Omololu Falobi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Usòrò:Falobi.jpg

Omololu Falobi (1971-Ọktoba 5, na afọ 2006) bụ onye nta akụkọ Naijiria, na onye na-ahụ maka ọrịa AIDS. N'afọ 1997, o guzobere JAAIDS.[1] E mepụtara Omololu Falobi Award n'aha ya.[2]

N'afọ 1998, o guzobere JAAIDS, otu na-abụghị nke gọọmentị na-achịkọta ndị nta akụkọ si n'akụkụ niile nke mba ahụ iji kụziere ndị mmadụ banyere ihe ize ndụ nke ọrịa AIDS na otu esi egbochi ya.[3] N'afọ 2004 na afọ 2005, ọ bụ onye nnọchi anya na bọọdụ nke Joint United Nations Programme on HIV / AIDS.[4]

E gburu ya n'Oktoba 5, na afọ 2006 na Lagos, n'ihe dị ka elekere iri nke ehihie; ọ ka hapụrụ isi ụlọ ọrụ ya na Lagos. A na-ekwu na ndị gburu ya sooro ya ma gbaa ya égbè ọtụtụ ugboro.[5]

Ezinụlọ[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ Aderonke Falobi ma bụrụ nna ụmụ atọ, Ayomide, Olamide, na Aramide Falobi.[6]

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. OSI Mourns the Loss of African AIDS Activist Omololu Falobi (en). www.opensocietyfoundations.org. Retrieved on 2020-10-19.
  2. The Omololu Falobi Award (en). AVAC (2014-02-18). Retrieved on 2020-10-19.
  3. On World AIDS Day, we remember our Brother OMOLOLU FALOBI (en-GB). Nigeria Health Watch (2014-12-02). Retrieved on 2020-10-19.
  4. Omololu Falobi, Nigerian Journalist/HIV-AIDS Activist, 1971-2006 | Internews. internews.org. Archived from the original on 2017-07-08. Retrieved on 2020-10-19.
  5. Killed: Omololu Falobi, JAAIDS Founder and Executive Director | Chicago Afrobeat Project | Carrying the Torch Since 2002 (en-US). Chicago Afrobeat Project. Retrieved on 2020-10-19.
  6. Pioneering AIDS Journalist Omololu Falobi Dies (en). POZ (2006-10-09). Retrieved on 2020-10-19.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]