Natasha Sutherland
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
aha enyere | Natasha |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Novemba 1970 |
Ebe ọmụmụ | Durban |
ọrụ ọ na-arụ | omee, omee ihe nkiri, onye nhazi ndu ihe nkiri |
InNatasha Sutherland (amụrụ 20 Nọvemba 1970), bụ onye ome Ihe nkiri nke South Africa . A maara ya nke ọma maka ọrụ ya na ihe nkiri telivishọn Honeytown, Tarzan: The Epic Adventures and Scandal! . Ewezuga ime ihe nkiri, ọ bụkwa odee, ọkà okwu mkpali na onye ndụmọdụ. [1]
Ndụ onwe onye
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ ya na 20 November 1970 na Durban, South Africa dị ka ada nke ndị n'eme ihe omume egwu bụ Geoffrey Sutherland na Kenlynn Ashby. [2]
Ọ lụrụ Steve Hofmeyr, onye South Africa na-agụ egwú, onye na-ede abụ, na onye na-eme ngosi TV. [3] Ha lụrụ na 1998 ma mesịa gbaa alụkwaghịm na 2008 na-ekwu maka mmekọrịta afọ iri nke Steve na onye nkuzi ahụike Janine van der Vyver. [4] Di na nwunye ahụ nwere ụmụ nwoke abụọ: Benjamin na Sebastian. [5]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Ọ malitere ọrụ ya na mmalite 1990 dị ka onye na-egosi ụmụaka na-ihe ngosi Kideo . Mgbe ahụ ọ rụrụ ọrụ na ihe omume soap opera bụ , Egoli: The place of Gold n'oge ọ dị afọ iri na ụma na 1991. Na 1996, ọ malitere ọrụ ihe nkiri ya na usoro telivishọn abụọ: Honeytown na Tarzan: The Epic Adventures . Mgbe ihe ịga nke ọma nke usoro ndị ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọrụ na fim ụlọ nụ Operational Delta na 1997. Ka ọ dị ugbu a, ọ malitere ịchị ụlọ ihe nkiri South Africa na ọtụtụ ihe omume ama ama dị ka Gigi na 1992 na The Revlon Girl . Ka ọ dị ugbu a, ọ na-eduzi vidiyo egwu ma rụọ ọrụ dị ka onye nchịkọta akụkọ Finesse Magazine. [2]
Ewezuga ime ihe nkiri, Sutherland bụkwa onye na-ekwu okwu mkpali ọha na-eme njem gafee mba ahụ yana ọkwa mba ụwa. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nnọchi anya Ngwa ahia mma nke South Africa Beauty brand bu'Placecol' na 'DNB'. Ọ bụkwa onye edemede amara nke oma mma, nke o dere akwụkwọ mbụ ya Bittersweet . Site na ihe ịga nke ọma ya dị ka onye edemede, o mesịrị dee akwụkwọ: Green na Blue na 2010 (akwụkwọ gbasara ụmụaka mbụ ya), Fairytale na Sprokie . [2]
Ihe nkiri
[dezie | dezie ebe o si]Afọ | Ihe nkiri | Ọrụ | Ụdị | Ref. |
---|---|---|---|---|
1991 | Egoli:Place of Gold | Samantha Ryan du Plessis | Ihe nkiri Igwe onyonyo | |
1994 | Honeytown | Carrie | Ihe nkiri Igwe onyonyo | |
1995 | Honeytown II | Carrie | Obere TV | |
1995 | The invites Guest | Mandy Thompson | Ihe nkiri Igwe onyonyo | |
1997 | Tarzan:The Epic Adventures | Dalen | Ihe nkiri Igwe onyonyo | |
1997 | Operation Delta Force | Lt. Marie Junger | Ihe nkiri TV | |
1998 | Wycliffe | Nne na-eto eto | Ihe nkiri Igwe onyonyo | |
2008 | Scandal | Layla McKenzie | Ihe nkiri Igwe onyonyo |
Nrụtụaka
[dezie | dezie ebe o si]
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Natasha Sutherland. ESAT. Retrieved on 15 November 2020.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 Natasha Sutherland. news24. Retrieved on 15 November 2020.
- ↑ Steve, Janine a bitter pill - Natasha. news24. Retrieved on 15 November 2020.
- ↑ Steve Hofmeyr to divorce after affair. IOL. Retrieved on 15 November 2020.
- ↑ Steve 'had too much to lose'. news24. Retrieved on 15 November 2020.