Nwa agbọghọ otu aka

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

The One-Handed Girl bụ akụkọ ifo mba

Swahili, nke Edward Steere chịkọtara na akụkọ ndị mba Swahili.

Andrew Lang gụnyere ya na The Lilac Fairy Book .[1]

Ọ bụ ụdị nke Aarne-Thompson 706. Ụdị ndị ọzọ na akụkọ a gụnyere The Girl Without Hands, The Armless Maiden, Penta of the Chopped-off Handes na Biancabella and the Snake.[2]

Nkọwa[dezie | dezie ebe o si]

Nwoke na-anwụ anwụ jụrụ ụmụ ya ihe ọ ga enye ha: ihe onwunwe ya ma ọ bụ ngọzi ya. Nwa ya nwoke kwuru na ya ichọrọ ihe onwunwe ya, ma nwa ya nwanyị sị na ya onwe ya chọrọ ngọzi ya. Ọ nwụrụ. N'oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị, nwunye ya nwụkwara, ọzọkwa, nwa ya nwoke ahụ họrọkwara I nweta ihe onwunwe ya ebe nwa ya họrọ ngọzi ya. Ọ nwụrụ. Nwanne ya nwoke ahụ kwakọrọ pụọ hapụrụ nwanne ya nwanyị nanị ite na arịa ihe, mana ndị mmadụ binyere ya ite ma nyekwa ya ọka, ya mere nwanne ya nwanyị ji we dị ndụ. Otu ụbọchị, o were mkpụrụ ugu o nwere wee kụọ, ma nwetakwa ugu. Nwanne ya nwoke bịara nwere ya anyaụfụ, zuru ite ya na ikwe ya, ma o dochiri ha site n'ire ugu ya. Nwunye nwanne ya nwoke zipụrụ ohu ya ka ọ gaa zụta otu, nwanne ya nwanyị ahụ wee nye ya otu n'efu, na agbanyehi na ọ dị ole na ole fọdụrụ, nwunye nwanne ahụ zigakwara ohu ọzọ, nwanne nwanyị ahụ zighachiri ya azụ n'ihi na ọ dịghị nke fọdụrụ. Nwunye nwanne ya ahụ kwara ákwá ma gwa dị ya na nwanne ya nwaanyị na-eresị ndị ọzọ ugu ma wezụga ya. Iwe were dị ya nke mere ka ọ jee ị gbutu ubi akwụkwọ ugu nwanne ya nwaanyị ahụ. Nwanne ya nwayi siri ya na ọ buru na o me ya, na ya ga-etinye aka ya ka obipukota aka-ya na ubi ahụ, mana itiye aka mgbe nwanne ya nwoke chọrọ igbutu ubi ahụ abụghoro ya ezigbo echiche, maka na o gbupuru ya dịka ọ na-egbutu ukwu osisi ndị ahụ. Ọ biakwara ree ụlọ obibi nwanne ya nwaanyị.

Nwanne nwanyị ahụ bidoro wagharịwara, na_arahu ụra kwa abalị n'osisi. Otu ụbọchị, nwa eze zuru ike n'okpuru osisi ebe ọ nọ n'èzí ike, anya mmiri agbọghọ a kpọtere ya. Ọ lụrụ ya. Ọ mụrụ nwa, n' elu àkwà. Nwanne ya nwoke mefuru akụ na ụba ya niile, ma bịa n'obodo ahụ. Mgbe ọ nụrụ banyere nwanyị ahụ nwere otu aka lụrụ nwa eze, ọ maara na ọ bụ nwanne ya nwanyị. O mere ka ndị ịkwụ di ya kwenye na nwanne ya bụ onye amoosu nke e gbupụrụ aka ya maka ntaramahụhụ. Ha egbughi ya, kama ha chụpụrụ ya na nwa ya. O ji naanị ite ụrọ iji sie nri. N'ime ọhịa, agwọ gwara ya ka ọ zoo ya n'ime ite ụrọ ahụ n'aka agwọ ụkwụ. Mgbe o mere nke a, ọ gwara ya ka ọ sachaa ahu n'otu ọdọ mmiri. O mekwara ya, mana nwa ya nwụnahụrụ ya n'ime mmiri ahụ . Agwọ ahụ gwara ya ka o jiri aka abụọ chọọ ya; ọ chọtara ya ọzọ, e weghachikwara aka ya furu efu. Ọ kpọgara ya n'ụlọ nne na nna ya, ndị kelere ya maka ịzọpụta ya. Ka nke a n'aga n'ihu , nwanne ya nwoke nọ n'ọkwa dị elu n'ihu eze.

Nwa eze ahụ dara ọrịa na njem ya, nke mere na ndị mụrụ ya amataghi ya mgbe ọ laghachiri ruo oge o kwuru okwu. Mgbe ahụ ha nwere obi ụtọ, mana ha gwara ya na nwunye ya ná nwa ya anwụọla.

Otu ụbọchị, nwanyị ahụ kwuru na ọ ga-aga ịhụ di ya. Na aro agwọ ahụ, ọ rịọrọ nna ya mgbaaka, rịọ nne ya igbe ozu. Ha gwara ya na mgbaaka ahụ ga-enye ya nri, uwe, na ebe obibi, igbe ahụ agaghị echebe ya na ihe mmerụ ahụ. N'akụkụ obodo ebe di ya na nna ya bi, o jiri mgbaaka mee onwe ya ụlọ obibi. Eze nụrụ banyere ya wee kpọta nwa ya nwoke na ndị ozi, gụnyere nwanne ya, iji hụ onye bi n'ebe ahụ. Ọ koro ha akụkọ ya. Di ya matara ya wee kpọrọhachi ya azụ, a chụpụkwara nwanne ya nwoke n'obodo ahụ.

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • The Enchanted Watch
  • Molly Whuppie

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Andrew Lang, The Daisy Fairy Book, "The One-Handed Girl"
  2. Heidi Anne Heiner, "Tales Similar to the Girl Without Hands"

Ịgụ ihe ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • [Ihe e dere n'ala ala peeji] "Ruelland, S., Nwa agbọghọ na-enweghị aka". In: Journal de la Société des Africanistes, 1974, Mpịakọta 44, fascicule 2. peeji nke 215-216. www.persee.fr/doc/jafr_0037-9166_1974_num_44_2_1757_t1_0215_0000_2.