Oku Ampofo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Oku Ampofo
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịGhana Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya4 Novemba 1908 Dezie
Ebe ọmụmụGhana Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1998 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomenkà Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Edinburgh Dezie
omenkà faịlụ naSchomburg Center for Research in Black Culture Dezie

Oku Ampofo (Amanase, November 4, 1908), bụ onye na-ese ihe na Ghana. Ọ ghọrọ onye Ghana mbụ natara ohere agụmakwụkwọ n'efu nke gọọmentị iji mụọ gbasara ọgwụ.[1]

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Oku Ampofo na Amanase na Akuapem . Ọ gụrụ ìhè gbasara ọgwụ na Edinburgh na mahadum na Royal College of Edinburgh na Glasgow n'etiti afọ 1933 na 1939.[2] N'afọ 1939, ọ nwetara akara ugo mmụta ọgwụ.

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1950, ọ malitere ịghọ ọkachamara n'iji ahịhịa na ọgwụ ndị ọzọ.[3] A ga-ewere ya dị ka onye ọsụ ụzọ n'iji ọgwụgwọ ahịhịa. O guzobere Center for Scientific Research in Natural Medicine.

Oku bụkwa onye na-eme ihe nkiri na onye na-ese ihe. Ọ malitere ịkpụ ihe n'oge ọ na-amụ ọgwụ na Edinburgh, mana o mechara bụrụ onye ama ama na mba ya nakwa mba ụwa.[4] Ihe dị ịrịba ama bụ njikọ ya na ntọala Oku Ampofo nke na-akwado ọrụ mmepe obodo maka ndị Ghana na ọkachasị obodo Mampong-Akuapem ebe ọ na-arụ ọrụ ọgwụ ruo ọtụtụ afọ. Ntọala ahụ na-akwado nyocha banyere ọgwụ ahịhịa dị mkpa iji gwọọ ọrịa ndị siri ike na Ghana, West Africa na gburugburu ụwa. Ampofo nwụrụ na 1998[5]

Ọrụ nka[dezie | dezie ebe o si]

Oku rụrụ ọrụ osisi siri ike na ọtụtụ agba ma ọ bụ simenti. Akụkọ ya na echiche ya sitere n'ihe gbasara ọdịbendị na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na okpukpe nke ụzọ ndụ Ghana.[3]

Ihe ngosi[dezie | dezie ebe o si]

O gosipụtara na Senegal, Nigeria, England, United States, Israel, Brazil na Romania. Ọrụ ya metụtara ndị na-ese ihe, ndị na-akpu ihe na ndị na-akpụ ite na Ghana. O sonyere na ihe ngosi dị mkpa nke Tendances et Confrontations nke a haziri n'oge Mondial des Arts Nègres Festival na Dakar na 1966.[6]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Oku Ampofo – UncoverED (en-US). Archived from the original on 2021-11-21. Retrieved on 2020-08-27.
  2. Crabbe (2020-06-17). Meet Dr Oku Ampofo the celebrated Ghanaian physician and sculptor (en). Yen.com.gh – Ghana news.. Retrieved on 2020-08-27.
  3. 3.0 3.1 Dr Oku Ampofo an apostle of herbalism, a man of many talents (en-gb). Graphic Online. Retrieved on 2020-08-27.
  4. Oku Ampofo, renowned physician and sculptor (en-US). Ghanaian Museum (2020-06-10). Archived from the original on 2021-08-02. Retrieved on 2020-08-27.
  5. Late sculptor and Pan-African Dr Oku Ampofo visits embassy of Ghana in Washington DC again (en). www.ghanaweb.com (2018-03-05). Retrieved on 2020-08-27.
  6. Ampofo (1998). Dr Oku Ampofo Sculptures (in en). Oku Ampofo Foundation.