Nneka Onuorah

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nneka Onuorah
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1988 Dezie
Ebe ọmụmụQueens Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nhazi ndu ihe nkiri, onye na-emeputa ihe nkiiri Dezie
Ọmụma Mmekọahụmmekọ nwanyị na nwanyị Dezie

Nneka Onuorah amuru n’afọ 1988 [1] bu onye isi nduzi na ndi mmeputa nke Amerika. A maara ya nke ọma maka izizi onye isi ya,The Same Difference O mere n'afọ 2015, gender roles na obodo ndị nwanyị na-ahụkarị nwanyị. [2] [3] A họpụtara ihe nkiri a maka ihe nrite GLAAD n'ụdị "Akwụkwọ kacha mma."[4]

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

Onuorah amuru na Queens , New York tolitere na agbata obiLeFrak City . [5] Nna ya bụ onye Naijiria ma nne ya bụ Afrika na Amerika. [6] [7] Ọ kwagara Atlanta ka ya na nne nne ya biri na klas nke ise ma laghachi Queens maka agụm akwụkwọ sekọndrị. Ọ mụtara ịgba egwu na Broadway Dance Center, [8] ma mesịa nweta akara ugo mmụta mmekọrịta ya na LaGuardia Community College. . [9]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Onuorah gara ọmụmụ ọrụ na BET n'afọ 2009 ma mechaa goro ya dika onye na emeputa ihe. [3] Ọ rụrụ ọrụ n'ihe egwu nkiri Black Girls Rock! na akwukwo egwu ndi ọzọ di iche iche. [6] Mgbe afọ isii gachara, Onuorah hapụrụ ndi otu ya ahụ ka ọ rụọ ọrụ na ihe nkiri izizi ya bụ The Same Difference . Ihe o kwuru mere o ji meputa ihe omuma a bu ụkọ nke ndi nnochi anya ndi LGBTQIA na ndi ọrụ mgbasa ozi.

Onuorah bidoro ozi ndonye ukwu Kickstarter iji nweta ego o ji mee ihe nkiri The Same Difference , nke bụ akwụkwọ banyere akparamàgwà n' studs and femmes n' obodo isi oji ebe nwanyị n'edina nwanyi ibe ya. O kwuola maka nkatọ o wetara n,aka ụmụnwayi n,edina nwayi ibe ha banyere otu o si enyi efe ụmụnwanyi karia nke ụmụnwoke. Onuorah enwetaghi ego ọ chọrọ oge o mere ozi ndọnye ukwu, kama o ji ego nke ya nwe mee ihe nkiri ahu. E meputaraThe Same Difference na ọnwa june n,afọ 2015.

Ọ haziri ọrụ Netflix bụ First and Last , ma-meputakwa My House<i id="mwRQ">,</i> otu usoro ihe nkiri ndi Viceland bụ maka ndi ballroom bụ isi oji na Latin bi na New York. [5] Ọ gara ballroom n'oge uto ya ma jee ije na ngalaba Butch. [10]

Na 2019, o kwuputara oru ngo nke Giselle Bailey na-ahazi ma na-emekorita banyere ndi LGBTQ nke Naijiria ndi hapuru obodo a na-acho mgbapu n'ihi iwu mgbochi LGBTQ [6] N'afọ ahụ, ha wepụtara otu akwụkwọ akpọrọ Burn Down The House banyere onye Parisian na-agba egwu Kiddy Smile, nke bidoro na NewFest LGTBQ Film Festival . [2]

  1. "Dancer at Heart, and Executive in the Making", 2011-05-18.
  2. 2.0 2.1 NewFest: LGBTQ Film Festival Unveils Lineup Including Docu 'All We've Got', 'Drag Kids' and 'The True Adventures Of Wolfboy' (2019-09-19).
  3. 3.0 3.1 OutFront: Filmmaker on a Mission to 'Make the Invisible Visible'.
  4. About-me | Nneka Onuorah (en). nnekafilms. Retrieved on 2023-05-04.
  5. 5.0 5.1 Clark, Michell C. (June 10, 2019). Filmmaker Nneka Onuorah Wants The LGBTQ+ Community "To Walk In Freedom, Not Survival". MTV News. Retrieved on 2020-06-25.
  6. 6.0 6.1 6.2 Bowen, Sesali. Meet The Two Black Women Capturing Global Queer Stories. Nylon. Retrieved on 2020-06-25.
  7. Marty, Robin (2016-06-21). The Stereotypes Lesbians Must Fight Against. Cosmopolitan. Retrieved on 2020-06-26.
  8. Filmmaker Nneka Onuorah On Her Passion For TV And Film. AZ Magazine (2016-11-21). Retrieved on 2020-06-26.
  9. LaGuardia Graduate Climbs Black Entertainment Television Network Ranks. City University of New York (June 20, 2014). Retrieved on 2020-06-26.
  10. 'my house' shows voguing is much more than madonna and 'drag race' (2019-07-03).