Nana Klutse

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nana Ama Browne Klutse
Nana Ama Browne Klutse in her office at the University of Ghana
Born23 May 1981
NationalityGhanaian
OccupationClimate scientist
EmployerUniversity of Ghana
Known forChapter Atlas - IPCC Sixth Assessment Report

A mụrụ

Nana Ama Browne Klutse na ka ọnwa Mee dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na atọ n'afọ 1981 na Nyanfeku Ekroful . Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na Anomabo Methodist Primary nakwa JHS.[1]

Ọ gara n'ihu n' ụlọ akwụkwọ sekọndrị Mfantsiman Girls ma mecha gaa Mahadum Cape Coast na Ghana ị gụ ma nweta nzere BSc na Physics. Ọ gara n'ihu ma nweta nzere Ph.D. ya na Climatology na Mahadum Cape Town na South Africa.

Ọrụ sayensị[dezie | dezie ebe o si]

Dr Klutse na-amụ banyere ọnọdụ ihu igwe nke West Africa. Ọrụ ya na-elekwasị anya n'ihe gbasara sayensị ihu igwe tụmadị mmiri ozuzo nke Afrịka.[2][3] Ọ bụ onye nkuzi dị elu na Ngalaba Physics, na Mahadum Ghana.[4] N'oge gara aga, ọ na-elekọta ngalaba a kpọrọ Remote Sensing and Climate Centre.[5] Klutse bụ onye na-ahụ maka sayensị ihu igwe nke African Institute for Mathematical Sciences[6] nakwa onye isi odee naenyere aka edepụta nke akpọrọ IPCC Sixth Assessment Report (AR6). Ọ na-agbakwa ụmụaka ndị nwaanyị nọ na Ghana ume ka ha tụlee ọrụ sayensị ma na-akwado mmelite na agụmakwụkwọ sayensị na mba ahụ.[7]

Klutse rụrụ ọrụ nụlọ ọrụ a kpọrọ Ghana Space Science and Technology Institute nke Ghana Atomic Energy Commission dị ka onye isi nchọpụta sayensị site n'afọ 2016 ruo 2018. Tupu nke a, ọ bụ onye nkuzi ọbịa na West African Science Service Centre on Climate and Adapted Land Use (WASCAL) na Akure, Nigeria.[8]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Klutse na-arụkwa ọrụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ka onye otu National Democratic Congress.

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Ghana's Dr. Nana Ama Browne Klutse among lead authors for 6th climate change report (en-US). Citinewsroom - Comprehensive News in Ghana (2021-08-18). Retrieved on 2021-08-20.
  2. Klutse, NAB et al. (2016). Daily characteristics of West African summer monsoon precipitation in CORDEX simulations. Theoretical and Applied Climatology, 123(1-2): 369-86.
  3. Klutse NAB et al (2018). Potential impact of 1.5 °C and 2 °C global warming on consecutive dry and wet days over West Africa. Environmental Letters, 13(5). https://doi.org/10.1088/1748-9326/aab37b
  4. Donkor. "Dr Nana Ama Browne Klutse joins NDC Abura Asebu Kwamankese race", Graphic Online, 26 July 2019. Retrieved on 8 January 2021.
  5. Nana Ama Browne Klutse: Ghanaian scientist studies dynamics of west African monsoon. Future Climate for Africa (21 December 2016). Retrieved on 8 January 2021.
  6. AIMS announces first cohort of women in Climate Change Science Fellows (2018-05-15).
  7. Ampofo (26 February 2018). Mfantseman: Science teachers trained in effective teaching methods. Citi 97.3 FM News. Retrieved on 3 April 2020.
  8. Donkor. "Dr Nana Ama Browne Klutse joins NDC Abura Asebu Kwamankese race", Graphic Online, 26 July 2019. Retrieved on 3 April 2020. (in en)