Otu Narị Afọ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Otu Narị Afọ
ọrụ edemede
afọ/ụbọchị mbipụta2006 Dezie

The Hundred Year Lie: How Food And Medicine Are Destroying Your Health (2006) bụ akwụkwọ nke onye nta akụkọ nyocha Randall Fitzgerald[1] nke na-enyocha ịrị elu nke mmetụta mpaghara na ụwa niile nke ụlọ ọrụ nri na kemịkal United States, ma kwuo na ha agbanwela, n'ime narị afọ gara aga, metụtara ma mebie ndụ ọtụtụ nde mmadụ nọ na United States site na iwebata ọgwụ ndị a kpụrụ akpụ na mgbasa ozi nri-yinye.

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ ahụ na-ekpuchi isiokwu dịgasị iche iche metụtara isi okwu. Ọ na-amalite site n'ịkọwa akụkọ ifo ndị ọha mmadụ kwenyere, na nsogbu ahụike nke nsí bụ 'nsogbu onye ọzọ', wee gaa n'ihu ikwu maka ihe a maara nye obodo sayensụ na kemikal, ma gosipụta akụkọ banyere ikpuchi mmiri ọgwụ gbasara ahụ Ike nke mmadụ, ya na ọkwa azụmaahịa ụlọ ọrụ kemical mere.

Akwụkwọ ahụ na-aga n'ihu ikọwapụta maka ihe ize ndụ nke nri mgbakwunye, egwu nsị anụmanụ ndị mmadụ na ụmụ anụnụ riri ugbu a, yana otu mmetọ kemikal a si emetụta mmiri ọha na eze na-aṅụ na kwa etu o siri wetara mgbanwe dị ukwuu, mkpụrụ osisi ọzụzụ na ọrịa ọhụrụ achọpụtala ma ọ bawanye njọ na ebe mmadụ na anụmanụ nọ.

Akwụkwọ ahụ ji mkparịta ụka banyere usoro ọgwụgwọ na nkà ihe ọmụma nke ọdịda anyanwụ na ọwụwa Anyanwụ mechie, lekwasị anya n'ọgwụ ọzọ na iri nri na-edozi ahụ, izere oriri aka mere, ya na usoro bara uru maka otu esi ewepụ nsị mmadụ.

Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]

  •   (hardback edition 2006, 304pp.)

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Super Size Me bụ ihe ngosi 2004 nke Morgan Spurlock na isiokwu yiri nke ahụ.
  • The Corporation bụ ihe nkiri ihe mere eme nke Canada nke afọ 2003 na-akatọ ụlọ ọrụ nke oge a na omume ya n'ebe ọha mmadụ nọ.
  • The Jungle bụ akwụkwọ akụkọ Upton Sinclair dere n'afọ 1906 gbasara ụlọ ọrụ na-etinye anụ. Fast Food Nation makes various references to it.
  • Reefer Madness bụ akwụkwọ Eric Schlosser dere n'afọ 2003 na-enyocha ọrụ ndị na'èzí na ihe na -akpali agụụ mmekọahụ na azụmaahịa wii wii na America.
  • Fast Food Nation bụ akwụkwọ Eric Schlosser dere n'afọ 2001 na-enyocha azụmaahịa nri ngwa ngwa na America.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]