O'Plérou

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
O'Plérou
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịCôte d'Ivoire Dezie
Aha ọmụmụO'Plérou Luc Denis Grebet Dezie
Aha enyereO'Plérou, Luc, Denis Dezie
aha ezinụlọ yaGrebet Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya7 Novemba 1997 Dezie
Ebe ọmụmụAbidjan Dezie
Asụsụ obodoFrench language Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language Dezie
Ọrụ ọ na-arụomebe ihe nkiri, illustrator Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2018 Dezie
Ọrụ ama amaZouzoukwa Dezie
hashtagZouzoukwa Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie

O'Plérou Grebet bụ onye na-ese ihe na mba Ivory Coast, onye na-emepụta ihe osise na onye na-eme ihe osise nke a maara na o mepụtara ihe karịrị eserese emoji narị atọ na ịrị isii na ise n'efu nke na-egosi ọdịbendị West Africa.[1][2][3][4][5] A kpọrọ aha ya na ndepụta 30 Under 30 nke Forbes Africa.[6]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ O'Plérou Luc Denis Grebet na Nọvemba 7, 1997, na Abidjan, Ivory Coast. Ọ na-ese ihe mgbe niile dị ka nwatakịrị.[3][7] Ọ gara Fine Arts School nke Abidjan maka otu afọ, mgbe ahụ ọ gụrụ ihe osise na mmepe weebụ na Institute of Sciences and Communication Techniques.[8]

Ọrụ Zouzoukwa[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Septemba n'afọ 2017, OʹPlérou mụtara ime emojis site n'ile ihe nkiri nkuzi na YouTube. Ọ malitere ọrụ ya "Zouzoukwa", na Jenụwarị 1, 2018, nke o bu n'uche imepụta ma bipụta kwa ụbọchị na Instagram emoji ọhụrụ nke metụtara Africa ruo na ngwụcha afọ. Ebumnuche ya bụ ịkekọrịta ọdịbendị Ivory Coast na ụwa site na mgbasa ozi mmekọrịta.[7][9] N'ime izu mbụ nke ịmalite ọrụ a, ọ nwetara ndị na-eso ụzọ ọhụrụ dị mmadụ pụkụ abụọ.[10]

N'ọnwa Disemba afọ 2018, o tinyere emojis narị atọ na ịrị isii na ise niile n'ime ngwa iji mee ka emojis ya jiri dị ka mkpado na WhatsApp na iMessage.[11][12][13]

O meriri ihe nrite Young Talent Award na Africa Digital Communication Days (Adicom Days) na Abidjan, Ivory Coast, ebe nzukọ maka ndị na-eme ihe nkiri dijitalụ na Africa na-asụ French maka ọrụ ya.[14] N'ime usoro ahụ, ya na ụlọ ọrụ French Canal + rụkọtara ọrụ, nke na-eji ụfọdụ n'ime emoticons ya "nke e mere na Ivo" na netwọk mmekọrịta n'oge iko mba ụwa nke bọọlụ na June na July. Ọ rụkọtara ọrụ na ụdị uwe na ngwa ndị Ivorian, Imalk Concept, na emojis ya na akpa akpa.[15]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. This 21-year-old Ivorian has created over 350 downloadable African emojis (en-US). www.pulse.ng (2019-10-24). Retrieved on 2019-11-03.
  2. Les émojis africains Zouzoukwa disponibles sur Playstore | Life Magazine (fr-FR). Retrieved on 2019-11-03.
  3. 3.0 3.1 Salaudeen. The student creating African emojis to change the story of Africa from poverty to beauty. CNN. Retrieved on 2020-01-17.
  4. Video experience headlines (en). BBC News. Retrieved on 2020-01-17.
  5. Ivorian student creates African emojis. www.aljazeera.com. Retrieved on 2020-01-20.
  6. Mwendera (2020-04-02). Forbes Africa #30Under30 List: Leading The Charge (en-US). Forbes Africa. Retrieved on 2020-04-03.
  7. 7.0 7.1 O’Plérou Grebet’s new emojis allow "Africans to communicate more accurately using instant messaging" (en). www.itsnicethat.com. Retrieved on 2020-01-20.
  8. Turcan (2018-01-11). Chaque jour, cet artiste ivoirien crée un nouvel emoji issu de la culture africaine — et on a hâte de pouvoir les utiliser (fr). Business Insider France. Retrieved on 2019-11-15.
  9. "Les " zouzoukwa ", des smileys à la sauce ivoirienne", 2018-10-24. Retrieved on 2019-11-03. (in fr)
  10. Hawgood. "A Student Who Makes African Emojis", The New York Times, 2019-12-11. Retrieved on 2020-01-17. (in en-US)
  11. "Drawing West Africa, one emoji at a time", Christian Science Monitor, 2019-12-10. Retrieved on 2020-01-20.
  12. The Emoji Designer Who's Bringing African Culture To Smartphone Keyboards (en). NPR.org. Retrieved on 2020-01-20.
  13. P3. Ele cria "stickers" da cultura africana — para a fazer chegar a todos os teclados (pt). PÚBLICO. Retrieved on 2020-01-20.
  14. Hierro. "Un emoji africano para cada día del año", El País, 2018-03-01. Retrieved on 2019-11-03. (in es)
  15. Collab' mode : les tote bags inspirés des émojis africains (pl). www.elle.ci. Archived from the original on 2019-11-03. Retrieved on 2019-11-03.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]