Ogige Agodi
Ogige Agodi bụ ebe ndị njem nleta na-adọrọ mmasị n'obodo Ibadan, steeti Oyo, Naijiria. A na-akpọkwa Agodi Botanical Gardens, Agodi Gardens, Ibadan, ogige ndị ahụ dị na acres otu narị na iri ise nke ala
Akụkọ ihe mere eme
[dezie | dezie ebe o si]Ogige Agodi nke a na-akpọbu Agodi Zoological and Botanical Gardens ka e mepụtara n'afọ 1967. Ọdachi nke idei mmiri Ogunpa bibiri ogige ahụ n'afọ 1980 ka mmiri na-eme ka ọtụtụ n'ime anụmanụ ndị ahụ kpochapụ. Gọọmentị steeti Oyo rụzigharịrị ogige ahụ n'afọ 2012, ma meghee ya ọzọ n'afọ 2014. [1]
Ihe Ndị Na-adọrọ Adọrọ
[dezie | dezie ebe o si]- Ogige Mmiri
- Ọdọ Mmiri
- Obere zogige ụmụ anụmanụ
- Ebe a na-egwuri egwu na njem ụmụaka
- Ebe a na-eme ngagharị iwe na ogige ntụrụndụ [2]
Mwakpo ọdụm
[dezie | dezie ebe o si]Na ngwụcha ọnwa Septemba afọ 2017, otu n'ime ọdụm wakporo onye na-elekọta ogige ụmụ anụmanụ na Agodi Zoo. Onye na-elekọta ụmụ anụmanụ nke ọdụm ahụ wakporo bụ Maazị Hamzat Oyekunle nke a maara nke ọma dị ka Baba Olorunwa. O mechara nwụọ n'ihi mmerụ ahụ o nwere.[3]Gọọmentị steeti Oyo mechiri ogige ntụrụndụ ahụ ozugbo.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Obuekwe. "Review of Agodi Gardens", The Guardian (Nigeria), 28 June 2017. Retrieved on 16 April 2018.
- ↑ Agodi Garden and Resort: A brief walk into a haven of peace. Pulse Nigeria (21 August 2020). Retrieved on 2020-12-21.
- ↑ Ajayi. "Lion Kills Man in Ibadan", Vanguard Online, 30 September 2017. Retrieved on 16 April 2018.