Natasha Akpoti

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Natasha Akpoti
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereNatasha Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1979 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Abuja, University of Dundee Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịSocial Democratic Party Dezie

Natasha Hadiza Akpoti ( amuru n'afọ 1979) [1] bu onye okaiwu Naijiria, onye elekọta mmadụ ọchunta ego na onye ndoro-ndoro ochichi. Ọ zọrọ oche nke Etiti Kogi Sinetorịa Distrikti (SDP) n'okpuru Otu Igwe Mmadụ Onye Kwuo Uche ya n'afọ 2019. [2] [3] [4] [5] Ọ gbara aka na ntuliaka gọvanọ steeti Kogi nke mere na abalị 16 nke ọnwa Nọvemba 2019. [6] Ọ bụ onye chọpụtara Builders Hub Impact Investment Program (BHIIP). [7]

Mbido Ndụ na Agụ m Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Natasha, nwa nke abụọ n'ime ụmụ anọ, na otu nwa nwanyi nke nna Naijiria na nne onye Ukraine. Nne ya, Ludmila Kravchenk, bụ onye Ukraine si na Rakitna di na mpaghara Chernivtsi. Nna ya, Dr. Jimoh Abdul Akpoti, bu onye Obeiba-Ihima, dI na Kogi Steeti. Ọ nọrọ n'afọ ndị mbụ ya na Ihima, Okene Ọchịchị Ime Obodo [8] Nna ya nwụnahụrụ ya n'afọ 1998 ya mere ezinaụlọ ahụ ji kwaga ebe ọzọ. [9] Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Abuja bido na 2000 ruo 2004 wee gụchaa were bachelọ nke iwu pụta. Akpọrọ ya oku ka onye ọka iwu Naijiria na 2005 ka ọ gụsịrị akwụkwọ na Ụlọ Akwụkwọ Ọkàiwu Naijiria dị na Abuja. Na 2011, ọ gara n'ihu ị ga Mahadum Dundee wee gụchaa jide ogo na Ndi Ịsị Iwu n'afo 2012. O jide Nnaukwu Nke Azụmahịa Nchịkwa na Njikwa Mmanụ na Gas na Mahadum Dundee. [10]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Ụlọ Akwụkwọ Ọkàiwu Naijiria, ọ rụrụ ọrụ na Ọla Kọpa NLG dị ka onye ndụmọdụ n'ihe gbasara iwu site na 2007 ruo 2010. Na 2015, o guzobere Builders Hub Impact Investment Program (BHIIP). [11]Ọ bịara bụrụ onye a ma ama na mba ka o nyechara akụkọ nyocha na Ọgbakọ Mbana 1 Maachị 2018 maka ọrụ rụrụ arụ gbasara igwe igwe Ajaokuta. [12] Akụkọ ahụ kọwapụtara na ego gọọmenti n'efu ugboro ugboro ya na nbibi nke ego kemgbe mbụ e wuru igwe igwe a ka dịgidere n'agbanyeghị mbọ niile ka ọ na-agba ọsọ. Mịnịstrị na-ahụ maka mpụta na nchara nchara nke Gọọmenti Etiti kwugidere akụkọ a na ebo Akpoti ebubo na ọ kpachaara anya na-akọwa hie ndị ụlọ nnọchiteanya . Otu ndị na-ere nchara n'obere boro Akpoti ebubo na-eme mkpọsa nkwado iji mebie ọchịchị na ime ka ụfọdụ ọdịmma ụlọ ọrụ baa ọgaranya. [13] Ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja nyere iwu ka onye na-ebipụta akwụkwọ akụkọ Ikike, Ifeanyi Uba na Williams Orji kwụọ Natasha Akpoti ego pụtara nde naira iri maka akwụkwọ nkwutọ ha bipụtara imegide ya. [14]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2018, o kwuputara ebumnuche ya ịzọ ọkwa Sinetọ na-anọchite anya Etiti Kogi na Sinetị Naijiria n'okpuru nche anwụ nke Social Democratic Party (SDP).

Ndụ onwe onye[dezie | dezie ebe o si]

Natasha Akpoti bu onye Okehi dị na Kogi steeti . Ọ bu onye Ebiraland . [15] Ọ bụ nne ụmụaka atọ. [16]

  1. Obahopo (29 December 2018). KOGI CENTRAL 2019: Barr Natasha Akpoti, the dark horse in the race. The Vanguard. Retrieved on 2 March 2019.
  2. Akubo. "SDP Senatorial candidate delivers body of supporter killed to police headquarters in Kogi", 14 January 2019. Retrieved on 29 December 2019.
  3. Ujah (25 July 2018). 2019: Ajaokuta Steel campaigner, Natasha Akpoti, joins senate race. The Vanguard. Retrieved on 2 March 2019.
  4. "Yahaya Bello Wants To Kill Me, SDP Senatorial Candidate Natasha Akpoti Cries Out", Sahara Reporters, 15 February 2019. Retrieved on 8 March 2019.
  5. Polycarp. "KOGI CENTRAL 2019: Barr Natasha Akpoti, the dark horse in the race", Vanguard News Nigeria, 29 December 2018. Retrieved on 8 March 2019.
  6. Agbana. "Aftermath of court victory, SDP candidate, Natasha Akpoti pushes poll postponement", 10 November 2019. Retrieved on 29 December 2019.
  7. Ujah. "2019: Ajaokuta Steel campaigner, Natasha Akpoti, joins senate race", 25 July 2018. Retrieved on 29 December 2019.
  8. Anonymous. "Natasha Akpoti: I Learnt Community Building, Service to Humanity from My Father", 9 March 2019. Retrieved on 30 December 2019.
  9. Ujah. "2019: Ajaokuta Steel campaigner, Natasha Akpoti, joins senate race", 25 July 2018. Retrieved on 29 December 2019.
  10. Anonymous. "Natasha Akpoti: I Learnt Community Building, Service to Humanity from My Father", 9 March 2019. Retrieved on 30 December 2019.
  11. Ujah. "2019: Ajaokuta Steel campaigner, Natasha Akpoti, joins senate race", 25 July 2018. Retrieved on 29 December 2019.
  12. "SPECIAL REPORT: Ajaokuta Steel Company, Natasha Akpoti, House Of Reps And The Acquisition Plot", Sahara Reporters, 26 March 2018. Retrieved on 16 November 2019.
  13. Adoyi. "Group clashes with Natasha Akpoti over alleged sponsored campaign on Ajaokuta Steel Company", Daily Post, 3 February 2017. Retrieved on 16 November 2019.
  14. Court Clears Natasha Akpoti, Slams N10m Damages Against Newspaper over Libelous Publication (10 May 2019).
  15. Ujah. "2019: Ajaokuta Steel campaigner, Natasha Akpoti, joins senate race", 25 July 2018. Retrieved on 29 December 2019.
  16. Anonymous. "Natasha Akpoti: I Learnt Community Building, Service to Humanity from My Father", 9 March 2019. Retrieved on 30 December 2019.