Nadine Ramaroson

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Nwa nwanyị nke André Ramaroson na Odette Andriatsalama, a mụrụ ya Nadine Laura Eugénie Charlotte Ramarosons na Maisons-Alfort, France.

Ọ gụrụ akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ elementrị Saint Joseph de Cluny, na ụlọ akwụkwọ sekọndrị St. Antoine na Andravoahangy, na Lycée Français de Tananarive na École des Roches na France. Ọ gara n'ihu na agụmakwụkwọ ya na Glion Institute of Higher Education na Switzerland. Ọ rụrụ ọrụ na ụlọ oriri na mkwari dị na Geneva, na azụmaahịa ezinụlọ Savonnerie tropicale ma mesịa malite ụlọ ọrụ mbubata na mbupụ nke ya Madisco.[1]

Mmiri riri ya n'oké osimiri dị nso na Soanierana Ivongo mgbe ọ na-alọta site na mmemme na Île Sainte-Marie.[2] O doro anya na nnukwu ebili mmiri tụgharịrị ụgbọ mmiri ahụ ma ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere Ramaroson nwụrụ na oke ihe mbelede nke ahu. Akụkọ koro na ihe ntiwa gbochiri mgbalị nnapụta ,ma kpatakwa oke ọnwụ ndị ọzọ.[3]

  1. "FAHAFATESAN’I NADINE RAMAROSON", Ino Vaovao, February 12, 2017. (in Malagasy)
  2. "Mort accidentelle de Nadine Ramaroson, figure du gouvernement à Madagascar", Radio France Internationale, August 29, 2011. (in fr)
  3. "Décès brutal de Nadine Ramaroson", Madagascar Tribune, August 29, 2011. (in fr)