Olumba Oworo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Olumba olu
dialect
obere ụdị nkeAsụsụ Yoruba Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie

Oworo (Aworo) bụ olumba ndi Yoruba nke a na-asụkarị na Oworo distrikti nke di n'okpuru ọchịchị Lokoja, Kogi Steeti Naịjiria. Ọ dị nso na olumba Abinu (Bunu), Ikiri, Owe, Yagba na Ijumu nke a maara dị ka Okun.[1] Olumba ndị Okun na-aghọta ibe ha.

O diri ka e nwere iwu doro anya na nke siri ike nke mgbanwe sitere na (f) na Yoruba (na olumba ndị ọzọ nke Okun) gaa na (h) na Oworo. Mgbanwe ndị yiri ya na-eme n'ọtụtụ ụdaume ndị ọzọ na consonants nwere obere nkpagide. Dịka ọmụmaatụ, a na-asụgharị okwu funfun, ìfẹ́ na òsì nke pụtara ọcha, ịhụnanya na aka ekpe dịka hunhun, ìhẹ́ na òhì na Oworo n'otu n'otu.[2]

N'ihi ọnọdụ ala nke ndị Oworo, Nupe, Igala, Hausa na asụsụ ndị ọzọ ha na ya gbara agbata obi emetụtala olumba Oworo. Mmetụta nke ndi Nupe dika ọ bụ ya kachasị ukwuu nke nwere ike ị bụ site na agha Nupe nke narị afọ nke iri na itolu.[1][3]

Edensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 "The History of Okun Yoruba: Research Direction", Yorùbá Identity and Power Politics, Editors: Toyin Falola, Ann Genova, Volume: 22, Publishers: Boydell & Brewer, University of Rochester Press (February 2006) Page 111-126
  2. Arokoyo Bolanle."A survey of Okun phonology"
  3. Funso Afolayan. "Yoruba state(other than Ife and Oyo)" , 24the July 2015, Retrieved 13 October 2015.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Georgina OM, Adebola AI. "An Optimality Analysis of Oworo Vowel Harmony" E nwetara ya na 14 Ọktoba 2015