Nkanu East

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nkanu East
local government area of Nigeria
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaEnugwu Steti Dezie
nhazi ọnọdụ6°20′0″N 7°39′0″E, 6°18′55″N 7°37′27″E Dezie

Nkanu East bụ ọchịchị ime obodo na steeti Enugu, Naijiria, na akuku Ebonyi steeti n'akụkụ ọwụwa anyanwụ. Isi ụlọ ọrụ ya dị n'obodo Amagunze.

Eziama health center

Obodo di na Nkanu East bu Akpawfu, Ugbakwa, Nkerefi, Mburubu, Nomeh Unateze, Nara Unateze, Owo, Ubahu, Amaechi Idodo, Ama Nkanu, Oruku, Amagunze and Ihuokpara . Ihuokpara, dịka otu n'ime obodo ndị a ma ama na Nkanu-East nwere akụkọ ihe mere eme oge ochie nke a na-apụghị ileghara anya mgbe Nkanu na ebe nile, a na-ekwu okwu n'Enugwu steeti.

Obodo Akpawfu bụ ama maka omenala monwu (omaba), iku nkwu enu puru iche (akwuru Akpawfu), ụdị nkwụ niile ( mmanụ nkwụ, akị na cannel) na ọrụ ugbo.

Nkerefi gbara mpaghara kansụl ahụ na obodo Ohaozara nke Ebonyi . Ndị obodo na-ekwu na ha bụ obodo kacha ukwuu site na oke ala na mpaghara kansụl. Ha bụ ndị a ma ama na osikapa na ugbo akpu.

Kansụl ime obodo, nke e hibere na 1983 emebeghị ka mpaghara ahụ dị ukwuu n'ihe gbasara ihe eji enyere ndụ aka dịka ezigbo netwọkụ okporo ụzọ, ọkụ eletrik, ụlọ ọgwụ, ụlọ ọgbara ọhụrụ na ụlọ akwụkwọ. [1]

  1. Isiguzo (March 30, 2013). Nkanu-East: Cut Off From Modernity. This Day Live. Archived from the original on August 8, 2014. Retrieved on 12 October 2018.