Jump to content

Nkechi Anayo-Iloputaife

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nkechi Anayo-Iloputaife
mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie

Nkechi Francis Anayo-Iloputaife Audio bụ onye obodo Naịjirịa, onye ụkọchukwu na onye mgbasa ozi ụka. Na afọ1985, ya na di ya, hibere Chọọchị Christian Victory . Ọ nọgidere na-abụ otu n’ime ndị isi ụka ahụ ruo mgbe e gburu di ya, onye bụ onye isi ụka ahụ. Mgbe ọ nwụsịrị na afọ 1995, ọ malitere ọrụ dị ka onye nlekọta ọrụ niile na ụka ahụ. Ọ na etinye kwa aka na ọrụ enyemaka na ọrụ ebere. Ndị Ghana tụnyere ọrụ ya n'ọchịchị n'ụlọ ụka were si na ọnwere "mmụọ onye ndu nke nwoke". [1] Na afọ 2014, ndị akwụkwọ akụkọ Nation kọwara ọchịchị ya na nhazi ụka dị ka ihe akaebe na "ihe nwoke nwere ike ime, nwanyị nwekwara ike ime, ọbụlagodi mee karia mgbe ụfọdụ". [2]

Ndụ ya

[dezie | dezie ebe o si]

Tupu [3] ezute di ya, Nkechi bụ onye okpukperechi Katọlik . [4] Ọ lụrụ Harford Anayo Iloputaife ruo mgbe ọ nwụrụ na ọnwa February n'afọ 1995. O boro ebubo na gọọmentị nwere ike ịnwe ụfọdụ ihe ga-eme ka ọ nwụọ, n'ihi ọna ekwu okwu megide atumatu ndị n'ọchịchị na Nigeria n'oge ahụ. [5] Ọ na-ele di ya nwụrụ anwụ anya dị ka onye ndụmọdụ ya, na-akọwa ya dị ka "onye nnọchi anya kachasị nso nke oyiyi Kraist n'ụdị mmadụ" na ajụjụ ọnụ Daily Sun ndị akwụkwọ akụkọ [6] Kemgbe ọ nwụrụ, Nkechi abụrụla onye isi ụlọ ụka ahụ, bụ nke ọ gbara akaebe na di ya kwuputara ya dịka "onye ọhụụ" na afọ 1985. Ka onye ntaakụkọ Daily Independent na-ajụ ya etu o siri nwee ike idu ụmụ nwoke ụka ya, Nkechi kọwara na ya "... na-eso ha emekọ ihe dịka nne na onye ndu ime mmụọ ha". N’ikwu okwu banyere ụdị ejiji ya, Nkechi kọwara na ihe aha ya pụtara bụ “ịke ekịke na ịma mma”, ebe ọ na-akọwa ọdịdị ya dị ka nke “dị mfe ma dịkwa mma”. Na ịma olile anya ya-na ịlụ di ọzọ, onye nkwusa okwu ụka a dị ike ọrụ gwara ndị akwụkwọ akụkọ Daily Independent na mkparịta ụka ọzọ dị iche na "Ee e, alụm di na nwunye adịghị n'arụmụka m ma ọlị, ihe gbasara njikọ alụm di agafeela, alụọla m Jesus. Naanị ihe m na-arịọ bụ ka amara ya baram uba maka ihe ndị ọzọ ọ tinye n’aka m ka m mee ma rịọkwa ya ka ọ gbaa m ume ka m nwee ike rụchaa ọfụma. O tinyela aka na onyinye nke ihe maka ụlọ akwụkwọ na ọrụ ebere ndị ọzọ. [7]

Ntụrụaka

[dezie | dezie ebe o si]