Jump to content

Ndị Ọkọọ Akụkọ Ikpeazụ: Akụkọ sitere n'óbì Morocco

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Ndị Ọkọọ Akụkọ Ikpeazụ: Akụkọ sitere n'obi Morocco bụ akwụkwọ nke onye nta akụkọ redio na telivishọn bụ Richard Hamilton dere. Akwụkwọ ahụ nwere okwu mbido nke onye edemede njem na onye na-ebipụta akwụkwọ bụ Barnaby Rogerson.

Ndị Ọkọọ Akụkọ Ikpeazụ na-enyocha mgbọrọgwụ nke akụkọ ọdịnala, ndabere nke ọtụtụ ndị ọkọọ akụkọ n' ọnụ ndị odee ahụ zutere mgbe ọ na-arụrụ ndị BBC ọrụ na Morocco, ma o nwekwara ihe ndekọ akwụkwọ akụkọ dị iri atọ na isii nke akụkọ ahụ ha na-akọ.

Ndabere nke akụkọ

[dezie | dezie ebe o si]

Ndị Ọkọọ akụkọ ikpeazụ na-enyocha mgbọrọgwụ nke akụkọ ọdịnala, ndabere nke ọtụtụ ndị ọkọọ akụkọ n' ọnụ bụ ndị odee ahụ zutere mgbe ọ na-arụrụ ndị BBC ọrụ na Morocco, ma o nwekwara ihe ndekọ akwụkwọ akụkọ dị iri atọ na isii nke akụkọ ahụ ha na-akọ.

Dịka onye nyocha na-ekwu, ogige a ma ama na ahịa Jemaa el-Fnaa na Marrakech anabatala ndị ọkachamara ọkọọ akụkọ kemgbe ntọala obodo ahụ na n'afọ 1070 site n'aka onye ndú Almoravid Abu Bakr ibn Umar.[1] Ugbu a, Otú ọ dị, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n'ime ndị na-akọ akụkọ ndị a ka nọ n'ebe ndị dị otú ahụ, "na-adọta ndị mmadụ site na akụkọ na n'akụkọ gbasara ịhụnanya na ọnwụ, aghụghọ na ikpe ziri ezi", ma nkà na-ebelata.[2] N'afọ 2008, ụlọ ọrụ UNESCO nke United Nations nabatara Jemaa el-Fnaa dị ka "ọmarịcha ihe nketa nke ọnụ na nke a na-apụghị imetu aka nke mmadụ.[1][3][4][5]

N'ikwu okwu n'ajụjụ ọnụ e nyere ndị ọha obodo, Richard Hamilton kwuru na ya zutere ndị ọkọọ akụkọ na mbụ "n'enweghị ihe nwepu ọ bụla, ndị agadi nwoke na njedebe nke aka ọrụ ha" -ebe ọ na-arụ ọrụ metụtara ya nye ndị BBC na ngwụcha afọ 2006.[6] Mmasị a ghọrọ ihe ọ kpọrọ "nchegbu", ma ọ bụ ịkpọ oku, iji chịkọta ọtụtụ akụkọ dịka o nwere ike, ebe ọ ka nwere ikike, site n'enyemaka nke onye bi n'ogbè ahụ, Ahmed Tija, onye kọwara asụsụ Darija Arabic nke ndị ọkọọ akụkọ.[1][6]

N'otu ajụjụ ọnụ ahụ, na-akọwa ihe mere o ji chee na nkà nke ịkọ akụkọ ọdịnala na-efuzi efu, Hamilton tụrụ aro na anyị abụrụla "na-echegbu onwe anyị maka teknụzụ ọgbara ọhụrụ na saịtị netwọkụ na mmekọrịta n' egwuregwu kọmputa na telivishọn ruo n'ókè ebe anyị ga-agbasi mbọ ike ịnọdụ ala otu awa ma ọ bụ karịa iji gee ntị"; na nke a enwela ihe mmerụ ahụ n'oge ịta ahụhụ anyị; na ma ndị Morocco nọ "n'ime ngwangwa" ma na mgbanwe ndị dị otu ahụ metụtara ya n'oge a.[6]

Na magazin Njem Mkpa, onye nyocha ahụ dere, sị: "Ndị Ọkọọ Akụkọ Ikpeazụ bụ ezi echiche edemede pụrụ iche nke na-etinye akụkọ oge ochie sitere na ọdịnala ndị Morocco nke mbipụta akụkọ akọrọ n' ọnụ. "[7]

N'akwụkwọ akụkọ dabere na Abu Dhabi bụ The National, Noori Passela dere na akụkọ ndị ahụ "na-esite na njem ndị na-egosi dị́ké agaghị asọ ányá na ada eze ama na a ga-emeri (Gazelle nke ji mpi ọlaedo) ruo n'ihe nnọchianya na omume ọma (Ọmụmụ nke Sahara). E nwekwara ọtụtụ ndị na-eme ihe ihere, na'iji ihe ngosi nke ịhụnanya, agụụ mmeto nke anụ ahụ na nrafu mee ihe na mberede (The Eyes of Ben'Adi). Ihe nkiri na-eme gburugburu ebe niile, mana ntụrụndụ bụ naanị ebumnuche, nke a bụ ihe nweta ala siri ike . Kama, nke a bụ ihe marala ahụ. "[8]

Na Akwụkwọ Akụkọ New York, Janice Durante tụpụtara aro na "dịka pasha na-eme na Urọna na-achaa mme mme, onye odee Hamilton n'egosi ndị ọgụụ onyinye dị oké ọnụ ahịa: nchịkọta nke ọdịnaya na adịghị ka ihe ọ bụla anyị nụrụ ma ọ bụ hụ ya na mbụ. Ndị ọgụụ akwụkwọ ndị nwere ike na ha agaghị eru Marrakech nwere ikike ịchọta ebe obibi nke ha site n'ime otù ìkọ́ tii miinti ma n'enye ekele maka akụkọ ndị a na-atọ ụtọ a napụtara site na-amaghi ama.[9]

Na The Times Literary Supplement, onye odee, Arabist, ọkà mmụta na onye na-eme nchọpụta n'ọzara Eamonn Gearon dere, "Okwu mmeghe akwụkwọ ahụ ziri ezi iji mee ka ọdịdị ịkọ akụkọ zuru ụwa ọnụ pụta ìhè, ọ bụghị naanị na mkpali mbụ nke ịkọ akụkọ, kamakwa na eriri nkịtị nke na-aga site n'otu akụkụ mbà ụwa gaa na nkè ọzọ dịpụrụ adịpụ". [1]

"N'ihe banyere akụkọ," Gearon gara n'ihu, "a na-egosipụta isiokwu ndị a nke ọma: ụmụ agbọghọ mara mma; ekwesịghị ntụkwasị obi n'alụmdi na nwunye; di ndị na-ekwo ekworo; obi ọjọọ ndị sultans; anyaukwu; ịda ogbenye; ntaramahụhụ; iru uju; anwansi; ọṅụ; na nke karịrị inwe aṅụri n'ikpeazụ".[1]

Gearon kọwara ndị ọkọọ akụkọ ikpeazụ dị ka "nchịkọta mara mma, nke dị egwu ma dị ndụ".[1] "Dị ka onye mmụọ ọjọọ na-apụta site na karama, Ndị Ọkọọ Akụkọ Ikpeazụ na-emepụta ihe obi ụtọ dị egwu site n'ụfọdụ obere ngwugwu [akụkọ dị nkenke].[1] "Ma ndị nwoke abụọ [onye odee na onye ntụgharị] kwesịrị otuto dị ukwuu maka ihe ịga nke ọma dị na mgbalị a. "[1]

Banyere onye dere ya

[dezie | dezie ebe o si]

Richard Hamilton arụwo ọrụ dị ka onye nta akụkọ mgbasa ozi ọkachamara, onye na-ede akwụkwọ na onye enyemaka na nchịkọta akụkọ kemgbe afọ 1998, na-arụrụ ndị "BBC News", " BBC World Service" ọrụ na n'ịntanetị. Ọrụ ya akpọgala ya Madagascar, Morocco na Ndịda Afrịka.[7][10]

Hamilton soro dee Time Out Guide nye Marrakech ma o deela akwụkwọ n'oge niile aka ọrụ ya bụ maka akwụkwọ akụkọ nakwa magazin dị iche iche, gụnyere Condé Nast Traveler na The Times.[7][10]

Hamilton nwere MA na African Studies site na School of Oriental and African Studies (SOAS).[10] Ọ bi na London, England ma lụọ di na ụmụ abụọ.

Ihe ndị metụtara ya

[dezie | dezie ebe o si]
  • Akwụkwọ ndị e dere n'ọnụ
  • Akụkọ a na-ekwu n'ọnụ
  • Omenala a na-ekwu n'ọnụ
  • Akụkọ
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 1.7 Gearon (20 January 2012). Sand grains in the square. The Times Literary Supplement. Retrieved on 2012-01-21.
  2. Walton (9 September 2011). Richard Hamilton, "The Last Storytellers: Tales from the Heart of Morocco". New Books in African Studies. New Books Network. Retrieved on 2011-09-29.
  3. Hamilton (September 2011). The Last Storytellers. Richard Hamilton. Retrieved on 2011-09-29.
  4. Staff (2011). Intangible Heritage Lists. UNESCO. Retrieved on 2011-11-25. See 2008 entries.
  5. Staff (2008). The Cultural Space of Jemaa el-Fna Square. UNESCO. Retrieved on 2011-11-25.
  6. 6.0 6.1 6.2 Staff (16 November 2011). Interview: Richard Hamilton. Society for Storytelling. Archived from the original on 2012-04-21. Retrieved on 2011-11-18.
  7. 7.0 7.1 7.2 Staff (September 2011). The Last Storytellers. Essential Travel: Travel magazine. Holiday Book Review. Archived from the original on 2011-09-26. Retrieved on 2011-09-29.
  8. Passela (23 September 2011). The Last Stoytellers: An anthology of Moroccan stories. The National (Abu Dhabi). Retrieved on 2011-09-29.
  9. Durante (5 July 2011). The Last Storytellers: Tales from the Heart of Morocco. New York Journal of Books. Retrieved on 2011-09-29.
  10. 10.0 10.1 10.2 Hamilton (September 2011). About Richard. Richard Hamilton. Retrieved on 2011-09-30.

Njikọ mpụga

[dezie | dezie ebe o si]