to release new EP dubbed 'African Popstar' (en). Standard Entertainment and Lifestyle. Retrieved on 3 April 2021. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  3. Ngigi. Nadia Mukami releases 'African Popstar' EP (en-KE). The Star. Retrieved on 3 April 2021.
  4. Milimo (2022-01-20). Nadia Mukami set to introduce first artiste under own record label (en). Pulselive Kenya. Retrieved on 2022-04-27.
  5. Nadia Mukami Biography. hashtagsquare.co.ke. Archived from the original on 1 March 2021.
  6. Nadia Mukami biography: Everything you need to know of the popular musician (20 July 2020).
  7. Milimo (2021-02-09). Biography: Nadia Mukami (en). Pulselive Kenya. Retrieved on 2021-11-18.
  8. Thomas (2020-04-29). Nadia Mukami Biography - Age, Education, Boyfriend, Family Net Worth (en-GB). The East African Feed. Retrieved on 2021-11-18.
  9. Osoro. Nadia Mukami answers the internet's most asked questions about her. Nadia Mukami answers the internet's most asked questions about her. Retrieved on 3 April 2021.
  10. Fast-rising artiste Nadia Mukami parts ways with her Management (en-US). Pulse Live Kenya (20 March 2019). Retrieved on 3 April 2021.
  11. Mwarua (18 March 2019). Sensational Kenyan songstress Nadia Mukami parts ways with management (en). Tuko.co.ke – Kenya news.. Retrieved on 3 April 2021.
  12. Milimo (2021-02-09). Biography: Nadia Mukami (en). Pulselive Kenya. Retrieved on 2021-11-18.
  13. Nadia Mukami – NRG.RADIO (en-US). Retrieved on 3 April 2021.
  14. Kingsley (19 March 2020). Nadia Mukami enlists Tanzania's Marioo on 'Jipe' (Video) (en-US). Ghafla! Kenya. Retrieved on 3 April 2021.
  15. Musyimi. Nadia Mukami nominated for HiPipo awards (en-KE). The Star. Retrieved on 3 April 2021.
  16. Nadia Mukami to battle Diamond, Fally Ipupa & Wizkid at MTV Africa Music Awards (en-US). Pulse Live Kenya (13 January 2021). Retrieved on 3 April 2021.
  17. Nzyoka (14 January 2021). Nadia Mukami gets nomination from MAMAs 2021 (en-US). KBC | Kenya's Watching. Retrieved on 3 April 2021.