Gaa na ọdịnaya

Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna
branch of philosophy
Obere ụdị nkeEastern philosophy Dezie
Mụrụ yaJian jia xue pai Dezie

Nkwenye-amamihe (nke asụsụ Bekee kpọrọ fịlọsọfị) ndị mbà Chaịna malitere n’oge a kpọrọ “Spring na Autumn period” n’asụsụ Bekee nakwa n’oge mbà na mbà busorịtara onwe ha agha. Aha ọzọ a kpọrọ oge ndịa bụ “Hundred Schools of Thought",[1] mgbe ndị nwere echiche nke ha n’otù n’otù nọ dịka òtù dị otù narị n’ọnụọgụgụ. Oge a bụ oge ihe e jiri mara ya bụ na amamihe na ka-ndị-si-ebi chawapụtara ka kpakpando n’ótuto ha.[1] Na agbanyeghị na nkwenye-amamihe ndị Chaịna malitere n’ogogo dị elu n’oge mbà na mbà busorịtara onwe ha agha, ndị Chaịna enwelaarị nkwenye-amamihe puku afọ olenole bu oge a ụzọ. A ga-ahụ ihe gosịrị nke a n’akwụkwọ kpokọtara ịgba-afa. Akwụkwọ a, a kpọrọ “I Ching” (maọbụ Akwụkwọ Maka Mgbanwe Dịgasịrị) bụ akwụkwọ mgbe ochie, edere tutu a mụọ Jizọs Kraịst.[2]

Ọ bụ n’oge ahụ mbà na mbà busorịtara onwe ha agha ka Sima Tan, nwoke Chaịna akụkọ na ikọwa ka kpakpando si-emetụta mmadụ doro anya, kwuru na òtù atọ a maara aha ha maka nkwenye-amamihe ha dị ichè ichè malitere. Mgbe nkwenye-amamihe atọ a na-aza Konfushanizim, Legalizim na Taghoyizim malitere, e nwekwara nkwenye-amamihe ndị ọzọ malitere ma mechaa danyụọ ka ọkụ. Ha gụnyere nkwenye-amamihe gbasara ọrụ ugbo (a kpọrọ Agrịkọlụchọralizim nke gbasara ihe ekèrè èkè n’ụwa ndị Chaịna (a kpọrọ Chaịniz Nechọralizim, nke ndị na-emekarị mgbakọ na nwepụ (na-aza Ndị Lọjishan nakwa nkwenye-amamihe a kpọrọ Mohizim. Òtù ọ dị, Konfushanizim bụ ya bụ usoro omumeihe a na-ekwe ka ukwe òkwùkwè na mbà Chaịna n’oge ọhụrụ a anyị nọ na ya.[3]

Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna Dịka Nkwenye-Amamihe

[dezie | dezie ebe o si]

Ebe ederede a nọ kpọmkwem | Iziezi Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna

Ọ bụ mgbe ịmụ̀ maka nkwenye-amamihe maọbụ fịlọsọfị bidoro na Chaịna ka a malitere rụwa ụka ma a na-akpọ "echiche" ndị mgbe ochie a na-anụrụ okwu ha na Chaịna fịlọsọfị.[4] Lee anya na Iziezi Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna ka ị gụọ maka nkea n'uju.

  1. 1 2 Ebrey, Patricia (2010). The Cambridge Illustrated History of China. Cambridge University Press. 
  2. page 60, Great Thinkers of the Eastern World, edited Ian McGreal Harper Collins 1995, ISBN 0-06-270085-5
  3. Lin, Liang-Hung (2009). "Confucian dynamism, culture and ethical changes in Chinese societies – a comparative study of China, Taiwan, and Hong Kong" (in en). The International Journal of Human Resource Management 20 (11): 2402–2417. DOI:10.1080/09585190903239757. ISSN 0958-5192. 
  4. Is There Such a Thing as Chinese Philosophy Arguments of an Implicit Debate. Carine Defoort. Philosophy East and West 51 (3):393-413 (2001)