Okey Wali

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Okey Wali
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya29 Ọktoba 1958 Dezie
Ebe ọmụmụObia/Akpor Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọka iwu Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Buckingham Dezie

Okey Wali, SAN (a mụrụ n'ọnwa Ọktoba 29, afọ 1958) bụ onye ọka iwu Naịjirịa na onye isi oche nke iri abụọ na isii nke Nigerian Bar Association .[1][2]

Mmalite ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Wali n'abalị iri abụọ na itoolu n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1958 na mpaghara ọchịchị Obio-Akpor na obodo ukwu nke Port Harcourt, mpaghara ndịda Naịjirịa.[3] Ọ gara ụlọ akwụkwọ Port Harcourt Township School maka agụmakwụkwọ praịmarị ya mana ọ gụsịrị ya na St. Paul's Primary School na Diobu, Port Harcourt .[4] O mechara gaa Baptist High School, Port Harcourt, ebe o nwetara asambodo West African School n'afọ 1973 wee gaa Mahadum Buckingham, United Kingdom, ebe ọ natara nzere bachelọ nke iwu n'afọ 1983.[5] Ọ laghachiri Naịjirịa maka ọzụzụ ọkachamara na Nigerian Law School na Lagos Steeti a kpọọ ya na Nigerian Bar n'afọ 1984.[6]

Ọrụ iwu[dezie | dezie ebe o si]

A kpọrọ ya na Nigerian Bar n'afọ 1984.[7] Mgbe afọ ole na ole nke ahụmahụ ọrụ gasịrị, a họpụtara ya dịka odeakwụkwọ nke Port Harcourt alaka nke NBA n'afọ 1992.[8] O mechara rụọ ọrụ dịka Attorney-General na Commissioner maka ikpe ziri ezi nke steeti Rivers tupu a họpụta ya dịka onye isi oche nke iri abụọ na isii nke Nigerian Bar Association, ebe o nwetara vootu 688 iji merie Emeka Ngige (SAN), onye nwere vootu 449.[9][10] Augusustine Alegeh, onye isi na-akwado Naịjirịa nọchiri ya.[11]

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Ọktọba afọ 2014, a kọrọ na ndị égbè a na-amaghị ama tọọrọ Wali na Rumualogu Town, Akpor City, Rivers State ma tọhapụ ya ụbọchị ole na ole mgbe a tọọrọ ya.[12][13]

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Abducted ex-NBA president, Okey Wali released. Premium Times. Retrieved on 8 February 2015.
  2. Okey Wali, Ex-NBA president, kidnapped, Articles – THISDAY LIVE. thisdaylive.com (October 12, 2014). Archived from the original on February 8, 2015. Retrieved on February 8, 2015.
  3. Former NBA president 'Okey Wali' kidnapped in Rivers State. Nigerian Bulletin – Trending News & Updates. Retrieved on February 8, 2015.
  4. How NBA election was won and lost. Vanguard News. Retrieved on February 8, 2015.
  5. NBA presidency: It's a battle between hawks and doves – Vanguard News. Vanguard News. Retrieved on February 8, 2015.
  6. Okey Wali declared president-elect of Nigeria Bar Association - www.channelstv.com. Channels Television. Retrieved on February 8, 2015.
  7. NBA elects Wali as new president. The Punch. Archived from the original on February 8, 2015. Retrieved on February 8, 2015.
  8. Leadership Newspaper (July 15, 2014). NBA: Okey Wali's emergence as NBA president fraudulent – Falana. Nigerian News from Leadership News. Retrieved on February 8, 2015.
  9. Gunmen Abduct Former NBA president, Okey Wali, in Port Harcourt. Sahara Reporters. Retrieved on February 8, 2015.
  10. Yahaha. Okey Wali emerges as NBA new president. frontiersnews.com. Retrieved on February 8, 2015.
  11. Media Trust. Alegeh is Nigeria Bar Association’s new president. Daily Trust. Archived from the original on February 8, 2015. Retrieved on February 8, 2015.
  12. Former NBA president, Okey Wali, kidnapped in Rivers. Vanguard News. Retrieved on February 8, 2015.
  13. Kidnappers release ex-NBA President, Okey Wali. The Punch. Archived from the original on February 8, 2015. Retrieved on February 8, 2015.