Ngozi Ukazu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ngozi Ukazu
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ebe ọmụmụHouston Dezie
Ọrụ ọ na-arụcomics writer, comics artist Dezie
ụdị ọrụ yagraphic novel Dezie
ebe agụmakwụkwọYale University, Savannah College of Art and Design, Bellaire High School Dezie
agbụrụNigerian Americans Dezie
Ọrụ ama amaCheck, Please! Dezie
onye nlereranyaP. G. Wodehouse, Jeeves and Wooster Dezie
Ihe nriteIgnatz Award, Harvey Award, National Cartoonists Society Division Awards Dezie
webụsaịtịhttps://www.ngoziu.com/ Dezie

Ngozi Ukazu bụ onye America na eji foto ede edemede ọ dị kwa ka akwukwọ. Na afọ 2013, o dere webcomic Check, Please!, nke mechara ghọọ akwụkwọ akụkọ New York Times họọrọ dị ka nke kachasị mma.

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Ukazu toro na Houston, Texas . [1] [2] Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Bellaire, ebe oso na ndị na ede edemede na akwụkwọ akụkọ ụlọ akwụkwọ ahụ, The Three Penny Press, dịka onye editọ egwuregwu. Nne na nna ya bụ ndị Naijiria . Ọ mụrụ sayensị kọmputa, ma nweta nzere na Computing na The Arts na Mahadum Yale na afọ 2013 yana nzere masters na Sequential Art na Savannah College of Art and Design na afọ 2015. [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ukazu malitere Lelee, Biko! dị ka webcomic na afọ 2013 mgbe o dechara ihe ngosi banyere Eric "Bitty" Bittle, nwoke nwere mmasị nwoke na mahadum ma bụrụ kwa onye mmeri na ihe gbasara egwuregwu a'na akpọ skating na asụsụ bekee ma sonyere kwa ndị otu hockey. [4] [5]

Ukazu mepụtara mkpọsa Kickstarter na afọ 2015 iji bipụta mpịakọta mbụ nke akwụkwọ ndị na-atọ ọchị; Mgbasa ozi a rụpụtara ọrụ dị ka nke kachasị nweta ego dị elu na Kickstarter. [6] Na afọ 2018,ndị mbiputa akwụkwọ a'na akpọ First Second Books weputara nkebi izizi nke Check, Please!: #Hockey. [1] Ihe nke abụọ akwụkwọ ahụ, Check, Please!: Sticks and Sones, bụ akwụkwọ akụkọ kacha mma nke New York Times na ọnwa Mee n'afọ 2020. [7]

Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]

  • 2018: Check, Please!: #Hockey
  • 2020: Check, Please!: Sticks & Stones

Nrite na nkwanye ugwu[dezie | dezie ebe o si]

  • Onyinye Ignatz nke afọ2019 - Onye mmeri, Outstanding Comic [8]
  • Onyinye Harvey - Onye mmeri, Akwụkwọ Dijital nke Afọ 2019 [9]
  • 2019 YALSA - Onye mmeri | Onyinye William C. Morris
  • 2018 The Boston Globe - Best YA nke afọ 2018 [10]
  • 2018 Kirkus Reviews - Akwụkwọ kacha mma nke okenye nke afọ 2018 nke na-enyocha ezinụlọ na onwe gị [11]
  • New York Public Library nke 2018 New York - Akwụkwọ iri kacha elu maka ndị nọ n’afọ iri na ụma [12]
  • 2018 Nke kacha mma na Austin - Arts & Entertainment Critics Pick [13]
  • 2018 Harvey Awards - Nominee, Akwụkwọ Digital nke Afọ ahụ[14]
  • 2017 National Cartoonists Society - Onye mmeri, Best Online Comic: Long Form [15]
  • 2017 NPR - Akwụkwọ narị nke masịkarị ndị mmadu maka Ọgụgụ [16]

Ntughari[dezie | dezie ebe o si]