Ngwụrọ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ihe osise nke onye arịrịọ na-eji mkpara

Ngwụrọ bụ onye ma ọ bụ anụmanụ nwere nkwarụ anụ ahụ, ọkachasị onye na-enweghị ike ịga ije n'ihi mmerụ ahụ ma ọ bụ ọrịa. Edere okwu a n'oge mgbe afo uwa dị ka nnari itolu na iri ise AD, wee nweta ya site na okwu ndi Proto-Germanic (na okwu bekee) krupilaz(1). Okwu ndi German na ndi Dutch Krüppel na kreupel bụ cognates.

Ka ọ na-eru n'afọ ndị 1970, a bịara na-ewere okwu a dị ka ihe nkato mgbe ejiri ya kwuo ihe maka ndị nwere nkwarụ. Ngwuro bụkwa ngwaa na-agbanwe agbanwe, nke pụtara "ihe kpatara nkwarụ ma ọ bụ enweghị ike". A na-ejikwa okwu ngwurọ mee ihe dị ka nkọwa (6)

Nnwetaghachi[dezie | dezie ebe o si]

N'otu uzo ahụ ka òtù ndị na-ahụ maka ikike nwoke nwere mmasị na-eweghachi okwu ahụ bụ "queer", ndị òtù na-ahụ maka ikike ndị nwere nkwarụ enwetaghachila okwu ndị ahu dị ka "ngwụrọ", "ngwongwo", na nke ana akpo "gimp" na bekee iji na-ezo aka n'onwe ha.(5,7). Ụlọ ikpe ndi ngwurọ na Dortmund nke ana kpo Tribunal na bekee na 13th Disemba 1981 biara were bụru otu n'ime ihe mkpesa bụ isi nke òtù nkwarụ ndi Germany kwụụrụ onwe ya (na-emegide enyemaka nkwarụ guzosiri ike) megideere mmegide ikike mmadụ n'ebe a na-elekọta ndị agadi na ụlọ ọgwụ ndi isingbaka, yana megidekwara adịghị ike nke ọha obodo njem. N'otu aka ahụ na Russell Tribunal sitere n'aka Amnesty International, ụlọ ikpe ndị ngwurọ akatọla mmebi ikike mmadụ nke ndị nwere nkwarụ(8).

Ojiji ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • A na-akpọ ndị otu Crips n'okporo ámá mgbe ha malitere iburu mkpara nke nyere echiche na ha nwere nkwarụ.[1]
  • onye ngwuro bụ trimmer stud na bekee ma ọ bụ joist nke dị mkpụmkpụ karịa ogologo zuru ezu.[2]
  • Onye nwere nkwarụ bụ ụgbọ ala ma ọ bụ ụgbọ njem nke ọ bụ ezie na ọ dị mma ịgba ọsọ n'okporo ụzọ ụgbọ okporo ígwè, ọ dịghị mma maka iji ya mee ihe ma chọọ nrụzi tupu e jiri ya rụọ ọrụ. Nke a nwere ike ịbụ ụgbọ ala coal nwere oghere n'ala (nke ga-ekwe ka coal si n'ụgbọ ala ahụ daa), ma ọ bụ ụgbọ ala ndị njem nwere windo gbajiri agbaji.[3]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Crip" Gang Knowledge. www.corrections.com. Archived from the original on 2016-04-24. Retrieved on 2016-05-20.
  2. Anatomy of a Stud-Framed Wall. FineHomeBuilding (2001-03-15). Archived from the original on 14 November 2020. Retrieved on 2016-05-20.
  3. Glossary and Terminology. www.railway-technical.com. Archived from the original on 2014-10-07. Retrieved on 2016-05-20.