Netwọk India na nyocha mgbanwe ihu igwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Netwọk India na nyocha mgbanwe ihu igwe (INCCA) bụ netwọk nke ndị ọkà mmụta sayensị na India ka e guzobe iji bipụta nchọpụta ndị ọgbọ nyochara banyéré mgbanwe ihu igwe na India.[1]

A mara ọkwa ya ọzọ n'ubochi irí abụọ na ise n'onwa Jenụwarị afọ 2012 site n'aka ónyé ọrụ nke ngalaba mgbanwe ihu igwe na Ministry of Environment mgbè nzukọ atụmatụ nke onye odeakwụkwọ (Climate) J.M. Mausker duziri, nke mekwara atụmatụ nhazi nke India National Action Plan on Climate Change (NAPCC).[2] N'ubochi anọ n'ọnwa Febụwarị afọ 2010 Minista gbụrụ-gbúrụ ébé obibi nke India bụ Jairam Ramesh kwupụtara na ọ ga-akpọkọta ndị ọkà mmụta sayensị narị abụọ na iri ise sitere na ụlọ ọrụ nyocha otu narị na iri abụọ na ise nke India ma soro òtù mba ụwa rụkọọ ọrụ. A tọhapụrụ nyocha mbụ ya nke ikuku na-ekpo ọkụ n'ọnwa Mee n'ubochi irí na otu n'afọ 2010 na nyocha ihu igwe nké abụọ a ga-ebipụta na Nọvemba 2010 ga-agụnye akụkọ banyéré Himalayas, ụsọ oké osimiri nke India, ugwu Ghat ugwu na mpaghara ugwu ọwụwa anyanwụ nke India. O kwuru na ọ ga-arụ ọrụ dị ka ụdị nke India IPCC, " mana ọ gaghị emeri UN Intergovernmental Panel on Climate Change (IPCC).[3]

Ramesh kwupụtakwara mbido nke Indian National Institute of Himalayan Glaciology. O kwụrụ na ọ bụ ezie na ọ na-akwanyere IPCC ùgwù, ọ bụ ọrụ ahụ na adịghị ike ya bụ na ọ naghị eme nchọpụta nke ya. Ramesh gosikwara na ajọ mbunobi ya mèrè ka ọ ghara inwe mmetụta na eziokwu mpaghara, kama ọ dabere na nchịkọta nyocha nke akụkọ ndị ọzọ, nke, dugara na "goof-ups" na oké ọhịa Amazon, glaciers Himalayan, na ice caps.[3][4]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Indian Network for Climate Change Assessment. Climate Change and India: A 4X4 Assessment - A sectoral and regional analysis for 2030s. Ministry of Environment and Forests, Govt of India. Archived from the original on 20 July 2011. Retrieved on 27 April 2011.
  2. "Sci-Tech / Energy & Environment : Govt working on climate blueprint to be submitted to UNFCCC", The Hindu, 25 January 2010. Retrieved on 2010-02-05.
  3. 3.0 3.1 Dean Nelson (4 February 2010). India forms new climate change body. The Daily Telegraph. Archived from the original on 6 February 2010. Retrieved on 2010-02-05. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Telegraph 2010-02-04" defined multiple times with different content
  4. Yahoo Search - Web Search.