Naeto C

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Naeto C
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha pseudonymNaeto C Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya17 Disemba 1982 Dezie
Ebe ọmụmụHouston, Texas Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Dundee, Atlantic Hall Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2006 Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
ụdịegwu hip hop Dezie

Naetochukwu Chikwe, aha ọgbọ ya Naeto C, bụ onye egwu Naịjirịa, Afurobiiti onye mmepụta egwu. A mụrụ ya na Houston, Texas ma bụrụkwa onye ala Naịjirịa. [1] Gọvanọ Imo Steeti, Emeka Ihedioha họpụtara Naeto C, dị ka onye enyemaka pụrụ iche na njikọta Legọọsụ. [2]

Agụm akwụkwọ mahadum[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ sekọndịrị na Legọọsụ, ọ kwagara United Steeti maka agụmakwụkwọ ka elu na SUNY Old Westbury otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gaa na Mahadum George Washington . Ọ bụ n’oge ahụ ka o zutere Uzikwendụ na Ikechukwu, ndị chọrọ ị dị na-eti egwu hipu-họpụ na Washington Heights, New York. Ha atọ gara n'ihu hibe World Famous Akademy, ụmụnna egwu. Ha zubere ịmalite ndekọ egwu nke ha mana ha enweghị ego a ga-eji kwado ya. Naeto C gụsịrị akwụkwọ na 2004 na Mahadum George Washington ebe ọ nwetara asambodo BSc ya na Bayọlọjị. Ọ na-ezube ịga ọmụmụ ka o bụrụ dọkịta. Mgbe o nyochasịrị onwe ya nke ọma ọ gbanwere obi ya wee kpebie ịchụso nrọ ya were zụlite ikike ya dị ka onye egwu.

Na 2010 Naeto gbasoro MSc na "Energy Studies" na Mahadum Dundee dị na Scotland. [3]

Nne ya gwara ya na oge ọkọchị nke afọ 2013 na ọ na-aga mahadum nke Oxford dị na England ịgụ ihe ọmụmụ nke "Energy Economics" mana enweghị nkọwapụta ọ bụla na nke a. [4]

Na Nọvamba 17, 2020, Naeto C gụsịrị akwụkwọ Master nke Sayensị na "Energy Economics" na Mahadum nke Dundee, Scotland. [5]

Ọrụ egwu[dezie | dezie ebe o si]

Storm Records, (ụlọ ọrụ ndekọ egwu na Legọọsụ, Naịjirịa) nọ na-anwa ịkpọrọ ndị World Akademy ama ama, n'ihi na Naeto kpebiri ịchuso ọrụ ya dị ka onye na-eti egwu, o soro ndị otu ya na WFA were kwenye . Mana ha alaghachighị Naịjirịa rue mbido 2006, mgbe Ikechukwu wepụtara abọm izizi ya bụ Son Of the Soil . Abọm ahụ nyere Naeto C na WFA ezi ntọala.ịrụ ọrụ dị ka onye mmepụta egwu n'ụlọ nke ya na ndị mmepụta egwu ọhụrụ otu ya "ET-Quake" (nke gụnyere TY Mix na VC Perez), Naeto gosipụtara nka ọrụ mmepụta egwu mgbe ya na ndị egwu Storm na-arụ ọrụ

ọrụ dịka Sasha, Dare Art-Alade, GT the GuitarDisconnectKwupu, Saro-Wiwa na Nkiru. N’ime otu afọ ya na ndị nka a kpọtụrụ aha na mbụ rụkọtara ọrụ, Naeto dekọtara ihe karịrị egwu 60 nke ọma gụnabọm egwu ya kachasị ọhụrụ (ọtụtụ nke ya na ET-Quake mepụtara).

Mmepụta egwu ya pụtara ìhè bụ egwu "I believe" Naeto dere ma ya na VC Perez (onye otu ET-Quake) mepụtara ya, nke gosipụtara onwe ya, onye ọrụ R & B / Gospel ka na-etolite, Sheun na Hugh Masekela si South Afrịka . N'ime otu afọ ahụ, Naeto nwetara ọtụtụ ahụmịhe na ọrụ ya, site na mwepụta album nke Ikechukwu ruo na onyinye Chanel O na nke njem egwu ya "I believe" na kwa njem egwu Promo nke ya na Sasha na ọtụtụ egwu ndị ọzọ, na nkwadebe maka ngosi egwu MTN dị egwu, nke otu enyi ya ama ama bụ D'banj.  "Naeto C" edeela ihe karịrị egwu 50 maka mmalite mmepụta egwu nke banyere na uda egwu hipu họpụ taa nke MO HIT RECORD, Mee 2008 Site na egwu Fela "Lagos City Hustla" kachasị akọwapụta Hipụ-Họpụ / Afuro Biiti- rue taa nke ndị south-melody bụ“Siting on Top”, Naeto C agbaalaala oke nile ma karịa ndị na-eti egwu ọhụrụ, dịka Mo Hit siri kwue. Abọm mbụ ya pụtara na Mee 2008. Na 2018 Ego Naeto C ga abụ ebe nde $7.5. A gụnyere ya na ndị egwu kachasị jide ego na Naịjirịa. [6]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Naeto C luru Nicole Chikwe ma nwee ụmụ atọ. [7]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • 2008: U Know My "P"
  • 2011: Super C Season
  • 2015: Day 1[8]
  • 2015: Festival

Onyinye na nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

Mmeri[dezie | dezie ebe o si]

  • MTV Africa Music Awards 2008 - Ọkachasị onye ọhụrụ na-eti egwu
  • 2009 Channel O Music Video Awards - Vidiyo nke Afọ
  • MTV Africa Music Awards 2009 - Ọkachasị eti egwu

Họpụtara[dezie | dezie ebe o si]

  • 2012 The Headies – Ọkachasị eti egwu
  • 2012 The Headies – Abọm nke afọ (Super C Season)

mpụga[dezie | dezie ebe o si]