National Health Commission
Oge/afọ mmalite | 17 Maachị 2018 |
---|---|
aha mkpirisi | 国家卫生健康委 |
office held by head of the organization | Director of the National Health Commission |
mba/obodo | China |
Nwe ikike | China |
Isi ọgbaka | State Council of the People's Republic of China |
ọdịdị isi ụlọ ọrụ | Beijing |
dochie | National Health and Family Planning Commission, Q50839212, State Administration of Work Safety |
webụsaịtị | http://www.nhc.gov.cn/, http://en.nhc.gov.cn/ |
akaụntụ weebụsaịtị na | Tencent Weibo |
Kọmịshọn Ahụike nke Mba (nke akpọrọ NHC dị ka aha ịchafụ na asụsụ bekee) nke bụ ngalaba emere maka ihe gbasara ahụike nke onye isi ebe ahụ bụ onye n'ọkwa onye nke so na Kansụl Steeti ma bụrụ kwa onye na-ahụ maka ịhazi amụma gọọmentị na ihe niile gbasara ahụike na Mainland China . [1] E hiwere ụlọ ọrụ na ọnwa Machị na ụbọchị iri na itoolu, n'afọ 2018. Isi ụlọ ọrụ a bụ na nnukwu obodo Beijing n'China. Onye isi na ụlọ ọrụ bụ minista onye nke nwere ọkwa na kansụl steeti onye na -edu kọmiti nke a. Ma Xiaowei bụ onye minista ugbu a na -elekọta Kọmitii ahụ ma bụrụ kwa ode akwụkwọ Alaka nke otu ndị ndọrọ ndọrọ nọ na ọchi-chi. Na mbụ, ụlọ ọrụ na arụ ọrụ ndị Kọmịshọn Ahụike bụ National Health and Family Planning Commission tupu emepụta amụma maka NHC
Akụkọ ihe mere na mbụ
[dezie | dezie ebe o si]N'ime ọchịchị otu ndị ndọrọ ndọrọ nke a n'akpọ PRC dị ka aha ịchafụ ya na asụsụ bekee, kemgbe afọ 1954, ụlọ ọrụ na ahụ maka ihe niile gbasara ahụike na mba China na mbụ bụ ndị Ministry of Health. Ka'ma nke a gbanwere na afọ 2013 mgbe enyere National Health and Family Planning Commission ike maka nlekọta ahụike na obodo ahụ.
Na ọnwa Machị na afọ 2018, Gọọmentị nke ndị mmadụ nke Republik China kwupụtara na etisara Kọmịshọn Ahụike na Atụmatụ Ezinụlọ. Gọọmentị gara n'ihu kwuo na ha were ọrụ na ịga ozi nke ndị ụlọ ọrụ Kọmịshọn Ahụike na Atụmatụ Ezinụlọ nyefe ndị ụlọ ọrụ ọhụrụ, National Health Commission.
China sokwa n'otu nzukọ ahụike ụwa nke a n'kpọ World Health Organisation na asụsụ bekee ma ọ bụ WHO dị ka aha ịchafụ ya. [2] Minista Ma kọrọ na Mgbakọ Ahụike nke WHO nke iri abụọ na iteghete, na kemgbe afọ 1978, China lekwasịrị anya n'ịkwalite ahụike site na isi, ma mepụta atụmatụ maka nchekwa na ahụisike ndị obodo ahụ site na ime ka onye ọbụla nwee ohere ịnweta nlekọta ahụike nke mbụ nke dị ọgọ ma na arụọrụ nkeọma. [2]
Ọrịa coronavirus 2020
[dezie | dezie ebe o si]Kọmịshọn ahụ bụ isi ụlọ ọrụ nke dị na ebe mepere emepe na China na-ahazi mbọ mba iji lụso ọrịa COVID-19 agha.[3]
Na ụbọchị nke iri na otu n'ọnwa February n'afọ 2020, maka iji jikwaa nsogbu ahụike nke COVID-19 na -aga n'ihu, enwere mgbanwe dị iche iche na ụlọ ọrụ National Health Commission. A mara ọkwa ndị a;
- Zang Jin, onye isi nke kọmitii ahụike na mpaghara Hubei, nọchiri anya Wang Hesheng, onye osote onye isi oche nke ụlọ ọrụ National Health Commission nke China.
- Wang Hesheng nọchiri Liu Yingzi, onye isi kọmitii ahụike na mpaghara Hubei.
Ndị ụlọ ọrụ nọ n'okpuru
[dezie | dezie ebe o si]Ụlọ ọrụ ndị a nọ n'okpuru National Health Commission.
- National Administration of Traditional Chinese Medicine - ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọkwa sub-Ministry nke Kansụl Steeti
- Chinese Center for Disease Control and Prevention - ụlọ ọrụ mba maka mgbochi na ịchịkwa ọrịa
- Chinese Academy of Medical Sciences / Peking Union Medical College
- Ụlọ ọgwụ dị n'okpuru NHC
- Ụlọ ọgwụ nke dị n'Beijing
- Ụlọ ọgwụ nke mmekọrita enyi na enyi nke China-Japan
- Ụlọ ọgwụ nke mahadum Peking Union
Ndepụta ndị ozi
[dezie | dezie ebe o si]No. . | Aha | Mgbe obidoro ọrụ | Mgbe ọhapụrụ | Ihe edeturu |
---|---|---|---|---|
1 | Ma Xiaowei | ụbọchị iri na itoolu n'ọnwa Machị n'afọ 2018 | Onye na -achị ugbua |
No. | Aha | Mgbe obidoro ọrụ | Mgbe
ọhapụrụ |
---|---|---|---|
1 | Li Bin | ụbọchị iri na isii n'ọnwa Machị n'afọ 2013 | n'ọnwa Machị n'afọ 2018 |
No. | Aha | Mgbe obidoro ọrụ | Mgbe
ọhapụrụ |
---|---|---|---|
1 | Li Dequan | n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1949 | n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1965 |
2 | Qian Xinzhong | n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1965 | n'ọnwa June n'afọ 1968 |
3 | Qiu Guoguang (邱国光) | n'ọnwa June n'afọ 1968 | n'ọnwa June n'afọ 1970 |
4 | Chen Renhong (陈仁洪) | n'ọnwa June n'afọ 1970 | n'ọnwa Julaị n'afọ 1973 |
5 | Liu Xiangping (刘湘 屏) | n'ọnwa Julaị n'afọ 1973 | n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1976 |
ohere | |||
6 | Jiang Yizhen (江 一 真) | n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1977 | n'ọnwa Eprel n'afọ 1979 |
(2) | Qian Xinzhong | n'ọnwa Eprel n'afọ 1979 | n'ọnwa Mee n'afọ 1982 |
7 | Cui Yueli (崔 月 犁) | n'ọnwa Mee n'afọ 1982 | n'ọnwa Machị n'afọ 1987 |
8 | Chen Minzhang (陈敏 章) | n'ọnwa Machị n'afọ 1987 | n'ọnwa Machị n'afọ 1998 |
9 | Zhang Wenkang | n'ọnwa Machị n'afọ 1998 | n'ọnwa Eprel n'afọ 2003 |
10 | Wu Yi | n'ọnwa Eprel n'afọ 2003 | n'ọnwa Eprel n'afọ 2005 |
11 | Gao Qiang | n'ọnwa Eprel n'afọ 2005 | n'ọnwa June n'afọ 2007 |
12 | Chen Zhu | n'ọnwa June n'afọ 2007 | ụbọchị iri na isii n'ọnwa Machị n'afọ 2013 |
Ntụrụaka
[dezie | dezie ebe o si]
- ↑ "Archived copy", ifeng, 2018-03-27. Retrieved on 2019-02-22. (in zh)
- ↑ 2.0 2.1 China shares experiences in primary health care at 72nd World Health Assembly - Xinhua | English.news.cn. www.xinhuanet.com. Archived from the original on 2020-01-09. Retrieved on 2020-01-25.
- ↑ 'Grave situation' as coronavirus claims another life. www.9news.com.au. Retrieved on 2020-01-26.