Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna
branch of philosophy
Akụkụ nkeEastern philosophy Dezie
mụrụ yaJian jia xue pai Dezie

Nkwenye-amamihe (nke asụsụ Bekee kpọrọ fịlọsọfị) ndị mbà Chaịna malitere n’oge a kpọrọ “Spring na Autumn period” n’asụsụ Bekee nakwa n’oge mbà na mbà busorịtara onwe ha agha. Aha ọzọ a kpọrọ oge ndịa bụ “Hundred Schools of Thought",[1] mgbe ndị nwere echiche nke ha n’otù n’otù nọ dịka òtù dị otù narị n’ọnụọgụgụ. Oge a bụ oge ihe e jiri mara ya bụ na amamihe na ka-ndị-si-ebi chawapụtara ka kpakpando n’ótuto ha.[1] Na agbanyeghị na nkwenye-amamihe ndị Chaịna malitere n’ogogo dị elu n’oge mbà na mbà busorịtara onwe ha agha, ndị Chaịna enwelaarị nkwenye-amamihe puku afọ olenole bu oge a ụzọ. A ga-ahụ ihe gosịrị nke a n’akwụkwọ kpokọtara ịgba-afa. Akwụkwọ a, a kpọrọ “I Ching” (maọbụ Akwụkwọ Maka Mgbanwe Dịgasịrị) bụ akwụkwọ mgbe ochie, edere tutu a mụọ Jizọs Kraịst.[2]

Ọ bụ n’oge ahụ mbà na mbà busorịtara onwe ha agha ka Sima Tan, nwoke Chaịna akụkọ na ikọwa ka kpakpando si-emetụta mmadụ doro anya, kwuru na òtù atọ a maara aha ha maka nkwenye-amamihe ha dị ichè ichè malitere. Mgbe nkwenye-amamihe atọ a na-aza Konfushanizim, Legalizim na Taghoyizim malitere, e nwekwara nkwenye-amamihe ndị ọzọ malitere ma mechaa danyụọ ka ọkụ. Ha gụnyere nkwenye-amamihe gbasara ọrụ ugbo (a kpọrọ Agrịkọlụchọralizim nke gbasara ihe ekèrè èkè n’ụwa ndị Chaịna (a kpọrọ Chaịniz Nechọralizim, nke ndị na-emekarị mgbakọ na nwepụ (na-aza Ndị Lọjishan nakwa nkwenye-amamihe a kpọrọ Mohizim. Òtù ọ dị, Konfushanizim bụ ya bụ usoro omumeihe a na-ekwe ka ukwe òkwùkwè na mbà Chaịna n’oge ọhụrụ a anyị nọ na ya.[3]

Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna Dịka Nkwenye-Amamihe[dezie | dezie ebe o si]

Ebe ederede a nọ kpọmkwem | Iziezi Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna

Ọ bụ mgbe ịmụ̀ maka nkwenye-amamihe maọbụ fịlọsọfị bidoro na Chaịna ka a malitere rụwa ụka ma a na-akpọ "echiche" ndị mgbe ochie a na-anụrụ okwu ha na Chaịna fịlọsọfị.[4] Lee anya na Iziezi Nkwenye-Amamihe Nke Ndị Chaịna ka ị gụọ maka nkea n'uju.

  1. 1.0 1.1 Ebrey, Patricia (2010). The Cambridge Illustrated History of China. Cambridge University Press. 
  2. page 60, Great Thinkers of the Eastern World, edited Ian McGreal Harper Collins 1995, Àtụ:ISBN
  3. Lin, Liang-Hung (2009). "Confucian dynamism, culture and ethical changes in Chinese societies – a comparative study of China, Taiwan, and Hong Kong" (in en). The International Journal of Human Resource Management 20 (11): 2402–2417. DOI:10.1080/09585190903239757. ISSN 0958-5192. 
  4. Is There Such a Thing as Chinese Philosophy Arguments of an Implicit Debate. Carine Defoort. Philosophy East and West 51 (3):393-413 (2001)