Nsibiri
mba/obodo | Naijiria |
---|---|
time of discovery or invention | 1904 |
Nsibiri (Nsibidi) | |
---|---|
Ùdì | Ọ́mází-ákàrà nwẹ́rẹ́ ákàràńsé nà ákàrànókwú nwèríkí dị ya |
Ásụ̀sụ̀ | Ihnye Ekoi, Efik/Ibibio, Igbo |
Àgbàtà ógè | < 15th century – ùgbúà |
Úsòrò íshí |
(Édémédé-àzì)
|
Úsòrò ụ́mụ̀ | anaforuana (Kuba), veve (Ayiti) |
Nsibiri (há màkwà ya dikà nsibidi: mkpụrụ okwu nka di ébé nile n' ụ̀wá bekee, nchibiddi maọbụ nchibiddy) bụ ihe úsòrò inye ákàrà dị díàlà na mpaghara ọdida anyanwụ nke Naijiriya nke há sì bụ ọ́mází-ákàrà, mànà ọ́ dị ndi ọma sị na ó nwèkwà ihnye ákàrànókwú. Ihnye ákàrà nsibiri kàrà nka ruó ìchié ímérímé: Nke ízízì ákàrà nke nsibiri bidòrò nà í kpụ ihnye ìtè na ụ̀lọ̀ há hụ̀wàrì na àlà na àgbàtà Atakpa shí nà ètítì ógè áfòohü 400 nà 1400. Há tàrà ndí Ejagham kà ndí áká nsibiri shífùrù.
Ákàrà nsibiri dị puku, nke há mà dị 500 nke hé détùrù. Hé zìrì há mgbe ichie na ụ́lọ̀ nkuzi. Ákàrà ndi a kárìrì ị gbásà ihnye ihunaya na ọyị; nke dị nà áká agha dị nsọ nà uzuzo. Ha nè jí nsibiri à ká ájí ụ́lọ̀, ihnye ọba, ihnye igwẹ̀ (dị́ kà òzè), ákwụ́kwọ́ óshíshí, ọ̀pià, nà ǹkì. Ọ́ bụ̀ ndí òtụ́ ágụ nzùzò ndi Ekpe (nke há màkwà kà Ngbe ma Egbo) kárí í ji ya; ndi ọ̀tú ā dí nà ànyị̀m Àkwá Ị̀bọ̀m nà ebo Ejagham, Efik, ndi Igbo, na ndi okoko ha.
Ọ́márí nsibiri na úféshì shì nà ákwụ́kwọ́ TD Mazwell dèrè na áfọ̀ 1904 nke ó dètùrù ákàrà ha. Na àzí mgbe ńdí Bekee byàrà mkpaghara nà àgbàtà nga, nsibir kébìrì àbúọ̀ nà ákùkù nke ǹzùzò na ǹkítì dị sam-sam nà ndi nwaanyi nwèríkí ji ya. Ùmẹ́ mpaghara dị kà nkúzí úféshì bekee nà ihnye Éféfé Kristi na íjèóbì hà mèrè kà ndi má nsibiri dátù nke ukwu, ọ́ bụ̀ ihnye mẹrẹ na ọ́ bụ̀ naani ndi dị kà ndi Ekpe mà ya è dé. Ha ne ji kwa nsibiri e de uche ndi Ekpe taa. Há vùrù nsibiri gá na Kuba na Ayiti mgbe Áhía Óhù Ukwu Mmiri, ébé áhu kà ọ́ ghàrà ka ákàrà anforuana na veve.
Ị̀tà
[dezie | dezie ebe o si]Ọ́márí ébé nsibiri è fúólé.
Wikimedia Commons nwe ru media dị ikwu nye Nsibiri). |